From 644ce9f17130e21a9dfaa979a81ec5c8cfaabc12 Mon Sep 17 00:00:00 2001 From: "github-actions[bot]" <41898282+github-actions[bot]@users.noreply.github.com> Date: Mon, 11 Sep 2023 00:45:40 +0000 Subject: [PATCH] Mon Sep 11 2023 00:45:40 GMT+0000 --- articles/45397445.json | 100 +++++++++++++++++++++++++++++++++++++ articles/cjm8yv2jrwmo.json | 65 ++++++++++++++++++++++++ articles/cw9gp7vryglo.json | 55 ++++++++++++++++++++ articles/cyrjvxmxgv2o.json | 71 ++++++++++++++++++++++++++ 4 files changed, 291 insertions(+) create mode 100644 articles/45397445.json create mode 100644 articles/cjm8yv2jrwmo.json create mode 100644 articles/cw9gp7vryglo.json create mode 100644 articles/cyrjvxmxgv2o.json diff --git a/articles/45397445.json b/articles/45397445.json new file mode 100644 index 00000000..5f52d18f --- /dev/null +++ b/articles/45397445.json @@ -0,0 +1,100 @@ +{ + "published": "4 Septemba 2018", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ebe foto si, Empics", + "N'omenaala Igbo, nwoke na nwaanyị ahaghị aha n'anya.", + "A na-agbado ụkwụ ma mmadụ abụ nwoke maọbụ nwaanyị n'ike ọrụ maọbụ oke dịrị onye.", + "Ihe ị kwesiri ịma maka okpueze ala Igbo", + "Ihe asaa nwoke Igbo chọrọ na nwaanyị ọ ga-alụ", + "Ihe iri agboghọ ugbua chọrọ na nwoke ga-alụ ya", + "Nwoke a ga-azanwu aha nna nwunye ya n'ala Igbo?", + "Ụmụnwoke n'agbanyeghị ma ha abụ nwata, karịrị nwaanyị n'ọkwa na ngụkọ dịka omenaala Igbo si dịrị.", + "Ya mere, o nwere ọrụ maọbụ ohere a mabidoro na nwaanyị enweghị ikike ya nke bụ na nwaanyị nupuru isi n'ihe ndị a 'mere arụ'.", + "Lee ụfọdụ n'ime ihe ndị nwaanyị anaghị eme:", + "Nwaanyị anaghị arị maọbụ ete nkwụ", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Nwaanyị anaghị arị nkwụ n'ala Igbo", + "N'ala Igbo, nwaanyị anaghị arị elu nkwụ, elu ọjị maọbụ ọjịị.", + "Ngawuchu kwuru na nwaanyị anaghị arị nkwụ n'ihi na nwaanyị esighị ike.", + "\"O nwere ike rịa elu nkwụ, hụ agwọ, egwu ejide ya, ọ daa n'elu.\"", + "N'okwu ọkammụta asụsụ Igbo na Mahadum Legọs (University of Lagos) bụ Chigozie Nnabuihe, ọ bụ iji chekwa ugwu nwaanyị.", + "Nnabuihe kọwara na oge gboo, nwaanyị anaghị eyi akwa na-awachi ahụ nwaanyị nke mere na ọ rịa elu, onye nọ n'ala ga-ahụ ọtọ ya.", + "Nwaanyị anaghị eketa ala obi", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Nwaanyị nwere ike inweta ebe ịkọ ubi mana ọ gaghị enwe ikike ire ya maọbụ nye onye ọzọ", + "N'ala Igbo, nwaanyị anaghị eketa ala obi.", + "Nkwenye Ndigbo dịka otu okenye, Chukwudi Nganwuchu, siri kọwa bụ na nwaanyị nwere oke naanị na be di ya.", + "Mana n'ezie, nwaanyị anaghị enweta oke na be di ya ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwoke.", + "O nwere ike e nye nwaanyị ebe ịkọ ọrụụgbo mana ọ bụghị nke ya n'ezie n'ihi na onweghị ikike ire ya maọbụ inye ya onye ọzọ.", + "Nwaanyị anaghị edu ụmụnwoke, ọ naghị aga agha", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Nwoke ka ọ dịrị iga agha n'ala Igbo", + "Nwaanyị anaghị edu ụmụnwoke n'ọgbakọ maọbụ n'agha.", + "Na nkọwa ya, Ọkammụta Nnabuhe sị \"O bụ nwoke ka ọ dịrị ichekwa ezinaụlọ ya. Ọ bụ ụmụnwoke ka ọ dịrị ichekwa obodo.