diff --git a/articles/c51y9dr7555o.json b/articles/c51y9dr7555o.json new file mode 100644 index 00000000..79c1bef6 --- /dev/null +++ b/articles/c51y9dr7555o.json @@ -0,0 +1,78 @@ +{ + "published": "24 Julaị 2024", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ọnọdụ obibi na-akwanye njọ", + "Ihe bụ isi sekpu ntị n'ọkụ ngagharịiwe a na-akpọ bụ akụnụba obodo Naijiria na-etikpọ etikpọ.", + "Kemgbe Onyeisiala Bola Tinubu wepụrụ ego \"Subsidy\" mmanụ agbịdị n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee afọ 2023 ọnụ ahịa ihe niile jisike arị elu.", + "Ndị mmadụ na-agbarụ ihu na ego ihe niile arịala elu nke mere na ha enweghị ike azụ kama nri nkịtị. Ụfọdụ ekwukwala na ha enweghị ike eri nri kama otu mgbe n'ụbọchị.", + "Ngụkọ nke ụlọọrụ ndekọ bụ NBS n'ichafu wepụtara gosiri na otanisi eruola pasent ị 34.9 n'onwa Juun afọ a ebe otanisi kacha metụta bụ nri.", + "Otanisi nri nozi na pasentị 40.87 karịa pasentị 15.6 ọ dịbu n'ọnwa Juun afọ 2023.", + "Ihe ọzọ bụ na ọnụ mmanụ ụgbọala arịala elu ugboro anọ kemgbe afọ gara aga nke mere na ọnụ ahịa njem nakwa ngwa ndị ọzọ a na-ebugharị soro ya rịa elu.", + "Ọnọdụ nchekwa ọjọọ", + "Ọnọdụ nchekwa ọjọọ bụ ihe ọzọ na-echu ndị mmadụ ụra na Naijiria.", + "Otu ụlọọrụ na-edekọ ihe banyere nchekwa na Naịjirịa kwuru na mmadụ 5, 710 nwuru na onwa isii mbụ n'afọ a bụ nke kachasị kemgbe afọ 2013.", + "Onyeisi Tinubu na ndị isi ọrụ nchekwa ezutela onwe ha kwa mgbe kwa mgbe iji wepụta atụmatụ ga-ahụ na nchekwa dị mma.", + "Ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ zutekwara onwe ha n'izuụka ole ma ole gara aga iji kpaa maka nsogbu nchekwa na mpaghara ahụ.", + "N'agbanyeghị nke a, ntọrị ka na-arị elu ọ kachasị na mpaghara ugwu.", + "Ọnọdụ ahụike nakwa ọnụ ahịa ọgwụ", + "Otu nwata nwaanyị gwara BBC na ọ na-ahọrọ n'etiti iri nri nakwa ịzụta ọgwụ dị mkpa na-azo ya ndụ n'ihi ọnụ ahịa ọgwụ na ebe ọ kwụzi ugbua.", + "Ọ sị na kemgbe ọnụ ahịa ọgwụ o ji agwọ ọrịa Asthma riri elu, ọ na-ahazi onwe ya ofụma tupu ọ zụta ya.", + "Onye ọzọ gwakwara BBC na ọ kwụsịla ịzụ ọgwụ Bekee ma jirizia mgbọrọgwụ agwọ onwe ya.", + "\"Anaghị m aṅụzi mmiri oyi maka na o so n'ihe ndị na-akpalite ọrịa m, n'agbanyeghị na mkpomọkụ dị\" ka o kwuru.", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Kemgbe izu olemaole gara aga ka ndị ntorobịa Naijiria na-ekwu na ha ga-eme ngagharịiwe iji gosi iwe ha maka ọnọdụ obibi ọjọọ dị na Naijiria ugbua.", + "Ha na-eme nke a n'agbanyeghị oku ọtụtụ otu na-akpọ ha emena ya.", + "Ngagharịiwe ahụ nke e ji #EndBadgovernanceinNigeria mara bụ nke e kwuru ga-amalite site n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọgọọst na-abịa na-ebute nkewa n'etiti Naijiria niile dịka ụfọdụ ndị