diff --git a/articles/c4nn3ql4yweo.json b/articles/c4nn3ql4yweo.json new file mode 100644 index 00000000..54a79466 --- /dev/null +++ b/articles/c4nn3ql4yweo.json @@ -0,0 +1,81 @@ +{ + "published": "30 Mee 2024", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ebe foto si, EPA", + "E duola Cyril Ramaphosa n’iyi ọrụ dịka Onyeisiala mba Saụt Afrịka na-agbanyeghi na pati ya bụ African National Congress (ANC) enweteghi ọtụtụ ọkwa ọchịchị n’ụlọomeiwu.", + "Ndị ụlọomeiwu họpụtara Ramaphosa n’ịbụ onyeisiala n’izuụka gara aga site na njikọ aka ha na Pati na-ama ha aka bụ Democratic Alliance (DA).", + "Pati ANC malitere ịchị kamgbe afọ 1994 mara afọ n’ala n’inwete vootu etu ha si enwetebu na ntuliaka nke e mere n’ụbọchị 29 Mee.", + "Ọtụtụ ndị a ma ama gụnyere ndịisi mba Afrịka gere emume idu Ramaphosa n’iyi ọrụ a.", + "“Aṅụọla m iyi ikwenye n’ọchịchị mba Saụt Afrịka...Aga m erubeisi, mee nakwa chekwaa ihe ọbụla e dere n’iwu na-achịkwa obodo,” Ramaphosa kwuru.", + "Onye nyere ya iyi ọrụ ọ ṅụrụ bụ Ọkaikpe ukwu mba ahụ bụ Raymond Zondo.", + "Dịka Ramaphosa ṅụchara iyi ọrụ ahụ, a gụrụ abụ njirimara obodo aha dịka ndịagha gbapụrụ ọnụegbe iri abụọ na otu iji kwanyere ya ugwu, tupu o kwuo okwu nnabata ya.", + "Ramaphosa nwetere ọchịchị a na-agbanyeghi vootu o nwetere ezuchaghị iji nye ọkwa ọchịchị ebe pati ya tufuru vootu isi asaa n’ụlọomeiwu.", + "O nwetere ọchịchị a site na nkwekọrịta pati ya bụ ANC na pati na-ama ha aka bụ DA nakwa pati ndị ọzọ.", + "ANC nwetere vootu pasentị 40 ebe DA nwetere vootu dị pasentị 22.", + "South Africa: Ihe ha tụrụ anya afọ 30 na nnwereonwe ga-ewetara ha o mezuola?4 Mee 2024", + "ICJ enyela Israel iwu igbochi mkpochapụ agbụrụ na Gaza26 Jenụwarị 2024", + "Mba Saụt Afrịka arịọla Naịjirịa mgbaghara16 Septemba 2019", + "Ebe foto si, Reuters", + "Ụlọomeiwu Saụt Afrịka ahọpụtagharịala Cyril Ramaphosa dịka onyeisiala mba ahụ n’oge e nwechara nkwekọrịta n’etiti otu ndọrọndọrọ ọchịchị African National Congress (ANC) na pati ndị ọzọ.", + "Ihe mejupụtara gọọmenti ịdịnootu ọhụrụ ahụ bụ pati ANC nke Ramaphosa, pati Democratic Alliance (DA) na ụmụ obere pati ndị ọzọ.", + "N’okwu mmeri ya, Ramaphosa toro otu ahụ ehiwere ọhụrụ ma kwuo na ndị Saụt Afrịka tụwara anya ka ndị ndu rụkọọ ọrụ maka ọdịmma onye ọbụla nọ n’obodo ahụ.", + "N’ụbọchị e nwere nkwekọrịta ahụ, ndị omeiwu nwere nzukọ ruo n’abalị iji họpụta onye a ga-enye ikikere ọchịchị na gọọmenti ọhụrụ a.", + "Ka e mesịrị, African National Congress nwetara pasenti vootu iri anọ (40%) ebe Democratic Alliance nwetara pasenti iri abụọ na abụọ (22%).", + "Ebe foto si, Reuters", + "A ga-agụpụta mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu nke Saụt