\"", + "Ebe foto si, Empics", + "Nwaanyị anaghị awa ọjị ebe nwoke nọ.", + "Ọ bụ naanị oge ụmụnwaanyị gbakọrọ naanị ha ka onye kachasị okenye n'ime ha nwere ike ịwa ọjị mana ọgaghị agọ ya agọ.", + "Dịka Nnabuihe kwuru, ihe kpatara na nwaanyị anaghị agọ ọjị bụ na ọjị bụ ihe dị nsọ, nwaanyị nwere oge ọ na-anọ na nso; ọ ga-emerụ ọjị.", + "Ebe foto si, @igboweddings", + "Nwanyị anaghị anọ ebe a na-ekwu akụ nwaanyị ọ masị ya, ya bụrụ na di ya anwụọla.", + "Nnabụihe sị \"Ọ bụ iji gosi na ọbụghị anụmanụ ka a na-azụ, ọ bụ mmadụ ka a na-alụrụ. Ọ bụ anụmanụ na-anọ ebe a na-ekwe ya ọnụ.\"", + "Nwaanyị anaghị ata eke ọkụkụ", + "Ebe foto si, kaffiskitchen", + "Nwaanyị ekwesighị iri eke ọkụkọ dịka omenaala Igbo siri dị", + "Otu okenye aha ya bụ Chukwudi Nganwuchu gwara BBC Igbo na ihe mere ndị gboo jiri machie nwaanyị ịta eke ọkụkọ bụ na e nwere nkwenye na eke ọkụkọ na-atọ ụtọ ebe ọ dị ukwu nke na 'nwaanyị tara ya ga-ebido gbawa n'ezi.'", + "Nnabuihe kwuru sị, \"Eke ọkụkọ bụ nke nwoke. Akpụrụotule bụ nke ya, isi ya nke diọkpara. Ada nwe ukwu ya. agba dịkwara ada.\"", + "Nwaanyị nọ na nsọ anaghị esiri onye chiri echichi n'ala Igbo, nri.", + "Ọ bụrụgodu na di ya bụ onye chiri ọzọ, ọ gaghị eri nri nwaanyị ma ọ nọrọ na nsọ.", + "Nnabụihe sị, \"Onye chiri echichi bụ onye dị nsọ. Ọ bụrụ na o rie nri nwaanyị nọ na nsọ o merụọ nsọ ya.\"", + "Nwaanyị anaghị alụ nwoke", + "Nwaanyị enweghị ike lụọ nwoke etu nwoke si aga alụ nwaanyị.", + "N'ekele, nwaanyị anaghị eri aka atọ", + "Ebe foto si, Nonso Mcginger Ibeneme @mcginger22", + "N'ekele, nwaanyị anaghị ana aka", + "Nwaanyị anaghị eri aka atọ maọbụ kwuo 'Igbo kwenu', 'Ndigbo mmammanụ o'.", + "\"Nwaanyị nwere ike ikwu, \"Ndị di m ekele m ụnụ o!'\"", + "\"Ọ bụghị nwoke niile na-ana aka atọ. Ọ bụ nwaanyị chie elu chie ala, onweghị ike ana aka atọ, abụọ maọbụ otu.\"", + "Nwaanyị anaghị aṅụ ike nkwụ", + "Nwaanyị anaghị aṅụ ike nkwu", + "Agaghị agụchali ihe nwaanyị agaghị emenwu n'ala Igbo mana ọ dị mkpa ma ị mara na ihe ị na-eleda anya na ọbụghị ihe bụ nso: Nwaanyị ekwesịghị ịnụ ike nkwụ n'omenala Igbo.", + "Nnabuihe sị, \"Ọ bụ ihe na-enye nwoke ike ọ ga-eji rụọ ọrụ dịrị ya.