na-akwado ya ebe ndị ọzọ na-akatọ ya.", + "Nke a na-abịa dịka gọọmenti mba Bangladesh na ụmụ akwụkwọ na-achịpu ya maka ngagharịiwe ha na-eme dịka ihe ruru mmadụ 150 nwụrụ na ya bụ ihe.", + "N'otu aka ahụ gọọmenti mba Kenya ji nwayọọ e so ngagharịiwe nke ndị ntorobịa mba ha dịka mmadụ ruru iri nwụrụ mgbe ndị nchekwa ji aka ike chụsaa ndị gbakọrọ maka ya bụ ihe.", + "Lee ihe BBC chọpụtara mere ka akwado ihibe ya mbụ.", + "\"Onye Igbo ọbụla esonyekwala na ngagharị iwe ọbụla\" - Ohaneze19 Febụwarị 2024", + "Gịnị ka ọ pụtara ma ụmụnwaanyị gbara ọtọ mee ngagharịiwe17 Febụwarị 2022", + "Ihe mere anyị ji gbaa ndi na-eme ngaghariwe egbe ose anya ụnyahụ- ndị uweojii13 Juun 2021", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Ebe foto si, Asiwaju Bola Tinubu/Facebook", + "Kemgbe akụkọ banyere ngagharịiwe ji malite, ụfọdụ ndị mmadụ etinyela ọnụ na ya.", + "Ndị ụlọomeiwu kpebiri n'izu gara aga na ha ga-enyefu ụgwọ ọnwa ha ruo ọnwa isii iji kwado mgbọ gọọmenti na-agba maka ọdịmma Naijiria.", + "N'otu aka ahụ ha akụkọ kwuru na ha akpọọla oku ka a tụgharịa ọnụ ahịa ụgwọ latrik ebuliri.", + "Gọọmentị n'onwe ha kesara gwongworo kwuru gwongworo bu osikapa na steeti niile dị na Naijiria iji belata agụụ.", + "Onyeisiala Bola Tinubu arịọkwala ndị ntorobịa ha mịa mma n'ọbọ ma nwere ya ndidi ịhụ na ihe tụgharịrị na Naijiria.", + "Dịka ihe si kwụrụ e nwebeghi otu pụtara kwuo na ọ bụ ha hibere ya bụ ngagharịiwe.", + "Kama na otu ihe doro anya bụ na ndị ntorobịa na-ekwusi ike maka ya bụ ngagharịiwe na-akpọ onwe ha oku pụta sonye n'ụbọchị ahụ.", + "Ahụike", + "Naijiria", + "Nchekwa ndị ụwe ojii", + "Ịji ego achụ ego", + "Akụ na ụba", + "Gịnị mere ndị Naịjirịa ji chọrọ ime ngagharịiwe na-agbanyeghi nwụchi a na-anwụchi ha?28 Julaị 2024", + "NA EME UGBU A, Ogbunigwe gbagburu ụmụaka 12 na Golan Heights ebutela esemokwu n'etiti Isreal na Hezbollah", + "Ihe Peter Obi, Orji Uzor Kalu na ndịọzọ kwuru maka ọnwụ Ifeanyi Ubah27 Julaị 2024", + "Etu ndị a ma ama si kwanyere Emmanuel Iwuanyanwu ugwu ikpeazụ25 Julaị 2024", + "Ihe ndị na-akwado ime ngagharịiwe chọrọ n'aka gọọmenti26 Julaị 2024", + "Gịnị ka “Gwo gwo gwo ngwo” egwu Mike Ejeagha a na-ewu ewu pụtara?23 Julaị 2024", + "South East Development Commission na uru ọ ga-abara mpaghara Ọwụwa Anyanwụ24 Julaị 2024", + "Aga m akpụpụ Bayo Onanuga n'ụlọikpe ma ọ bụrụ na ọ rịọghị m mgbaghara - Peter Obi23 Julaị 2024", + "Gịnị butere esemookwu n’etiti Dangote na ndị ọchịchị Naịjirịa?23 Julaị 2024", + "Ị maara uru nwa nwoke bara n'ezinaụlọ n'ala Igbo?18 Julaị 2024", + "Etu ndị a ma ama si kwanyere Emmanuel Iwuanyanwu ugwu ikpeazụ", + "Ka anyị jikọọ aka dozie Naịjirịa, hapụ ime ngagharịiwe - Osote onyeisiala Kashim Shettima", + "Sex