Afrịka n’ụbọchị Sọnde dịka otu onye ọrụ ntuliaka si kwuo.", + "Ngụkọta vootu na-abanyezi n’agba nke ikpeazụ dịka mpụtara si na na mpaghara pasenti 98 erutala ndị ngụkọ aka.", + "Mawethu Mosery bụ osote onyeisi ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka ngwara ụlọọrụ mgbasaozi eNCA TV kwuru na ndị ọrụ ga-anọkọ ọnụ n’abalị Satọde ma leba anya na mkpesa niile ndị mmadụ nwere banyere ntuliaka ahụ.", + "Pati nọ n’ọchịchị bụ African National Congress (ANC) na-akwado ịhapụ ụfọdụ ọkwa ọchịchị ha ji siri ike kamgbe afọ iri atọ dịka ọnụọgụgụ vootu agbadala ala.", + "N’ime ụbọchị abụọ a malitere ịgụkọ vootu, ụlọọrụ Independent Electoral Commission (IEC) nke Saụt Afrịka agukọọla vootu 98 pasentị nke ANC ji 40 pasentị na-edu ndị ọzọ.", + "N’otu aka ahụ ANC atụfuola ọtụtụ ọkwa ọchịchị ndị ha jibu n’ụlọomeiwu nke bụ ihe iju anya nye Onyeisiala Cyril Ramaphosa na pati ya.", + "Nke a ga-eme ka ha banye n’atụmatụ ha na pati ọzọ ijikọ aka ọnụ n’ike nke bụ ihe ọhụrụ na ndọrọ ndọro ọchịchị mba Saụt Afrịka.", + "Pati Democratic Alliance ji vootu dị 22 pasentị na-agba ndị nke abụọ ebe pati ọhụrụ a kpọro MK nke Jacob Zuma bụbu onyeisiala ha hiwere ji 15 pasentị na-agba ndị nke atọ.", + "Otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ na Saụt Afrịka bụ African National Congress (ANC ) na Democratic Alliance (AD) bụ otu abụọ aha ha na-ada ụda na ntuliaka onyeisiala mba ahụ.", + "Na mpụtara ntuliaka ndị nke a gụrụla ụgbụa nke ruru 19%; ndị ANC nwetere 43% n’ime ya, ebe ndị DA na enweta 19%.", + "Mana ndị EFF nwetere 9%, ebe ndị MK bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị Jacob Zuma sọ na-enweta 8%.", + "A na-atụ anya na mpụtara ntuliaka ahụ ga-apụta n'uju na ngwụcha ịzụụka a.", + "A na-ekwu na ndị AD na-eme ọfụma na ntuliaka ahụ na-anara ndị ANC ọtụtụ ọkwa ọchịchị n'ụlọomeiwụ.", + "Ebe foto si, Reuters", + "E nwere otu ndọrọndọrọ ọchịchị 70 sọ na-azọ ọkwa onyeisiala na Saụt Afrịka, ma nwekwa mmadụ 11 na-esoghi n'otu ọbụla sọ na-azọ ọkwa ahụ.", + "Ndị ọnụ na-eru n’okwu na-asị na nke a na-egosi na ọtụtụ ndị mmadụ na-ewere ọchịchị ndị ANC iwe.", + "Richard Calland gwara BBC sị “anyị na-abanye n'agba ọzọ n'ọchịchị onye kwụọ uche ya na Saụt Afrịka, nke a ga-abụ mgbanwe pụrụiche”", + "“Ọ bụrụ na anyị etoghị n'ọchịchị onye kwuo uche ya, ndọrọndọrọ ọchịchị anyị ga-agbasasị”.", + "‘Mgbanwe ọchịchị’ bụ otu ihe a na-anụ n’ọnụ ndị na-eto eto chọrọ ịtụ vootu na Saụt Afrịka.", + "Ayanda Hlekwane bụ onye a mụrụ ka afọ 1994 gachara kwuru na agbanyeghi na o nwere asambodo atọ kama na o nwetabeghị ọrụ.", + "“Alahachịrị m ịgụ akwukwọ PhD m mana enweghị m ọrụ”.", + "Mana Ayanda kwuru na ya nwere olileanya na a ga-enwe