\"", + "Na nkọwa ya, o kwuru na ọbụghị mmegbu kpatara ndị gboo ji nwee iwu ndị a niile kama na onye ọbụla ma nwoke, nwaanyị na ụmụaka nwere ọrụ ya n'ala Igbo.", + "Akụkọ dị mkpa taa: China chọrọ inye Naịjirịa $60b", + "Unu egela Ipob ntị - Ndị ọrụ nchekwa", + "'Ihe mere anyị ji kwe ka Davido gaa njem'", + "Shekarau gbababuru PDP agbapụla", + "Maersk MD: Gịnị ka ị kwesiri ima tupu ị nabata onye odibo5 Julaị 2018", + "Dọkịnta Bumbum: A nwụchiela dibia otele ukwu20 Julaị 2018", + "'Agwa ndị mmadụ na-akpasa m maka alụghị di na-ewute m'17 Maachị 2018", + "Ọnụọgụgụ ndị nwụrụla n’alaọmajijiji mere na Morocco akarịala puku abụọ10 Septemba 2023", + "NA EME UGBU A Etu e si gbagbuo otu n'ime ndị ntọrị na-akpa ike n'Obosi, Anambra Steeti", + "Anti-gay Law: Etu ụlọikpe si maa ụmụnwoke anọ ikpe n'Owere maka idina ibe ha9 Septemba 2023", + "Ekwetaghị m na mkpebi ‘tribunal’- Peter Obi9 Mee 2023", + "Tribunal Judgement: Tinubu emeriela Peter Obi n'ụlọikpe 8 Septemba 2023", + "Adedeji Odulesi: Lee nwoke Ijebu ji asụsụ Igbo na ndị ọzọ akwalite ịdịnotu Naijiria5 Septemba 2023", + "Tribunal Judgement: Akụkọ ụgha megidere ndị ọkaikpe ji ikpe ntuliaka a 6 Septemba 2023", + "Etu ụlọ dara na Coal Camp Enugu sị taa isi ụmụaka anọ si n'otu ezinaụlọ4 Septemba 2023", + "Ihe ndị ịmaghị maka otiegwu KCEE2 Septemba 2023", + "Ọrụ nna, nne na ụmụaka na-arụ n'ime ezinaụlọEmelitere ikpeazụ na: 3 Juun 2021", + "Salman Rushdie: Gịnị dị n'ime akwụkwọ o dere na-ese okwu?Emelitere ikpeazụ na: 14 Ọgọọst 2022", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 7 Juun 2020", + "Anti-gay Law: Etu ụlọikpe si maa ụmụnwoke anọ ikpe n'Owere maka idina ibe ha", + "Pastọ anwụọla dịka ọ na-ebu ọnụ abalị 40 ka JisọsEmelitere ikpeazụ na: 17 Febụwarị 2023", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2023 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/cjm8yv2jrwmo.json b/articles/cjm8yv2jrwmo.json new file mode 100644 index 00000000..de41b162 --- /dev/null +++ b/articles/cjm8yv2jrwmo.json @@ -0,0 +1,65 @@ +{ + "published": "6 Septemba 2023", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ebe foto si, Bola Tinubu/ Peter Obi/Facebook", + "Ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka enyela Onyeisiala Bola Tinubu mmeri ma kụpụ n'akụkụ mkpesa nke otu Labour Party(LP) na onye fere ọkọlọtọ pati ahụ na ntuliaka Onyeisiala nke afọ 2023 bụ Peter Obi wetara maka etu ahụ si gaa.", + "Tribunal Judgement: Akụkọ ụgha megidere ndị ọkaikpe ji ikpe ntuliaka a 6 Septemba 2023", + "Tribunal Judgement:Tinubu emeriela Peter Obi n'ụlọikpe 8 Septemba 2023", + "Lee ndị ọkaikpe nọn'isi ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ụlọikpe mkpegharị16 Mee 2023", + "Otu Labour Party na Peter Obi wegara mkpesa n'ụlọikpe iji gbagha mpụtara ntuliaka 2023 nke gụnyere ebubo na e mere nrụrụka aka na ntuliaka ahu, na Tinubu enwetaghị pasent 25 n'Abuja nakwa na o tozughị ịzọ ọkwa onyeisiala dịka a maburu ya ikpe n'ụlọikpe dị na mba Amerịka maka ebubo ibu ọgwụike.", + "Mana Ọkaikpe Jọstịs Haruna Tsammani onye chịkọtara mkpebi ya na ndị ọkaikpe anọ ndị ọzọ nwere kwuru na o nweghị ihe akaebe