for Grades: Unilag achụọla ndị nkuzi abụọ BBC gbara n'anwụEmelitere ikpeazụ na: 8 Ọktọba 2019", + "South East Development Commission na uru ọ ga-abara mpaghara Ọwụwa Anyanwụ", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwu", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/cd1rmn075d1o.json b/articles/cd1rmn075d1o.json new file mode 100644 index 00000000..5ef32135 --- /dev/null +++ b/articles/cd1rmn075d1o.json @@ -0,0 +1,69 @@ +{ + "published": "23 Julaị 2024", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "“Gwo gwo gwo ngwo” bụzi okwu dị n’ọnụ ọtụtụ mmadụ na soshal midia, ọkachasị Instagram, TikTok nakwa Facebook dịka otu onye a ma ama na-akpaọchị bụ Brain Jotter ji ya mee ihe onyonyo.", + "Ihe onyonyo Brainjotter mere akwụsịghị naanị n’owuwu, ọtụtụ mmadụ jizi ya “Gwo gwo gwo ngwo” eme ihe onyonyo nke ha iji ṅọmie ihe Brainjotter mere.", + "Na-agbanyeghi etu “Gwo gwo gwo ngwo” si n’ebe niile na soshal midia, ọtụtụ mmadụ na-agụ ya amaghị ihe ọ pụtara nakwa etu o siri malite.", + "Ngwa buru oche gị ka anyị kọọrọ gị ihe ọ pụtara;", + "Mike Ejeagha - Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ n'oge agha21 Julaị 2024", + "Etu ndị ntoroọbịa sị tụkọta ego ma rụziere Mike Ejeagha ụlọ ochie ya4 Eprel 2021", + "“Gwo gwo gwo ngwo” bụ ukwe egwu dị n’egwu akụkọ ifo nke otiegwu a ma ama bụ Mike Ejeagha tiri n’afọ 1983", + "Aha egwu ahụ Mike Ejeagha tiri nke nwere ukwe egwu “Gwo gwo gwo ngwo” bụ “Ka esi le Onye Isi Oche” nke dị n’efere egwu ya “AKUKO N’EGWU”.", + "Egwu ahụ (Ka esi le Onye Isi Oche) kọọrọ akụkọ ife etu Mbe siri ghọrịgbuo enyi ya bụ Enyi ma were ya isi lụọ Adaeze n’obodo ha.", + "Nke a mere mgbe Ada Eze tozuru agbọghọ nọrọla ọtụtụ afọ na-enweghi onye o kwere ka ọ lụọ ya na-agbanyeghi ọtụtụ ndị bịara ịlụ ya.", + "Eze jụrụ Ada ya ihe mere na ọ chọbeghi ịlụ di, Ada Eze kwuru na onye ọbụla ga-alụ ya ga-akpụtara nna ya Enyi.", + "Mgbe ha na-ekwu nke a, ọ bụrụ na mbe nọ n’akụkụ na-ege ntị n’ihe Eze na Ada ya na-ekwu.", + "Ngwa ngwa, Mbe gakwuuru enyi ya bụ Enyi, gwa ya na Eze kpọrọ ha oku na ọ ga-agba ọfalla ma sị na Eze kwuru na ọ ga-abụ onyeisioche n’emume ahụ.", + "Dịka ha na-akwado ịga ọgbakọ ahụ, Mbe gwara Enyi ka ọ kwọrọ ya n’azụ ma tinye ya ụdọ n’olu ka ọ ghara isi n’azụ Enyi daa dịka ha na-aga njem.", + "Mgbe ha na-aga n’ụzọ ka Mbe malitere ịgụ egwu ahụ sị;", + "“Nna m Eze akpata m Enyi, Gwo gwo gwo ngwo!", + "Nna m Eze akpata m Enyi, Gwo gwo gwo ngwo!", + "Nwa Mbe ị sị na ị kpata onye? Gwo gwo gwo ngwo!", + "Na asị m ala dube Enyi Chebe Enyi, ọ dị ka asị m akpata Enyi, Gwo gwo gwo ngwo!", + "Ọkwa onye ga-abụ onyeisi oche? Gwo gwo gwo ngwo!", + "Enyi na-aga na anyị so gị n’azụ, Gwo gwo gwo ngwo!”", + "Mgbe