mgbanwe.", + "Mmadụ karịrị 27,000,000 ka aha ha dị n’akwụkwọ ịtụ vootu, mana ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-eto eto.", + "Ndọrọndọrọ ọchịchị", + "Afịrịka", + "South Africa", + "NA EME UGBU A, Ọrịa otolo agbagbuola ihe karịrị mmadụ 37 na Naịjirịa – NCDC", + "Ụlọikpe akagbuola nkpọghachị a kpọghachịrị Muhammadu Sanusi n'ọkwa Emir Kano21 Juun 2024", + "Lee etu ọzọdimgba si eji mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ agwọ onwe ha ọrịa - Sayensị21 Juun 2024", + "\"Amaghị m na m dị ime ọnwa asatọ ruo mgbe ọ fọro otu ọnwa ka m mụọ nwa\"20 Juun 2024", + "Ihe atọ Vladimiri Putin ji maka ya ga hụ Kim Jong Un20 Juun 2024", + "'Ndị mmadụ na-akpachapụ anyị n'ihi na anyị nwere ọrịa 'Sickle Cell anaemia'19 Juun 2024", + "E duola Cyril Ramaphosa n’iyi ọrụ ugboro abụọ dịka Onyeisiala mba Saụt Afrịka19 Juun 2024", + "Ụgwọ opekatampe: Ihe mere gọọmentị agaghị akwụnwu ndị ọrụ ego ole ha chọrọ - Onyejeocha14 Juun 2024", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 7 Juun 2020", + "Kedụ ihe ndị agbụrụ ọzọ na-ekwukarị ha jiri mara ndị Igbo?Emelitere ikpeazụ na: 19 Jenụwarị 2023", + "Ọrụ nna, nne na ụmụaka na-arụ n'ime ezinaụlọEmelitere ikpeazụ na: 3 Juun 2021", + "New Yam Festival: Ihe mere ndị Igbo ji eme emume iri ji ọhụrụEmelitere ikpeazụ na: 22 Ọgọọst 2021", + "Igbo idioms: Lee ụfọdụ akpalaokwu Igbo ji eri okwu na ihe ha pụtaraEmelitere ikpeazụ na: 10 Julaị 2022", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/c722ggy8n5no.json b/articles/c722ggy8n5no.json new file mode 100644 index 00000000..a0cf712a --- /dev/null +++ b/articles/c722ggy8n5no.json @@ -0,0 +1,54 @@ +{ + "published": "04:56", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Dịka ụwa niile na-eme ncheta ọrịa ọbara a kpọrọ 'Sickle Cell Anaemia' n’olu Bekee taa bụ abalị 19 nke ọnwa Juun afọ 2024, ndị nwere ya bụ ọrịa akwaala arịrị na ndị mmadụ na-akpachapụ ma na-anapụkwa ha ihe dị ịche ịche n’ihi ya bụ ọrịa.", + "Iji mee ka ndị mmadụ ghọta nke ọma ihe ọria 'Sickle cell' pụtara, anyị gara na ụlọọgwụ 'University of Nigeria Teaching Hospital' (UNTH) dị n'Ituke ozalla, Enugwu, wee nụta ọtụtụ ihe mgbawa obi mere ụmụnwaanyị abụọ bu ọrịa ahụ.", + "E wepụ nne m akaghị ịgbalahụ ọnwụ site n'ọrịa 'sickle cell'-Nwaanyị dị afọ 65 7 Julaị 2023", + "Africa Eye: Etu m si ebuagha megide oke a na-akpasị ndị nwere ọrịa 'sickle cell'14 Juun 2023", + "Nri ndị a ga-enyere ndị na-arịa 'Sickle Cell' aka19 Juun 2019", + "Nwada Rose Ifenu kwuru na ọdịla ụmụnwoke abụọ chọburu ịlụ ya, ma gbaa ya alụkwaghịm ka ha chọpụtara na o nwere ọrịa ahụ.", + "Ọzọkwa bụ na a chụrụ ya n’ọrụ ya n’ihi na ọ rịọrọ ka e nye ya mkpụrụ ụbọchị ole ma ole ka ọ gaa