gosiri na Peter Obi meriri na ntuliaka ahụ.", + "\"Ekpetaghị ikpe etu anyị si tụ anya\" - Ụmụ Naịjirịa", + "Na mkpebi ya n'ikpe ahụ, Ọkaikpe Jọstịs Haruna Tsammani nọ n'isi ikpe ahụ nke ọkaikpe ise chịkọtara kwuru na na ọ bịa na iwu metụtara ntuliaka, na naanị teknuzu ọ dị n'iwu Inec bụ Bimodal Voters Accreditation System (BVAS), na o nweghị ebe ọ dị n'iwu na Inec ga-ejinata igwe BVAs si n' ọdọ atụmvootu zipu mpụtara ntuliaka gaa n'ọbaozi Inec.", + "Ọkaikpe ahụ bụ onye ji ikpe dị n'etiti Oyetola na Inec were maa atụ sịri na Inec kwụrụ onwe ya ma nwee ikike ịhazi ntuliaka n'usoro ọbụla masịrị ya. O kwuru na iwu Ntuliaka afọ 2022 enweghị ebe o kwuru na a ga-eji igwe zipu mpụtara ntuliaka.\"", + "Jọstịs Haruna Tsammani onye gbadoro ụkwụ na Iwu Naijiria Akụkụ nke 134(2a) (section 134(2a)sịrị inweta pasent 25 n'Abuja na ntuliaka onyeisiala abụghị iwu.", + "O kwuru na Abuja na steeti ndị ọzọ dị na Naijiria ha nha.", + "Ụlọikpe kụchapụrụ ebubo na a nwụchiri Tinubu n’ihi ọgwụike na mba Amerịka.", + "Ha kwuru na ụlọikpe mba Amerịka amaghị Tinubu ikpe kama na ọ bụ akụnaụba ya ka a na-apụrụ ya maka na a rụrụ ya aka, nke a kpọrọ “civil forfeiture’", + "Ha kwuru na ndị mere mkpesa egosighi ihe akaebe na a nwụchiri Tinubu n’Amerịka ma ọ bụ maa ya ikpe n’okwu banyere ibu ọgwụike.", + "Ha kwuru na o nweghi mgbe a kpọpụrụ ya n’ụlọikpe.", + "Na o nweghi ikpe ọbụla a mara ya, n’ihi nke a na o gbochughi Tinubu ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.", + "Ọ bụghị naanị mkpesa Peter Obi wetara ka ụlọikpe ahụ kpụrụ.", + "Ndị ọkaikpe ụlọikpe pụrụ iche ahụ kụpụkwara mkpesa nke onye feere otu PDP ọkọlọtọ bụ Atiku Abubakar nakwa nke otu Allied Peoples Movement, (APM).", + "Dịka Obi, Atiku na otu PDP wetara mkpesa na Tinubu etozughị ịzọ ọkwaonyeisiala n'ihi ebubo na ụlọikpe mba Amerịka mara ya ikpe ịbụ onye mpụ ma napụ ya ego a sị zitere na ibu ọgwụ ike.", + "APM na mkpesa nke ha na-ebo ebubo na osote Tinubu bụ ọzọrọ ọkwa abụọ n'otu oge ma arịọ ka a kagbuo vootu APC ma kpọpụta Atiku dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.", + "Ụlọikpe ahụ dara ha nha maka 'iweta mkpesa erijughị afọ.", + "Otu 'Labour Party' na Peter Obi, PDP na Atiku jụrụ mkpebi ụlọikpe ntuliaka ahụ ma kwuo na ha ga-agbaya .", + "Mana Tinubu nabatara ya.", + "Cheta na otu Labour Party, PDP, na APM wegara mkpesa n'ụlọikpe ịgbagha mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala nke Inec kpọụtara Bola Tinubu nke APC dịka onye meriri.", + "Na abalị mbụ nke ọnwa Maachị afọ 2023, Inec kpọpụtara Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka onyeisiala e mere n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị, afọ 2023.", + "Dịka Inec si kwuo, Tinubu nwetara vootu dị 8,794,726, Atiku , onye Inec sị gbara onye nke abụọ nwetara vootu 