ha ruru n’ụlọ Eze, Mbe were ụdọ ahụ dị n’olu Enyi tinye Eze n’aka ma gwa ya na ọ bụ Enyi ka o ji bịara ịlụ Ada ya nwaanyị.", + "Etu a ka Mbe si were Enyi lụọ Ada Eze.", + "Ebe foto si, BrainJotter", + "Kamgbe izuụka ole ma ole Brainjotter ji egwu \"Gwo gwo gwo ngwo\" mee ihe nkiri 'skit', ọ malite iwu ebe niile.", + "Ọtụtụ mmadụ malitere na-ajụjụ ajụjụ onye ka Mike Ejeagha bụ, ebe ọ nọ nakwa etu ọnọdụ si dịrị ya.", + "Ndị maara ya ọfụma kọwara ebe o bi nke mere ụfọdụ ndị mmadụ agaala n'ụlọ ya ma nye ya onyinye dị iche iche.", + "N'otu aka ahụ, Brainjotter n'onwe ya gara nleta n'ụlọ Ejeagha, kelee ya ma nyekwa ya onyinye gụnyere nde naịra abụọ (N2m).", + "Ụfọdụ ndị mmadụ malitere ịkatọ ya ma sị na o ji egwu Mike Ejeagha na-enwete ego na soshal midia na ọ bụrụ naanị nde naịra abụọ ka ọ ga-enye ya.", + "Mana Brainjotter kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu, na ego o nyere bụ onyinye obi ọcha si n'akpa ya.", + "Mike Ejeagha bụ otiegwu a ma ama na-akọ akụkọ ifo n’egwu ya.", + "Ọ bụ nwafọ obodo Ezeagu dị n’Enugwu Steeti.", + "A mụrụ ya n’ụbọchị anọ nke ọnwa Epril n’afọ 1930", + "Ọ hapụrụ ụlọakwụkwọ n’afọ 1948", + "Ejeagha ji iti ogene malitere itiegwu ka ọ na-etolite okoroọbịa n’afọ 1945 mgbe ọ nọ n’otu a kpọrọ ‘Coal Camp Boys’", + "Ọ mụrụ ka e si akpụ isi n’afọ 1949 bụ nke ọ na-eme ma na-etikwa egwu.", + "Ejeagha mechara kwụrụ n’onwe ya na-eti egwu bụ ebe o tiri efere egwu gụnyere; Akụkọ na Egwu, Ụwa mgbede ka mma, Onye ndịdị dgz.", + "Aha a na-etukaarị ya bụ ‘Gentleman Mike’", + "Ihe mkparị ọchị", + "Akụkọ mgbe gboo", + "Anụmanụ", + "Ịkpa obi aṅụrị", + "Abụ", + "Omenala", + "Vidio, Jaydee Bombshell: Ndị Igbo kwesịrị ị na-akwado onwe ha maka na ugbua bụ oge ha, Duration 3,5326 Julaị 2024", + "Vidio, Gịnị ka “Gwo gwo gwo ngwo” egwu Mike Ejeagha a na-ewu ewu pụtara?, Duration 3,4523 Julaị 2024", + "Vidio, Mike Ejeagha - Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ n'oge agha, Duration 2,577 Febụwarị 2019", + "Ugwọọnwa opekatampe N70,000 enweghi ebe ọ ga-eruru anyị - Ndị ọrụ Bekee20 Julaị 2024", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/cw4y2q05qn3o.json b/articles/cw4y2q05qn3o.json new file mode 100644 index 00000000..9afc8c74 --- /dev/null +++ b/articles/cw4y2q05qn3o.json @@ -0,0 +1,79 @@ +{ + "published": "25 Julaị 2024", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ebe foto si, Ohaneze Ndigbo", + "Dịka onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ Emmanuel Iwuanyanwu lara mmụọ, ọtụtụ ndị isi a hụrụ kwaba okpu na Naịjirịa apụtala ikwuputa mwute ha n'ọnwụ Iwuanyanwu.", + "Ozi ezinaụlọ ya wepụtara kwuru na ọ nwụrụ n'ụbọchị Tọzde n'afọ 82 dịka ọ rịachara ọrịa obere oge.", + "Onyeisiala