diff --git a/articles/51994645.json b/articles/51994645.json new file mode 100644 index 00000000..b7e573be --- /dev/null +++ b/articles/51994645.json @@ -0,0 +1,87 @@ +{ + "published": "22 Maachị 2020", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ebe foto si, Food Ace/Instagram", + "Gwam gwam gwam gwam nri i gaghị ejinwu ojoko nke ndị bekee na-akpọ Plantain were sie?", + "Ojoko dị a ka nwa agbọghọ mara mma a na-atụkwasara eze oge mgbe gboo.", + "OjokO na-enye ụmụ ihe na-enyemaka Bekee kpọrọ \"Iron\", \"Vitamins\", nakwa \"fiber\" n'ahụ.", + "Onye afọ nri! Lekwa ihe mere ụtọ agwa ji aba n'ụmị", + "Nutrition: Oke ibu abụghị na ahụ dị nwa gị", + "Etu ị ga-esi jiri chocolate na-akwụkwọ nri chụọ nsogbu ụbụrụisi", + "E nwereike isi, ihụn, ịghe, ịgwọ maọbụ sekọ ojoko esekọ.", + "Lee ụzọ ole na ole ga-abụ isie Plantain ọ bụrụ ericha amịchaa aka.", + "Nke m ga-ebuzo bupute bụ ojoko ahụrụ ahụ", + "Ebe foto si, Food Ace/Instagram", + "Nke a bụ mgbado ume ụmụ mmadụ ji ejide onwe ha ma agụrụ na-anyụ ha anya.", + "A na-eji mmanụ nri na ụgba, ose na ogiri were esuru ya. Ụfọdụ na-ejikwa ofe tomanto eri ya.", + "Gote ojoko chatụrụ acha", + "Kpechasia azụ ya", + "Hụnye ya n'ọkụ", + "Na-akpagha ya ka ọ ghara ire ọkụ", + "O ghee, ị kpachasịa ahụ ya", + "Mepụta mmanụ Igbo were ya ripia ya.", + "Ojoko eghere eghe", + "Ebe foto si, Food Ace/Instagram", + "Ndị akpịrị ibem bịanu oo. Biko kedụ nri bụ eze ma a sị ka e chi eze maka nri e ji agba ụtụtụ.", + "I nwere ike iji akwa maọbụ akamụ were rie ya.", + "E jikwa ojoko eghere eri ọsikapa.", + "E jikwa ojoko eghere eghe eri beans makana ha abụọ bụ dị na nwunye na-ekweghị agbasa agbasa.", + "E ji ojoko eghere eghe agwọ anụ, nke ndị bekee gizdodo.", + "E jikwa ojoko eghere eghe eme kpekere nke bekee na-akpọ \"Plantain chips\".", + "Ojoko e ji akwụkwọ nri gwọọ", + "Ebe foto si, Food Ace/Instagram", + "Nwanne ọ bụrụ na ọbara maọbụ ike kọrọ gị n'ahụ, ndị dọkịta na-adụkarị ọdụ ka i rie ojoko eji akwụkwọ nri were gwọọ.", + "Ọ bụ ojoko na-achaghị acha ka e ji esi ya bụ nri.", + "Bacha ojoko na-achaghị acha", + "Bee ya kịrị kịrị ma sacha ya wunye n'ite.", + "Gbanye mmiri na-agaghị agafe ogo unele ahụ rinne.", + "Bee yabasi tinye na ya.", + "Sụọ ịsha, ose na maggi tinye", + "Tinye azụ ọkpọ maọbụ anụmanụ ọzọ na-amasị gị", + "Ọ sụwa, ghewe were ngazi eji agwa gari wee tụgharịwa ya.", + "Ọ rọkọọ etu isi chọọ, i fenye ya akwụkwọ nri.", + "Fọtuo ya ozigbo.", + "Nri egheela ooo.", + "Ojoko esiri esi", + "Ebe foto si, Food Ace/Instagram", + "Onye ume na-adịghị ihụwa, ighe maọbụ igwọ, ga-esinwu ya etu ahụ ọ dị ma suo ya n'ofe ọbụla masiri ya.", + "Ojoko esere ka nri ji", + "Nke a ọ tụrụ gị n'anya? Ya atụkwala gị ma ncha. A na-akwọri ya ka aja ma sekọọ ya na akpụ were ya rie ofe gụrụ gị agụụ.", + "Akụkọ ndị ga-amasị gị:", + "Coronavirus ga-agabiga Abia maka na Abia dị n'akwụkwọ nsọ - Ikpeazu", + "Adeboye kara