6,984,520, ebe Obi nwetara vootu dị 6,101,533.", + "Etu ụlọ dara na Coal Camp Enugu sị taa isi ụmụaka anọ si n'otu ezinaụlọ4 Septemba 2023", + "Etu aka si kpara nwoke ji ehi o zutere n'ohi gaa akwamozu ọgọ ya nwoke31 Ọgọọst 2023", + "Nwunye Ifeanyị Okoh ka dị ndụ oge m rutere ụlọọgwụ - nwanne nwoke ezinaụlọ mmadụ isii nwụrụ n'ụlọ ọhụrụ ha kwabara 29 Julaị 2023", + "Ọnụọgụgụ ndị nwụrụla n’alaọmajijiji mere na Morocco akarịala puku abụọ10 Septemba 2023", + "NA EME UGBU A Etu e si gbagbuo otu n'ime ndị ntọrị na-akpa ike n'Obosi, Anambra Steeti3 Septemba 2023", + "Anti-gay Law: Etu ụlọikpe si maa ụmụnwoke anọ ikpe n'Owere maka idina ibe ha9 Septemba 2023", + "Ekwetaghị m na mkpebi ‘tribunal’- Peter Obi9 Mee 2023", + "Tribunal Judgement: Tinubu emeriela Peter Obi n'ụlọikpe 8 Septemba 2023", + "Adedeji Odulesi: Lee nwoke Ijebu ji asụsụ Igbo na ndị ọzọ akwalite ịdịnotu Naijiria5 Septemba 2023", + "Tribunal Judgement: Akụkọ ụgha megidere ndị ọkaikpe ji ikpe ntuliaka a 6 Septemba 2023", + "Etu ụlọ dara na Coal Camp Enugu sị taa isi ụmụaka anọ si n'otu ezinaụlọ4 Septemba 2023", + "Ihe ndị ịmaghị maka otiegwu KCEE2 Septemba 2023", + "Ọrụ nna, nne na ụmụaka na-arụ n'ime ezinaụlọEmelitere ikpeazụ na: 3 Juun 2021", + "Salman Rushdie: Gịnị dị n'ime akwụkwọ o dere na-ese okwu?Emelitere ikpeazụ na: 14 Ọgọọst 2022", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 7 Juun 2020", + "Anti-gay Law: Etu ụlọikpe si maa ụmụnwoke anọ ikpe n'Owere maka idina ibe ha", + "Pastọ anwụọla dịka ọ na-ebu ọnụ abalị 40 ka JisọsEmelitere ikpeazụ na: 17 Febụwarị 2023", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2023 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/cw9gp7vryglo.json b/articles/cw9gp7vryglo.json new file mode 100644 index 00000000..c29e84ae --- /dev/null +++ b/articles/cw9gp7vryglo.json @@ -0,0 +1,55 @@ +{ + "published": "05:39", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Adedeji Odulesi: Lee nwoke Ijebu ji asụsụ Igbo na asụsụ ndị ọzọ akwalite ịdịnotu Naijiria", + "Naijiria bụ mba nwere ọtụtụ agbụrụ nakwa asụsụ. Ndịiche dị n'asụsụ nakwa omenala agbụrụ niile dị na Naijiria kwesịrị ịbụ nnukwu uru ọbụghị ọghọm.", + "Nke a bụ ihe Mazị Adedeji Odulesi kwuru, mere ya ji eji onyinye ịsụ asụsụ atọ a kacha mara na Naijiria, bụ Awụsa, Igbo na Yoroba, na-akwalite ịdịnotu na ezi mmekọrịta n'etiti ụmụ Naijiria.", + "Odulesi, bụ onye Ijebu dị n'agbụrụ Yoroba, mana ọ na-asụ asụsụ Igbo na Hausa nke ọma, tinyekwara asụsụ French, Jaman, na Pijin English.", + "Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọdịnso a, Adedeji kọrọ etu o si mụta Igbo site n'aka onye ntụgharị asụsụ n'ụlọuka Deeper Life, n'Owere, Imo Steeti, n'afọ 1991/92.", + "Taa, ọ bụ asụsụ Igbo na asụsụ ndị ọzọ ọ na-asụ, ka o ji enye ezinụlọ ya nri, dịka onye na-ekwu