Bola Tinubu si n'aka onye na-anọchite anya ya n'ihe gbasara mgbasaoizi bụ Ajuri Ngelale ziga ozi itiakanobi n'ezinaụlọ Iwuanyanwu.", + "Ozi ahụ sị \"A ga-eji aha ọma ya (Iwuanyanwu) cheta ya mgbe niile\".", + "O gwakwara otu Ohaneze Ndigbo nakwa ndị Igbo niile ha jide obi n'ọnwụ otu onye dị oke mkpa na mpaghara ahụ.", + "Peter Mbah bụ aka na-achị Enugwu steeti pụtakwara zie ozi mwute nke ya", + "\"E ji m mwute nabata ozi ọnwụ onye ndu pụrụiche n'ala Igbo niile\" ka o kwuru.", + "Ọ sịkwa na Ahaejiagamba bụ aha e ji mara Onyeisi Ohaneze nwụrụ anwụ bụ onye banyere n'ọkwa otu ahụ mgbe ihe siri ike.", + "N'ọnụ ya \"Ihe efunariala Ndigbo, Naịjirịa nakwa Afrịka niile\".", + "Charles Chukwuma Soludo bụ aka na-achị Anambra steeti kwuputara mwute ya kwa n'ọnwụ Iwuanyanwu.", + "Ọ kọwara na nwoke ahụ bụ onye ọ na-elegara anya ma jiri na-ama atụ n'ihe gbasara ọchịchị.", + "\"Iwuanyanwu bụ onye na-achọ ndịnotu ma na-agba mbọ oke na ọdịmma ndị Igbo na Naịjirịa niile\" ka ozi ya kwuru.", + "Emeka Ihedioha nke chịburu Imo steeti naanị ọnwa isii sokwa na ndị tinyere ọnụ n'okwu a", + "O dere n'akara Twitter ya sị na Iwuanyanwu bụ ọpụrụiche n'ihe niile o mere gụnyere ijiegoachụego, ụlọụka, ndọrọndọrọọchịchị, egwuregwu nakwa mwulite obodo.", + "\"Mụ na ezinaụlọ m na-ezigara ndị Imo, Ohaneze na ndị Igbo niile ozi itiakan'obi\" ka o dere.", + "Eduola Emmanuel Iwuanyanwu n'iyi ọrụ dịka onyeisi ọhụrụ nke Ohaneze Ndigbo1 Mee 2023", + "Emmanuel Iwuanyanwu: Ọ bụ isi kara aka ga-ebuli okiti nke Ohaneze Ndigbo17 Mee 2023", + "Nnamdi Kanu bụ isi sekpụ ntị maka udo tọrọ atọ n'Ọwụwa Anyanwụ - Emmanuel Iwuanyanwu2 Mee 2023", + "Ebe foto si, Emmanuel Iwuanyanwu/Facebook", + "Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Emmanuel Iwuanyanwu anwụọla.", + "Iwuanyanwụ nwụrụ dịka ọ gbara afọ 82.", + "Ọnụ na-ekwuru otu Ohaneze Ndigbo bụ Alex Ogbonnia gwara BBC nke a n'ekwentị ma kwuo na \"ọ bụ eziokwu\".", + "O kwukwara na ọ bụ n'ụlọọgwụ ka Iwuanyanwu nọ were lakwuru ndị ichie.", + "Ozi ọzo nke nwa Iwuanyanwu bụ Jide Iwuanyanwu binyere aka kwuru na ọ nwụrụ n'ụbọvhị Tọzde dịka \"ọ rịachara ahụ obere oge\".", + "\"Usoro akwamozu ya ga-apụta n'ọdịnịhu ma ezinaụlọ ya gbachaa izu\" ka ozi ahụ kwuru.", + "Iwuanyanwu banyere n'ọkwa ọchịchị Ohaneze Ndịgbo dịka onye nọbu n'ọkwa ahụ bụ George Obiozor nwụrụ n'afọ 2022.", + "Otu ndị okenye nke Ohaneze Ndigbo a na-akpọ 'Imeobi Ohaneze' họpụtara ya ma duo ya n'iyiọrụ n'ụbọchị 30 nke ọnwa Eprelu afọ 2023.", + "Ebe foto si, Ohaneze Ndigbo", + "N'ozi nnabata ọkwa ahụ, Iwuanyanwu sị na ya ji obi ya niile na-anabata ọrụ ịbụ onyeisi Ohaneze.", + "O kwekwara nkwa na ọchịchị ya ga-agbado anya n'atụmatụ ga-eweta mwulite ọnọdụ agụmakwụkwọ, nkọpụta