ụka ya n'okpokoro ụlọụka Redeemed", + "World food day: Ụdọdụ nri ndị Igbo anaghị erikawazị16 Ọktọba 2019", + "Vidio, Nri ogbenye ọgaranya na-erizi5 Eprel 2018", + "Nigerian Foods: Onye afọ nri! Lekwa ihe mere ụtọ agwa ji aba n'ụmị23 Febụwarị 2020", + "'E nwere oge udo, nwee oge agha, ugbua bụ oge agha' - Praịm Mịnịsta Israelelekere 5 gara aga", + "Ben Nwabueze, ọkaiwu nwere agba alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 9430 Ọktọba 2023", + "Etu aka siri kpara nwokorobia a sị na-ezu ụmụaka,ere n'Enugwu steetielekere 9 gara aga", + "Etu e si chọta ozu mmadụ karịrị 70 n'ebe a na-ere ehi na Lokpanta - Alex Otti1 Ọktọba 2023", + "Etu mba Indonesi si jiri mmanụ nri mepụta mmanụ e ji akwọ ụgbọelu29 Ọktọba 2023", + "'Akpọtara m nwa akwụkwọ na ndu, bịa ịkpọrọ ya ọ bụrụ n'ozụ'- Nwaanyị nwa ya si ụlọelu ụlọakwụkwọ ya daa, nwụọ23 Ọktọba 2023", + "Ụlọikpe ewepula mmachi Ipob, kwuo ka enye Nnamdi Kanu ijeri 827 Ọktọba 2023", + "Alaba International Market: Gọọmentị Legọs emepeela ahịa a ha mechiburu n'ihi ebubo iru unyi28 Ọktọba 2023", + "Ihe gọọmentị kwuru maka nwa akụkọ Naịjirịa a sị e gburu na mba Philippines23 Ọktọba 2023", + "Etu aka siri kpara nwokorobia a sị na-ezu ụmụaka,ere n'Enugwu steeti", + "Ben Nwabueze, ọkaiwu nwere agba alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 94", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 7 Juun 2020", + "Kedụ ihe ndị agbụrụ ọzọ na-ekwukarị ha jiri mara ndị Igbo?Emelitere ikpeazụ na: 19 Jenụwarị 2023", + "Gov Fubara impeachment plot: Ihe anyi maa maka nkata ịchụtu Gọvanọ River state", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2023 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/53928750.json b/articles/53928750.json new file mode 100644 index 00000000..c7f8272a --- /dev/null +++ b/articles/53928750.json @@ -0,0 +1,74 @@ +{ + "published": "28 Ọgọọst 2020", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Ọtụtụ omenala Igbo nwere bụ ihe ndị mmadụ ka na-akwadosi ike n'agbanyeghị na ọtụtụ amaghị ihe ha pụtara.", + "Ịma atụ bụ etu mmadụ na-esi ete nzu Bekee a na-akpọ \"powder\" n'ihu maọbụ n'aka ma ọ garuo ebe a mụrụ nwa ọhụrụ, mana ọtụtụ amaghị ihe ya na ya so.", + "Akụkọ a ga-etinye anya n'ụfọdụ omenala ndị a na mpụtara ha.", + "Uru nzu bara n'ala Igbo", + "Uru ọmụgwọ n'omenala Igbo", + "Ihe di kwesịrị imere nwunye ya mụrụ nwa ọhụrụ", + "Ite nzu maọbụ 'paụda'", + "Maazị Ozioma Odinani bụ onye ihe omenala Igbo na-adị mma, kọwara na \"powder\" bụ ihe ndị agba ọhụrụ ji mere nzu.", + "N'Igbo gboo, nzu bụ amụma ọcha.", + "Talcum Powder: Kwụsilata ka isi ete nzu bekee maka ọrịa Kansa- Ọkammụta akpụkpọahụ", + "Ozioma sị: \"a mụọ nwa ọhụrụ, a na-ahụ ya dịka onwe enweghị njọ, nke mere ndị mmadụ ji ete nzu iji mee ọṅụ nwa.", + "Ihe aka e tere nzu pụtara:", + "Ebe e tere nzu nwekwara ihe ọ pụtara.", + "Ị hụ onye si ebe a na-eme ọṅụ tere nzu n'aka nri ya, o gosiri na ọ bụ nwa nwoke ka o si ọṅụ ya.", + "Ọ bụrụ n'aka ekpe, ị mara na ọ bụ nke nwa nwaanyị.", + "Eriri otubo nwa so n'ihe a na-akwanyere ezigbote ugwu n'ala Igbo.", + "Dịka omenala siri dewe, a na-eli eriri otubo ebe a mụrụ nwa ahụ. Ya bụ, ugbua a na-aga ije, n'usoro omenala, e kwesịrị iwere eriri otubo nwa laa obodo nna ya gaa lie ya.", + "Omenala a abụghị ihe a ka na-emesi ike ugbua, mana ụfọdụ ka na-eme ya.", + "Ili alọ (placenta)", + "Dịka eriri otubo, alọ bụkwa ihe a na-asọpụrụ nke ukwuu n'ala Igbo.", + "Dịka eriri otubo, a na-eli uwo n'ebe nwa a mụrụ ọhụrụ si.", + "Etu o si kwụrụ bụ na a ga-ahọta otu ukwu osisi n'ezinaụlọ nwa ọhụrụ ahụ, ma lie uwo ya n'ukwu osisi ahụ. Mana, ugbua, anaghịzị emekarị ya.", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Mmadụ niile ma ihe bụ ọmụgwọ, nke bụ mgbe nne nwaanyị maọbụ nne di ya nọnyetụrụ ha iji nyere ha aka.", + "Ọtụtụ mmadụ na-ahụ uru ọmụgwọ bara na etu nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ga-esi nwete enyemaka nakwa nkwado.", + "Ọmụmụ na-esokwa ya, ọkachasị ebe nwaanyị amụbeghị nwa mbụ.", + "Ịgụ nwa aha", + "Ndị Igbo na-eme emume ịgụ aha site n'ụbọchị asaa ruo ụbọchị 12 a mụchara nwa. Ihe a bụ oge a na-egosi obodo nwa ahụ.", + "N'emume a, ezinaụlọ nakwa ndị obodo na ndị enyi ga-ezukọ kpeere nwa ahụ ekpere.", + "Ugbua, ọtụtụ mmadu na-agazị ụka ime emume a ebe ọtụtụ anaghị eche ka oge a ruo tupu ha a gụọ nwa aha.", + "Ibi ugwu", + "Ibi ugwu bụbu ihe a na-eme nwa nwoke nakwa nwa nwaanyị, mana ugbua, ọ bụzị sọsọ nwa nwoke ka a na-ebi ugwu.", + "A na-ebikarị nwa nwoke ugwu ma ọ gafechaa abalị atọ maọbụ karịa, a mụrụ ha.", + "A na-asị na ọ dị mma ibi ugwu ahụ tupu nwata amata na ihe na-afụ ụfụ, dịka a na-eche na ihe anaghị afụ nwa ọhụru ụfụ etu ọ sị afụ nke katarala ahụ.", + "Amachaghị uru ibi ugwu baara ndị Igbo mana a na-ekwu na ọ bụ ihe si n'oge gboo.", + "Ụmụnwaanyị na-egoli maka mbugo ọnwa ọmụgwọ6 Juun 2018", + "Ọmụgwọ ọ bụ omenala ga-akwụsị n'ala Igbo?15 Maachị 2018", + "Maternal Mortality: Uche Jombo na ụmụnwaanyị ndị ọzọ kwuru ihe mere ha agaghị amụju ụlọ30 Disemba 2019", + "'E nwere oge udo, nwee oge agha, ugbua bụ oge agha' - Praịm Mịnịsta Israelelekere 5 gara aga", + "Ben Nwabueze, ọkaiwu nwere agba alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 9430 Ọktọba 2023", + "Etu aka siri kpara nwokorobia a sị na-ezu ụmụaka,ere n'Enugwu steetielekere 9 gara aga", + "Etu e si chọta ozu mmadụ karịrị 70 n'ebe a na-ere ehi na Lokpanta - Alex Otti1 Ọktọba 2023", + "Etu mba Indonesi si jiri mmanụ nri mepụta mmanụ e ji akwọ ụgbọelu29 Ọktọba 2023", + "'Akpọtara m nwa akwụkwọ na ndu, bịa ịkpọrọ ya ọ bụrụ n'ozụ'- Nwaanyị nwa ya si ụlọelu ụlọakwụkwọ ya daa, nwụọ23 Ọktọba 2023", + "Ụlọikpe ewepula mmachi Ipob, kwuo ka enye Nnamdi Kanu ijeri 827 Ọktọba 2023", + "Alaba International Market: Gọọmentị Legọs emepeela ahịa a ha mechiburu n'ihi ebubo iru unyi28 Ọktọba 2023", + "Ihe gọọmentị kwuru maka nwa akụkọ Naịjirịa a sị e gburu na mba Philippines23 Ọktọba 2023", + "Etu aka siri kpara nwokorobia a sị na-ezu ụmụaka,ere n'Enugwu steeti", + "Ben Nwabueze, ọkaiwu nwere agba alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 94", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 7 Juun 2020", + "Kedụ ihe ndị agbụrụ ọzọ na-ekwukarị ha jiri mara ndị Igbo?Emelitere ikpeazụ na: 19 Jenụwarị 2023", + "Gov Fubara impeachment plot: Ihe anyi maa maka nkata ịchụtu Gọvanọ River state", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2023 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/c72mpndvd0no.json b/articles/c72mpndvd0no.json new file mode 100644 index 00000000..94fe4dbc --- /dev/null +++ b/articles/c72mpndvd0no.json @@ -0,0 +1,64 @@ +{ + "published": "29 Ọktọba 2023", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Mba Indonesia ejirila mmanụ nri mepụta mmanụ pụrụ ije e ji akwọ ụgbọelu, dịka mba ahụ na-eme nnyocha ịchọpụta ụdị mmanụ ndị ọzọ e nwereike iji na-eme ihe ma wetulata aka na mbubata mmanụ ụgbọala.", + "Ọ bụ ụlọọrụ 'Garuda Indonesia' ji mmanụ ahụ pụrụ iche e ji mmanụ nri mepụta kwọọ ụgbọala Boeing 737-800NG nke bu ndị njem 100 si Jakarta gaa Surakarta.", + "Ụlọọrụ mepụtara mmanụ ahụ pụrụ iche bụ ụlọọrụ 'Indonesia State Energy Firm PT Pertamina (PERTM.UL).", + "Ha ji akụrụngwa a kpọrọ hydro-processed esters' nakwa 'fatty acids', site n'usoro tekịnụzụ a kpọrọ HEFA iji mepụta mmanụ a pụrụ iche site n'akị.", + "Gịnị bụ ‘Dome’ a na-echekwa ihu eluigwe mba Isreal megide ogbunigwe?20 Ọktọba 2023", + "Ọgba mbọ: Ọmịiko m nwere n’ebe onye ngwọrọ nọ mere m ji rụọ ‘electric wheel chair’ – Honesty Godwin3 Ọgọọst 2023", + "Ụlọikpe ewepula mmachi Ipob, kwuo ka enye Nnamdi Kanu ijeri 827 Ọktọba 2023", + "Ụlọntaakụkọ Reuters kwuru na ụlọọrụ Garuda mere ọtụtụ nchọcha n'ọnwa Ọgọsta nakwa na mmalite ọnwa Ọktoba maka mmanụ a pụrụ iche ha mepụtara.", + "N'otu aka ahụ kwa, ụlọọrụ Pertamina kwuru na mmanụ ahụ ha ji mkpụrụ nkwụ mepụta na-ewetu mmepụta ikuku 'greenhouse gas', karịa mmanụ 'fossil fuel'.", + "Harris Yahya bụ otu n'ime ndị isi na ngalaba mmepụta mmanụ nke mba Indonesia kwuru na mmanụ 'biofuel' ga-ewetu mmetụta 'greenhouse' n'ụwa.", + "Ebe foto si, Getty Images", + "N'afọ 2021 ka Indonesia bu ụzọ jiri mmanụ a pụrụ iche e si na mkpụrụ nkwụ mepụta kwọọ ụgbọelu si n'obodo Bandung gaa Jakarta, mana ụgbọelu ahụ ebughi ndị njem.", + "Ndị ọ kacha mara kwuru na ngalaba njem ga achọ ihe ruru ijeri lita 450 nke mmanụ a pụrụ iche a kpọrọ 'Sustainable Aviation Fuel' (SAF) n'afọ 2050 iji nwee ike ịkwụsị iji mmanụ biofuel kpamkpam.", + "Mana ụfọdụ mba ndị ọzọ na-akatọkwa atụmatụ a dịka ha na-ekwu na mmepụta mmanụ a ebe o buru ibu ga-ebute igbutu ọtụtụ osisi nkwụ ma kpata ihe a na-akpọ 'deforestation'.", + "Otu European Union etinyela mmachi na mbubata mmanụ nkwụ. Ọzọkwa, kamgbe afọ 2022 