okwu na mmemme, nke bekee na-akpọ 'Master of Ceremony' (MC), ma jirikwa ya na-akwalite ịdịnotu Naijiria.", + "The Experience 13: Lee ka Don Moen na otiegwu ndị ọzọ na-asụ Igbo7 Disemba 2018", + "Hajia Sefiya Ali nwaanyị awụsa na-ata asụsụ Igbo ka ọjị25 Nọvemba 2020", + "Imi, ewu, na okwu ndị yiri onwe ha n’asụsụ Igbo na Yoruba 11 Nọvemba 2022", + "Adedeji Odulesi", + "Ọ na-eme nke a site n'ịchọta ndị na-asụkwa ọtụtụ asụsụ Naijiria dịka ya onwe ya, na-agba ha ajụjụ ọnụ gbasara agbụrụ Naijiria dị icheiche na ihe ọma gbasara agbụrụ ndị a.", + "\"Ọ bụrụ na ị hapụbeghị mpaghara gị gaa ebe ọzọ, hụ omenala ndị ọzọ, ị ga na-asị na ndị nke a bụ ndị ọjọọ, ndị nke ọzọ kpọrọ anyị asị,\" Odulesi kwuru.", + "\"Mana site na mkparịtaụka mụ na ndị Naijiria si agbụrụ dị icheiche, amatala m n'ezie na ụmụ Naijiria hụrụ onwe anyị n'anya.\"", + "\"Ya mere m ji egosipụta onyinye a m nwere, nke bụ ịsụ asụsụ dị icheiche, iji mee ka nghọtahie, ogbaaghara na akpọmasị nwụọ n'obodo Naijiria.\"", + "Odulesi sị na ya enyela onwe ya aha Igbo, nke bụ Chukwuemeka, nyekwa nwa ya nwaanyị aha Igbo - Chioma, ebe aha Igbo nwa ya nwoke bụ Chinedu.", + "Gere akụkọ a n'uju n'onyonyo dị n'elu.", + "Naijiria", + "Asụsụ", + "Ịkpa obi aṅụrị", + "Omenala", + "Ọnụọgụgụ ndị nwụrụla n’alaọmajijiji mere na Morocco akarịala puku abụọ10 Septemba 2023", + "NA EME UGBU A Etu e si gbagbuo otu n'ime ndị ntọrị na-akpa ike n'Obosi, Anambra Steeti3 Septemba 2023", + "Anti-gay Law: Etu ụlọikpe si maa ụmụnwoke anọ ikpe n'Owere maka idina ibe ha9 Septemba 2023", + "Ekwetaghị m na mkpebi ‘tribunal’- Peter Obi9 Mee 2023", + "Tribunal Judgement: Tinubu emeriela Peter Obi n'ụlọikpe 8 Septemba 2023", + "Adedeji Odulesi: Lee nwoke Ijebu ji asụsụ Igbo na ndị ọzọ akwalite ịdịnotu Naijiria5 Septemba 2023", + "Tribunal Judgement: Akụkọ ụgha megidere ndị ọkaikpe ji ikpe ntuliaka a 6 Septemba 2023", + "Etu ụlọ dara na Coal Camp Enugu sị taa isi ụmụaka anọ si n'otu ezinaụlọ4 Septemba 2023", + "Ihe ndị ịmaghị maka otiegwu KCEE2 Septemba 2023", + "Ọrụ nna, nne na ụmụaka na-arụ n'ime ezinaụlọEmelitere ikpeazụ na: 3 Juun 2021", + "Salman Rushdie: Gịnị dị n'ime akwụkwọ o dere na-ese okwu?Emelitere ikpeazụ na: 14 Ọgọọst 2022", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 7 Juun 2020", + "Anti-gay Law: Etu ụlọikpe si maa ụmụnwoke anọ ikpe n'Owere maka idina ibe ha", + "Pastọ anwụọla dịka ọ na-ebu ọnụ abalị 40 ka JisọsEmelitere ikpeazụ na: 17 Febụwarị 2023", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2023 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/cyrjvxmxgv2o.json b/articles/cyrjvxmxgv2o.json new file mode 100644 index 00000000..0ad51e86 --- /dev/null +++ b/articles/cyrjvxmxgv2o.json @@ -0,0 +1,71 @@ +{ + "published": "6 Septemba 2023", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ebe