ihe oriri, mmepe obodo, mmepụta ọkụ latrik, mwulite ọnọdụ ahụike na ihe ndị ọzọ na mpaghara ala Igbo.", + "Tupu ọ nwụọ, Ohaneze Ndigbo n'ọchịchị ya na-agba mgbọ ịhụ na atọghapụrụ Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu ndị na-achọ mmwereonwe bụ Ipob ebe ọ nọ n'aka ndị DSS.", + "A mụrụ Iwuanyanwụ onye e ji ‘Ahaejiejemba’ maara n’ụbọchị anọ nke ọnwa Sepụtemba, 1942 n’obodo Atta n’okpuruọchịchị Ikeduru, Imo Steeti.", + "Ọ hụrụ akwụkwọ na mahadu Naịjirịa dị na Nsukka na ngalaba ‘civil engineering’.", + "Ọ rụrụ ọrụ n’ụlọọrụ Hardel na Eric bụ ndị na-arụ ụzọ na ụlọ bụ nke o mechara zụta site n’aka ndị ofesi nwee ụlọọrụ ahụ.", + "Ọ bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa onye oji ego achụnta ego a ma ama na Naịjirịa nakwa mbaụwa.", + "Ọ bụ ya hibere otu egwuregwu bọọlụ Iwuanyanwu Nationale dị n’Owerri, nke a na-akpọzi Heartland FC ugbua.", + "Ọ lụrụ nwunye ya Eudora Ozinyereaku Anyanwu bụ onye nwụrụla anwụ dịka ha mụtara ụmụ asatọ (nwoke atọ na nwaanyị ise).", + "Ọ mechara lụọ Frances Iwuanyanwu ma nwee ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ọ kachasị Nwadiuto Iheakanwa bụ onyeisi ụlọntaakụkọ Champion Newspaper.", + "Iwuanyanwu bụbu onyeisioche ndị okenye Ohanaeze Ndigbo tupu a họpụta ya dịka onyeisi Ohanaeze n’ụwa gbaa gburu gburu.", + "Naijiria", + "Imo steeti", + "Omenala", + "Gịnị mere ndị Naịjirịa ji chọrọ ime ngagharịiwe na-agbanyeghi nwụchi a na-anwụchi ha?28 Julaị 2024", + "NA EME UGBU A, Ogbunigwe gbagburu ụmụaka 12 na Golan Heights ebutela esemokwu n'etiti Isreal na Hezbollah", + "Ihe Peter Obi, Orji Uzor Kalu na ndịọzọ kwuru maka ọnwụ Ifeanyi Ubah27 Julaị 2024", + "Etu ndị a ma ama si kwanyere Emmanuel Iwuanyanwu ugwu ikpeazụ25 Julaị 2024", + "Ihe ndị na-akwado ime ngagharịiwe chọrọ n'aka gọọmenti26 Julaị 2024", + "Gịnị ka “Gwo gwo gwo ngwo” egwu Mike Ejeagha a na-ewu ewu pụtara?23 Julaị 2024", + "South East Development Commission na uru ọ ga-abara mpaghara Ọwụwa Anyanwụ24 Julaị 2024", + "Aga m akpụpụ Bayo Onanuga n'ụlọikpe ma ọ bụrụ na ọ rịọghị m mgbaghara - Peter Obi23 Julaị 2024", + "Gịnị butere esemookwu n’etiti Dangote na ndị ọchịchị Naịjirịa?23 Julaị 2024", + "Ị maara uru nwa nwoke bara n'ezinaụlọ n'ala Igbo?18 Julaị 2024", + "Etu ndị a ma ama si kwanyere Emmanuel Iwuanyanwu ugwu ikpeazụ", + "Ka anyị jikọọ aka dozie Naịjirịa, hapụ ime ngagharịiwe - Osote onyeisiala Kashim Shettima", + "Sex for Grades: Unilag achụọla ndị nkuzi abụọ BBC gbara n'anwụEmelitere ikpeazụ na: 8 Ọktọba 2019", + "South East Development Commission na uru ọ ga-abara mpaghara Ọwụwa Anyanwụ", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwu", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file