ka Indonesia machiri mbupu mmanụ nri n'ụdị ọbụla.", + "Ebe foto si, Getty Images", + "ndị nnyocha sayensị amalitela nchọcha maka iji mmanụ si n'abụba ezi na ụmụ anụmanụ ndị ọzọ iji mepụta mmanụ e ji akwọ ụgbọelu", + "N'ime afọ 20 gara aga, nchọcha miri emi na-aga n'ihu iji mata etu e nwereike iji were mmanụ si n'ahụ ụmụ anụmanụ maọbụ nsị ụmụ anụmanụ iji mepụta ihe dị icheiche.", + "Nnyocha ọhụrụ gosiri na nke a abawanyela nke ukwuu n'ebe afọ 2006.", + "Ụfọdụ mmanụ e mepụtara n'ụzọ dị otu a ka e jiri kwọọ obere ụgbọala na nnukwu ụgbọala dị icheiche dịka 'truck', mana gọọmentị na-enye nkwado iji mara ma a ga-ejinwu mmanụ ndị a kwọọ ụgbọelu, iji mee ka njem elu dịwanye ọcha.", + "Dịka ngalaba na-ahụ maka njem na gburugburu na mba UK si kwuo, njem ụgbọelu ga-esi Paris gaa New York ga-ewe abụba si n'ahụ ọtụtụ ezi ọnụọgụgụ ha ga-eru 8,800.", + "Mana ngalaba ndị ọzọ na-eji mmanụ si n'ahụ ụmụ anụmanụ nakwa nsị ụmụ anụmanụ eme ihe dị icheiche na-ekwu na ọ bụrụ na ngalaba njem elu malite ịchọ mmanụ ụmụanụmanụ ndị a, ọ ga-emetụta ha nke ọma maka na ọ ga-eme ka ngwaọrụ ha kọọ ụkọ.", + "Tekinụzụ", + "Indonesia", + "Njem ụgbọelu", + "Simeon Okezuo Nwobi: Onye bụ ụkọchukwu a Pope họpụtara dịka Bishọp Ahiara Diocese?14 Ọktọba 2023", + "Teachers Salary: Kedụ ihe ndị nkuzi na-eri n'ụgwọọnwa n'Ugwu na Ndịda Naijiria? 11 Ọktọba 2023", + "Ihe kpalitere m ji see eserese obodo Amagu nke fesara n'ịntanetị niile - Juliet Godwin1 Ọktọba 2023", + "'E nwere oge udo, nwee oge agha, ugbua bụ oge agha' - Praịm Mịnịsta Israelelekere 5 gara aga", + "Ben Nwabueze, ọkaiwu nwere agba alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 9430 Ọktọba 2023", + "Etu aka siri kpara nwokorobia a sị na-ezu ụmụaka,ere n'Enugwu steetielekere 9 gara aga", + "Etu e si chọta ozu mmadụ karịrị 70 n'ebe a na-ere ehi na Lokpanta - Alex Otti1 Ọktọba 2023", + "Etu mba Indonesi si jiri mmanụ nri mepụta mmanụ e ji akwọ ụgbọelu29 Ọktọba 2023", + "'Akpọtara m nwa akwụkwọ na ndu, bịa ịkpọrọ ya ọ bụrụ n'ozụ'- Nwaanyị nwa ya si ụlọelu ụlọakwụkwọ ya daa, nwụọ23 Ọktọba 2023", + "Ụlọikpe ewepula mmachi Ipob, kwuo ka enye Nnamdi Kanu ijeri 827 Ọktọba 2023", + "Alaba International Market: Gọọmentị Legọs emepeela ahịa a ha mechiburu n'ihi ebubo iru unyi28 Ọktọba 2023", + "Ihe gọọmentị kwuru maka nwa akụkọ Naịjirịa a sị e gburu na mba Philippines23 Ọktọba 2023", + "Etu aka siri kpara nwokorobia a sị na-ezu ụmụaka,ere n'Enugwu steeti", + "Ben Nwabueze, ọkaiwu nwere agba alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 94", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 7 Juun 2020", + "Kedụ ihe ndị agbụrụ ọzọ na-ekwukarị ha jiri mara ndị Igbo?Emelitere ikpeazụ na: 19 Jenụwarị 2023", + "Gov Fubara impeachment plot: Ihe anyi maa maka nkata ịchụtu Gọvanọ River state", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2023 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file