foto si, Facebook", + "Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu, Fauziyya Tukur, Olaronke Alo", + "Ndị mere akụkọ a, BBC Global Disinformation Team", + "Septemba 2023", + "Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ga-ekebi ikpe banyere mmeri Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu n’ụbọchi 6 Sepụtemba, 2023.", + "Ndị na-ama mmeri ahụ aka bụ Labour Party (LP), Peoples Democratic Party (PDP) na Allied Peoples Movement (APM)", + "Ikpe a na-abịa dịka e nwere ọtụtụ akụkọ ụgha na-efegharị na soshal midia nke na-arụ ndị ọkaikpe ji ikpe ntuliaka ahụ aka.", + "Ngalaba BBC Disinformation lebara anya n’ụfọdụ akụkọ ụgha ndị a.", + "Tribunal Judgement: A maghị Tinubu ikpe maka ibu ọgwụike na mba Amerịka9 Mee 2023", + "Lee ndị ọkaikpe nọn'isi ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ụlọikpe mkpegharị16 Mee 2023", + "Election Tribunal: E higharịala ikpe Peter Obi na Labour Party maka Ntuliaka 202310 Mee 2023", + "N’ọnwa Julaị, ọtu ọgbakọ ozi n’ịntaneti a kpọrọ Igbo Times wepụtara akụkọ kwuru na otu n’ime ndị ọkaikpe ise ji ikpe ahụ bụ ọkaikpe Boloukuoromo M. Ugo gbara arụkwaghịm maka “atụmatụ ịgbagbu ọchịchị onye kwuo uche ya”. Ọbaozi a kwuru na ọ bụ ihe si n’ọnụ ọkaikpe Ugo.", + "Ọbaozi a dere na ọkaikpe Ugo kwuru “Ịkwụrụ n’akụkụ gọọmentị banyere nke a bụ igbo ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa” ma sị na obi agaghi ekwe ya ime nke ahụ. Ha kwuru na gọọmenti Naịjirịa gwara ọkaikpe Ugo ka ọ kpebie ikpe kpegara gọọmentị.", + "Ọkaipe Ugo agbabeghi arụkwaghịm, enweghi ihe akaebe gosiri na akụkọ ndị Igbo Times dere bụ eziokwu.", + "E kesara akụkọ n’akara soshal midia ha ebe ọtụtụ ndị a ma ama na soshal midia gụnyere Charles Oputa e ji Charly Boy maara kesakwara ya.", + "Na-agbanyeghi ụlọntaakụkọ na Naịjirịa kụchapụrụ akụkọ ahụ mana ọ ka-adị n’ọbaozi soshal midia X bụ ebe e kesara ya.", + "N’ọnwa Maachị, ụlọakwụkwọ ntaakụkọ Peoples Gazette wepụtara akụkọ na Ọkaikpe ukwu Naịjirịa mere onwe ya ka onye ngwọrọ ma zute Tinubu a họpụtara ka onyeisiala na Lọndọn iji “kpata nkata maka ikpe na-eso ntuliaka na etu ọ ga-esi emeri n’ụlọikpe”.", + "Akụkọ na-enyochaghị ka ọtụtụ ụlọọrụ mgbasaozi na Naịjirịa buuru ma kesaa na soshal midia. Ha ji foto ebe akwa Ọkaikpe ukwu Naịjirịa n’igwe ndị ngwọrọ ji aga ije n’ọdọụgbọelu.", + "Ụlọikpe Kachasị na Naịjirịa kwuru n’ezie na ọkaikpe ukwu mere njem na Lọndọn maka ahụike ya na ọ bụghị izute Tinubu. O nweghi ihe akaebe gosiri na Ariwoola zutere Tinubu na Lọndọn.", + "N’ọnwa Sepụtemba. ọtụtụ ndị a ma ama na soshal midia na-akwado Labour Party malitere ikesa ozi na ọ bụ n’ụbọchị 16 Sepụtemba ka a ga-ekpebi ikpe banyere ntuliaka.", + "Akụkọ ụgha a wuru na soshal midia ọtụtụ ụbọchi tupu ụlọikpe ewepụta ozi na ọ bụ ụbọchị 6 Sepụtemba 