ụlọọgwu.", + "Nke a mere onye nwe ụlọakwụkwọ ahụ jiri chụọ ya n’ọrụ.", + "Oriakụ Somadina Ezeanochie bụkwa onye otu “SICKLE CELL WARRIORS” kwuru na ọ hịara ya ahụ tupu ya ahụ nwoke lụrụ ya na-agbanyeghị na o bu ya bụ ọrịa.", + "Somadina kọwara na ya amụọla otu nwa na-agbanyeghị ahụ ụfụ kwa mgbe kwa mgbe ọrịa ahụ na-ebute.", + "Nnukwu Dọkinta na-ahụ maka ọbara na UNTH Enugwu bụ Dkta. Helen Okoye kwuru na ọrịa SS ahụ abụghị nke ọnwụ.", + "Ọ kọwara na ọtụtụ ndị SS na-adịzi ndụ rue n' ezigbo agadị, n’ihi na e wepụtala ọgwụ nakwa ụzọ ọzọ dị iche ịche e si akwọ onye ikwu wara.", + "Dọkinta ji ohere ahụ gwa ndị mmadụ kwụsị ịgbawa ndị nwere ọrịa ahụ obi, kama ka ha nyere ha aka na-agbanahụ nsogbu dị na ya", + "Kirie ihe ha gwuru n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu:", + "Ụmụnyanyị", + "Ahụike ụmụnwanyị", + "Omume", + "Anyị chọrọ ka e soro ụzọ ọzọ na-abụghị ụlọikpe kpezie okwu Nnamdi Kanu - Ọkaịwụ Aloy Ejimakor20 Juun 2024", + "Water-Borne Diseases: Kedụ ndịiche dị na 'diarrhea', 'cholera' na 'dysentery'?24 Juun 2021", + "Ihe ndị ịmaghị maka nsị si n'agwọ, akpị nakwa agụụlọ19 Mee 2024", + "NA EME UGBU A, Ọrịa otolo agbagbuola ihe karịrị mmadụ 37 na Naịjirịa – NCDC", + "Ụlọikpe akagbuola nkpọghachị a kpọghachịrị Muhammadu Sanusi n'ọkwa Emir Kano21 Juun 2024", + "Lee etu ọzọdimgba si eji mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ agwọ onwe ha ọrịa - Sayensị21 Juun 2024", + "\"Amaghị m na m dị ime ọnwa asatọ ruo mgbe ọ fọro otu ọnwa ka m mụọ nwa\"20 Juun 2024", + "Ihe atọ Vladimiri Putin ji maka ya ga hụ Kim Jong Un20 Juun 2024", + "'Ndị mmadụ na-akpachapụ anyị n'ihi na anyị nwere ọrịa 'Sickle Cell anaemia'19 Juun 2024", + "E duola Cyril Ramaphosa n’iyi ọrụ ugboro abụọ dịka Onyeisiala mba Saụt Afrịka19 Juun 2024", + "Ụgwọ opekatampe: Ihe mere gọọmentị agaghị akwụnwu ndị ọrụ ego ole ha chọrọ - Onyejeocha14 Juun 2024", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 7 Juun 2020", + "Kedụ ihe ndị agbụrụ ọzọ na-ekwukarị ha jiri mara ndị Igbo?Emelitere ikpeazụ na: 19 Jenụwarị 2023", + "Ọrụ nna, nne na ụmụaka na-arụ n'ime ezinaụlọEmelitere ikpeazụ na: 3 Juun 2021", + "New Yam Festival: Ihe mere ndị Igbo ji eme emume iri ji ọhụrụEmelitere ikpeazụ na: 22 Ọgọọst 2021", + "Igbo idioms: Lee ụfọdụ akpalaokwu Igbo ji eri okwu na ihe ha pụtaraEmelitere ikpeazụ na: 10 Julaị 2022", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/crggd4jp7rro.json b/articles/crggd4jp7rro.json new file mode 100644 index 00000000..3539b902 --- /dev/null +++ b/articles/crggd4jp7rro.json @@ -0,0 +1,65 @@ +{ + "published": "20 Juun 2024", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin agaala Nọt Koria.", + "Nke a bụ oge mbụ Putin na-aga na Pyongyang n'ime afọ 24.", + "Oge ikpeazụ ọ gara Nọt Korịa n’afọ 2000, ọ bụ Kim Jong Il bụ nna onyeisiala ugbua nọ n'ọchịchị.", + "Putin nabatara ọkpụkpọ oku Kim Jong Un kpọrọ ya n'ọnwa Septemba gara aga ka ha mechara nzuko na Vostochny Cosmodrome dị na Rọshịa.", + "Nzukọ ya na-egosipụta ọganihu dị na mmekọrịta dị n’etiti mba abụọ ahụ.", + "Ọbịbịa Putin na-adọta uche mbaụwa maka nkwekọrịta ndịagha ha nwereike inwe na nzukọ ahụ.", + "A na-atụkwa anya na ọbịbịa Putin ga-eme ka mmekọrịta dị n'etiti omenala, ọrụ ugbo, akụnaụba na ihe ndị ọzọ.", + "Ihe ọzọ dị mkpa a ga-atụle bụ ka Putin ga-esi leba anya na-mgbanwe ngwaagha na nuklia nke Nọt Korịa.", + "Kim Dong-yup, onye ọkammụta mahadum Nọt Korịa dị na Saụt Korịa, na-ekwu na nzuko ahụ nwere ike ịbụ ihe ga-ebute ezi mkparịtaụka ga-amịta mkpụrụ.", + "Ka Russia na-aga n’ihu na-awakpo Ukraine ihe karịrị afọ abụọ, mmekọ dị n’etiti North Korea na Russia na-esiwanye ike ebe ha na-enyere onwe ha maka ngwaagha.", + "Nam Sung-wook, onye prọfesọ na ngalaba Unification na Diplomacy na Mahadum Korea, na-ekwu na isi okwu nzukọ a ga-abụ \"ka a ga-esi bute ngwaagha North Korea a ga-enye Russia.\"", + "A na-atụ anya na North Korea ga-achọ ihe karịrị naanị nri na mmanụ ụgbọala maka inye Russia ngwaagha.", + "Dịka mba nwere nkà na ụzụ mbara igwe, enyemaka Russia ga-adị mkpa maka North Korea iji nwetakwuo satịlaịtị.", + "A na-atụkwa anya na North Korea ga-achọ nkwado Russia iji meziwanye satịlaịtị nyocha ya na-ịmepụta ụgbọmmiri nuklia.", + "Nam kwenyere na mkparịtaụka ọ bụla gbasara ngwaagha nuklia agaghị apụta ihe.", + "Kang Dong-wan, onye prọfesọ nke sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Mahadum Dong-A, na-ekwu na ihe North Korea chọrọ n’aka Russia ugbu a bụ \"ego igwe n'aka ndị ọrụ\". Nke a na-ewelite ohere ka North Korea zigakwuo ndị ọrụ na Russia.", + "N'aka nke ya, Russia chọrọ ndị ọrụ iji wughachi ụlọ na akụrụngwa nke agha mebiri emebi, ma mee ka akụnaụba ya dịghachi ndụ.", + "Mana mmachi nke UN Security Council megidere North Korea machibidoro ndị ọrụ ya ịrụ ọrụ na mba ofesi ma nye iwu ka akpụghachi ndị ọrụ North Korea niile site na 22 Disemba 2019.", + "Afọ 2000 bụ oge mbụ onyeisiala Putin gara Pyongyang wee zute onye ndu North Korea Kim Jong Il - nzukọ mbụ dị n'etiti Russia na North Korea kemgbe njedebe nke Agha ‘cola war’.", + "N'oge ahụ, Rọshịa na-achọ ịmaliteghachi na ọkwa mbaụwa, ebe North Korea chọrọ ịbawanye ndị ha maa n’ụwa ndị ọzọ.", + "Ndị isi abụọ ahụ nwere nkwupụta nke gosipụtara nkwado ha iji nyere onwe aka maka ngwaagha, nkwekọrịta enyi na imekọ ihe ọnụ.", + "N'ihe gbasara nkwado ndịagha, nkwekọrịta ahụ kwuru na mba abụọ ahụ ga-akpọtụrụ ibe ha ozugbo agha dara.", + "Dịka etu mmekọrịta North Korea na Russia dị na nso nso a, ndị ọkachamara na-eche na enwere ike ịmegharị nkwekọrịta ahụ nke.", + "North Korea", + "Ndịagha", + "Rọshia", + "Ngwagha nuklia", + "Vladimir Putin", + "\"Ihe mere anyị ji achọ ka e kpezie okwu Nnamdi Kanu na Gọọmentị Naịjirịa n'ụzọ udo” – Ndị ọkaiwu Kanu20 Juun 2024", + "\"Amaghị m na m dị ime ọnwa asatọ ruo mgbe ọ fọro otu ọnwa ka m mụọ nwa\"20 Juun 2024", + "Ụzọ asaa ndị ekperịma nwere ike isi zupu ego gị dị n'ụlọakụ26 Mee 2024", + "NA EME UGBU A, Ọrịa otolo agbagbuola ihe karịrị mmadụ 37 na Naịjirịa – NCDC", + "Ụlọikpe akagbuola nkpọghachị a kpọghachịrị Muhammadu Sanusi n'ọkwa Emir Kano21 Juun 2024", + "Lee etu ọzọdimgba si eji mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ agwọ onwe ha ọrịa - Sayensị21 Juun 2024", + "\"Amaghị m na m dị ime ọnwa asatọ ruo mgbe ọ fọro otu ọnwa ka m mụọ nwa\"20 Juun 2024", + "Ihe atọ Vladimiri Putin ji maka ya ga hụ Kim Jong Un20 Juun 2024", + "'Ndị mmadụ na-akpachapụ anyị n'ihi na anyị nwere ọrịa 'Sickle Cell anaemia'19 Juun 2024", + "E duola Cyril Ramaphosa n’iyi ọrụ ugboro abụọ dịka Onyeisiala mba Saụt Afrịka19 Juun 2024", + "Ụgwọ opekatampe: Ihe mere gọọmentị agaghị akwụnwu ndị ọrụ ego ole ha chọrọ - Onyejeocha14 Juun 2024", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 7 Juun 2020", + "Kedụ ihe ndị agbụrụ ọzọ na-ekwukarị ha jiri mara ndị Igbo?Emelitere ikpeazụ na: 19 Jenụwarị 2023", + "Ọrụ nna, nne na ụmụaka na-arụ n'ime ezinaụlọEmelitere ikpeazụ na: 3 Juun 2021", + "New Yam Festival: Ihe mere ndị Igbo ji eme emume iri ji ọhụrụEmelitere ikpeazụ na: 22 Ọgọọst 2021", + "Igbo idioms: Lee ụfọdụ akpalaokwu Igbo ji eri okwu na ihe ha pụtaraEmelitere ikpeazụ na: 10 Julaị 2022", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/cy9955d3gk4o.json b/articles/cy9955d3gk4o.json new file mode 100644 index 00000000..a3f2f3ad --- /dev/null +++ b/articles/cy9955d3gk4o.json @@ -0,0 +1,84 @@ +{ + "published": "20 Juun 2024", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ebe foto si, Tawana Musvaburi", + "Ịmụ nwa mgbe ọ gbara afọ 21 abụghị ebumnobi nwada Tawana>", + "O kwuru n'okwu ya \"anọ m na-ebi ndụ aghara\", na-agba oringo na-ekpori ndụ ya na ndị enyi ya.", + "Ruo mgbe ọ hụtara onwe ya n'ụlọọgwụ dịka ọ dachara n'ala na-amaghị onwe ya.", + "Ọ maghị ihe mere. Mana a gwara ya na ọ ga-amụ nwa n'izuụka anọ na-abịa abịa.", + "\"Egwu malitere ịtụ m,\" ka Tawana gwara ngalaba 'BBC Reliable Sauce podcast'.", + "Akụkọ ahụ mere ka ọ ghara ịma ihe na-eme.", + "\"Maka na mmadụ na-agwa gị, na i nwere izuụka anọ ịkpakọta ndụ gị ọnụ.