2023.", + "Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka kwuru na akụkọ ahụ bụ asị ọcha ma wepụta ozi na ọ bụ n’ụbọchị 6 Sepụtemba ka a ga-ekpe ikpe ahụ.", + "Ebe foto si, Screen shot", + "N’ọnwa Julaị, ọbaozi Igbo Times wepụtara akụkọ ụgha na Onyeisiala Tinubu “akwụsịla ụlọikpe niile na Naịjirịa ịrụ ọrụ” maka ụjọ na e nwereike “ịchụtu ya n’ọkwa”.", + "Igbo Times egosighi ihe akaebe banyere akụkọ a bụ nke akụchapụrụla. Akụkọ a ka nọ n’ọbaozi ha.", + "Ebe foto si, Screen", + "Mgbe ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka wepụtara ozi banyere ụbọchị a ga-ekpebi ikpe ahụ, ụfọdụ ndị a ma ma malitere ikesa akụkọ nduhie na soshal midia.", + "Otu onye na twitter a kpọrọ @MissPearls kwuru na “Tinubu chọrọ ime njem apụ Naịjirịa” na “atụmatụ bụ ka ọ gaa otu ọgbakọ”.", + "Mana njem Onyeisiala Tibubu kwesịrị ime gaa mba India dị mbụ pụta ihe n’ọnwa Eprelụ mgbe akụkọ kwuru na Praịm minista mba India bụ Shri Narendi Modi kpọrọ ya oku maka ọgbakọ G20, nke a ga-eme na 9 na 10 Sepụtemba.", + "Ihe ozọ ndị mmadụ mere bụ ịkpọku ezinaụlọ ndị ọkaikpe ji ikpe a ma yie ha egwu site n’izigaara ozi n’ụdị ka ha majaa ndị a maka ikpe ha ji n’aka.", + "ọtụtụ ndị nkwado pati kwadoro ka okwu a a kpọro #AllEyesOntheJudiciary malite iwu na soshal midia.", + "Mkpebi ikpe banyere ntuliaka a, na-aga n’ihu ugbua n’ụlọikpe mkpegharị dị n’Abuja.", + "Ndọrọndọrọ ọchịchị", + "Naijiria", + "Ozi asị", + "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", + "Ọnụọgụgụ ndị nwụrụla n’alaọmajijiji mere na Morocco akarịala puku abụọ10 Septemba 2023", + "NA EME UGBU A Etu e si gbagbuo otu n'ime ndị ntọrị na-akpa ike n'Obosi, Anambra Steeti3 Septemba 2023", + "Anti-gay Law: Etu ụlọikpe si maa ụmụnwoke anọ ikpe n'Owere maka idina ibe ha9 Septemba 2023", + "Ekwetaghị m na mkpebi ‘tribunal’- Peter Obi9 Mee 2023", + "Tribunal Judgement: Tinubu emeriela Peter Obi n'ụlọikpe 8 Septemba 2023", + "Adedeji Odulesi: Lee nwoke Ijebu ji asụsụ Igbo na ndị ọzọ akwalite ịdịnotu Naijiria5 Septemba 2023", + "Tribunal Judgement: Akụkọ ụgha megidere ndị ọkaikpe ji ikpe ntuliaka a 6 Septemba 2023", + "Etu ụlọ dara na Coal Camp Enugu sị taa isi ụmụaka anọ si n'otu ezinaụlọ4 Septemba 2023", + "Ihe ndị ịmaghị maka otiegwu KCEE2 Septemba 2023", + "Ọrụ nna, nne na ụmụaka na-arụ n'ime ezinaụlọEmelitere ikpeazụ na: 3 Juun 2021", + "Salman Rushdie: Gịnị dị n'ime akwụkwọ o dere na-ese okwu?Emelitere ikpeazụ na: 14 Ọgọọst 2022", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 7 Juun 2020", + "Anti-gay Law: Etu ụlọikpe si maa ụmụnwoke anọ ikpe n'Owere maka idina ibe ha", + "Pastọ anwụọla dịka ọ na-ebu ọnụ abalị 40 ka JisọsEmelitere ikpeazụ na: 17 Febụwarị 2023", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2023 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file