\"", + "Ihe asatọ nwereike ịme ka nwaanyị ghara iru n'isi mmiri n'oge mmekọ 6 Maachị 2024", + "Ọrịa mmekọ nwoke na nwaanyị ị ga-ebuteli site n’ọnụ 1 Septemba 2022", + "Sexual Abstinence: Lee ihe ga-eme ahụ gị ma ị hapụ ime aramara oge tere aka14 Jenụwarị 2022", + "Ndị dọkịta gwara Tawana ka o mee nyocha ịdị ime tupu o mee nyocha ime ahụ a kpọọ 'MRI scan' oge a nabatara ya n'ụlọọgwụ.", + "O kweghi anabata ozi na ọ dị ime ma kpọọ ya ihe egwuregwu - O tinyere ọgwụ na-egbochi ịtụrụ ime n'aka ya ma o nweghi ihe akaebe na-egosi na ọ dị ime.", + "Mgbe nyocha ahụ pụtara ihe ma na-egosi na o dịghị ime, o mere ka o doo Tawana anya na nkwenye ya bụ eziokwu.", + "Mana otu onye nọọsụ gwara dọkịta ka o kwee ka Tawana mee nyocha a kpọrọ 'ultrasound', na o kwenyesiri ike na o nwereike ịdị ime.", + "Nna nwa Rivers bụ Emmanuel kwuru na o kweteghi na ọ bụ eziokwu mgbe Tawana gwara na ọ ga-amụ nwa n'izuụka anọ.", + "\"O doghi anya n'ụzọ ọbụla,\" ka o kwuru. \"Ọ dị ka ọ bụ ihe ịrịbaama.\"", + "Ịdị ime na-enweghi ihe ngosi dịka ịgbọ agbọ maọbụ afọ itopụta ka a na-akpọ 'cryptic pregnancy'.", + "Ọ na-aghị adịcha ire, mana Tawana sị na dọkịta gwara na \"ọ na-emekaarị n'etiti ndị isi ojii\"", + "\"[Agwara m] na ọ bụ site n'etu ọkpụkpụ ukwu anyị siri dị, nwa ahụ anaghị etopụta n'afọ, ọ na-etoba n'ime afọ, nke na-emekaarị ka ike nwata ahụ nọrọ n'aka afọ nwaanyị anyị,\" ka o kwuru.", + "\"Mgbe o ruru oge m ga-eji amụ nwa, ihe kachasị enye m echiche bụ ma nwa ahụ ọ ga-atụgharị isi.\"", + "Dịka ozi banyere 'cryptic pregnancy' adịchabeghi, Alison Leary bụ ọkammụta ahụike na mahadum South Bank nke Lọndọn kwuru na ozi dị banyere ụdịrị ime a na-ekwu na e nwere ndịiche dị n'ụmụnwaanyị site n'agbụrụ onye ahụ si.", + "\"Enweela ihe ọmụmụ ndị gosiri na ụmụnwaanyị ọkachasị ndị isi ojii na-ahụtakaarị nsogbu ndị dị aṅal n'okwu ịdị ime nakwa ịmụ nwa,\" ka ọ gwara BBC Newsbeat.", + "Ọ na-eche na e kwesịrị imekwu nyocha banyere ime a na-ezo ezo kpọrọ 'cryptic pregnancy'.", + "\"Ọ bụ ya mere o jiri dị mkpa na-agbanyeghi na ọnụọgụgụ ndị ọ na-emetụta dị obere maka na ọ bụrụ na ịgaghị n'ezi ụlọọgwụ maọbụ nata ezi ọgwụgwọ, i nwere ike izute ihe ọjọọ.\"", + "Dịka izuụka anọ na ụbọchị anọ a gwachara Tawana na ọ ga-amụ nwa, ọ mụrụ nwa ya bụ River ka o mechara emume 'baby shower'.", + "O kwuru na o nwere obi ịda mba ka ọ mụchara nwa ahụ, ma gaa n'ọba ozi soshal midia TikTok inwe ndụmọdụ etu e si abụ nne nwa n'otu ntabi anya.", + "Mana o kwuru na ọ hụghị onye ọbụla, e wepụ otu nwaanyị na mba Amerịka gabigara ụdịrị ihe a.", + "\"Agabigara m ọnọdụ ịda mba maka na ọ dị ka o nweghi onye na-enye m ndụmọdụ.", + "\"O nweghi onye na-ekwu okwu maka nke a. Ihe ọ bụ nakwa etu o si adị? Ahụrụ m otu ihe onyonyo ebe otu nwaanyị si mba Amerịka na-ekwu maka ya.", + "\"Naanị ya bụ otu onye nyere m ndụmọdụ.\"", + "Tawana kpebiri ịkọ ya na soshal midia, n'ihe onyonyo o kesara nke a hụrụla n'anya ihe ruru ugboro 400,000.", + "Ọ malitela ịgbasa ozi na podcast, ebe ọ na-agwa ndị nne ọzọ okwu.", + "Tawana kwuru na ọ na-akọ akụkọ n'olileanya na ọ ga-enyere ndị nne ọhụrụ ndị hụtara onwe ya n'ọnọdụ a aka.", + "O kwuru na o nwere ihụ ọma site n'inwete enyemaka ego site n'aka nne ya, mana ọ maara na ndị ọzo nwere ike ha agaghị enweta ụdịrị ohere a.", + "N'uche ya, ọ chọrọ ka e hiwe ngalaba ebe a na-enwere ndị mmadụ aka.", + "\"Enyemaka adịghị, ya mere ọ bụrụ gị ka o mere, kedụ ka ihe ị ga-eme?\"", + "Okwu a na-ekwu mgbe nwaanyị na-amaghị na ọ dị ime - ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ekwu na ha amaghị ruo mgbe ime ọmụmụ mewere ha.", + "Otu n'ime ụmụ 2,5000 a mụrụ na-abụ site n'ime nzuzo a bụ \"cryptic birth\"", + "Nke a bụ ụmụaka 3000 a mụrụ na mba Briten n'otu afọ", + "Ọtụtụ ha na-abụkaarị n'oge ndọgasị ahụ mgbe nwaanyị na-anaghị ahụta ihe njirimara na-egosi na ọ dị ime.", + "Ụmụnwaanyị ndị nsọ ha na-anaghị agba mgbe o kwesịrị maọbụ na-anaghị agba chaachaa na-ahụ njirimara ndị ọzọ na-egosi ịdị ime.", + "Ebe o si: Helen Cheyne, ọkammụta na ngalaba ndị na-amụ nwa (midwifery) na mahadum Stirling", + "Ụmụnyanyị", + "Nri", + "Ahụike ụmụnwanyị", + "Ahụike", + "Ụmụaka", + "Okike", + "Ezinụlọ", + "NA EME UGBU A, Ọrịa otolo agbagbuola ihe karịrị mmadụ 37 na Naịjirịa – NCDC", + "Ụlọikpe akagbuola nkpọghachị a kpọghachịrị Muhammadu Sanusi n'ọkwa Emir Kano21 Juun 2024", + "Lee etu ọzọdimgba si eji mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ agwọ onwe ha ọrịa - Sayensị21 Juun 2024", + "\"Amaghị m na m dị ime ọnwa asatọ ruo mgbe ọ fọro otu ọnwa ka m mụọ nwa\"20 Juun 2024", + "Ihe atọ Vladimiri Putin ji maka ya ga hụ Kim Jong Un20 Juun 2024", + "'Ndị mmadụ na-akpachapụ anyị n'ihi na anyị nwere ọrịa 'Sickle Cell anaemia'19 Juun 2024", + "E duola Cyril Ramaphosa n’iyi ọrụ ugboro abụọ dịka Onyeisiala mba Saụt Afrịka19 Juun 2024", + "Ụgwọ opekatampe: Ihe mere gọọmentị agaghị akwụnwu ndị ọrụ ego ole ha chọrọ - Onyejeocha14 Juun 2024", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 7 Juun 2020", + "Kedụ ihe ndị agbụrụ ọzọ na-ekwukarị ha jiri mara ndị Igbo?Emelitere ikpeazụ na: 19 Jenụwarị 2023", + "Ọrụ nna, nne na ụmụaka na-arụ n'ime ezinaụlọEmelitere ikpeazụ na: 3 Juun 2021", + "New Yam Festival: Ihe mere ndị Igbo ji eme emume iri ji ọhụrụEmelitere ikpeazụ na: 22 Ọgọọst 2021", + "Igbo idioms: Lee ụfọdụ akpalaokwu Igbo ji eri okwu na ihe ha pụtaraEmelitere ikpeazụ na: 10 Julaị 2022", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file