Skip to content

Commit

Permalink
Fri Oct 04 2024 01:03:46 GMT+0000
Browse files Browse the repository at this point in the history
  • Loading branch information
github-actions[bot] committed Oct 4, 2024
1 parent b0c63f8 commit 990263a
Show file tree
Hide file tree
Showing 2 changed files with 41 additions and 0 deletions.
8 changes: 8 additions & 0 deletions articles/igbo_radio/naijiria-ebegbuo-onwe-ya-nakwa.json
Original file line number Diff line number Diff line change
@@ -0,0 +1,8 @@
{
"title": "Naịjiria Ebegbuo Onwe Ya n'Akwa",
"published": "Oct 1, 2024 - 15:44",
"edited": "0",
"sentences": [
"Izunna  Okafor dere abụ a\nAla Naịjiria ebegbuo onwe ya n'akwaAnyammiri, anyammiri ebe niile!Ákwá ụtụtụ, ákwá ndeeri na ákwá arị̀rị̀Ọnye ga-azọ ala anyị?\nChi ọbụbọ wèré aka èkpè dupụta ya ụraChi ọjọọ ewere akwa arị̀rị̀ dúbàá yaIhe na-ebenụ a ka na-ebekwaOnye ga-azọ ala anyị?\nNaịjiria bụ nne chị ụmụOnyeisiala bụ di ọ lụrụNne na ụmụ ebegbuo onwe ha n'ákwá!Agụụ, anyammiri, akwa arịrị ebe niileOnye ga-azọ ala anyị?\nLekene nwaanyị na mma yaNa ụbara ụmụ chi jiri gọzie yaMana di ya na ndị òtù ya ekweghị ka o rite ihe nwa yaHa wee na-amị ya ọbara ka anwụnta NnewiOnye ga-azọ ala anyị?\nEzinụlọ ya nọ n'ọgbaagharaMana di ya anaghị emedị ka nwokeÉgbé ebukọchaala ụmụ yaNdị e gburu egbu akarịa ndị dị ndụMana di ya emeghị ihe ọbụla maọlịDịka a gà-asị na ọ macha ihe na-emeGbachị nkịtịOnye ga-azọ ala anyị?\nDi ya ezugbuola ya n'ohi, ma bube ya ọnụ nriỤmụaka ya nọzịkwa n'agụụ, ọbụnadị n'ime ikpo nri ha nwèrèYa bụ ògòlì nwaanyị agbaa isi awọ n'erughị eruAnyammiri ejugokwa ọgọdọ yaOnye ga-azọ ala anyị?\nNwoke ahụ agbaala ya ọtọ n'ọmà ahịaChaị!Agụ nwaanyị ebegbuo onwe ya n'akwa!Dịka ụwa na-agbázịkwa ọtọ ya eleleÙgwù e jiri mara ya erughịzịkwa ya akaOnye ga-azọ ala anyị ?\nOge adịghị anya, ala Naịjiria na-achọ di ọzọNdị ọ lụrụ alụ agharịpụchaala yaN'ihi ezùghị òkè n'ihe e ji nwoke emeNke bụ di ya ugbua anaghị echètékwuzị onwe yaN'ihi ụbụrụ ịta ncharaNa ihe a gwọrọ agwọ so yaOnye ga-achị ala anyị?\nIwe eweela ụmụ ya ndị okenyeHa ji kwekọrịta ịchọrọ nne ha di ọzọNaanị nwoke nwere ùgwù na nsọpụrụKa a na-elegara anya ibunye mmanya ụbọchị ahụMa e wepuchaa úgwùmágànà na ndị òtù yaỤmụnne m, ajụọ m, onye ga-alụ mama anyị?\nGị onwe gị sòrò bụrụ nwa yaMụ onwe m sòrò bụrụ nwa yaNgịga dị n'ọkụ abụghị nkè azụỌ̀ bụ́rụ́ nkè anụAjụọ m ọzọOnye ga-alụ mma anyị ?\nJidesie PVC gị ike ugbuaKa i wee soro zaa ajụjụ aN'oké ụbọchị ahụ na-abịa nsoKa anyị lụtara mma anyị di ọzọMaka na ndị nke ọ lụrụ alụ emewaala ya obiBikonụ̀ ụmụnne m, ajụọ m ọzọOnye ga-alụ mama anyị ?\n© Izunna Okafor"
]
}
33 changes: 33 additions & 0 deletions articles/igbo_radio/nigeria-64-akuko-ntoala-di-ncheta.json
Original file line number Diff line number Diff line change
@@ -0,0 +1,33 @@
{
"title": "Nigeria @ 64: Akụkọ Ntọala Dị Ncheta",
"published": "Oct 1, 2024 - 15:50",
"edited": "0",
"sentences": [
"Izunna Okafor dere edemede a\nNwa puru eze abụghịzị nwata, maka na ọ na-abụ ihe gbàá afọ, ọ gbanye mgbọrọgwụ",
"Taa, bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba afọ a, ka ala Nigeria merùberè mmemme ncheta ọgbụgba afọ iri isii na anọ o jiri nwere onwe ya pụọ n'aka ọchịchị ndị ọcha, n'afọ 1960",
"Ala Nigeria, dịka akụkọ ntọala ya siri dị, bụ ala dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Africa, ma bụrụkwa nke ndị bi n'ime ya bibụ ichèiche, wee ruo mgbe ndị ọcha bàtàrà n'afọ 1901 ịchị ndị bi na mpaghara ahụ",
"Tupu oge ahụ, ndị ahụ na-azagasị aha dị icheiche, nọọrọ onwe ha ma nwekwa ndị ọchịchị nke ha, wee ruo mgbe ahụ ndị ọcha bịara",
"Ndị ọcha kèkọtàra ebe ahụ niile ka ọ dịzie mpaghara abụọ —mpaghara mgbago ugwu na mpaghara ndịdà anyanwụ",
"Ka o ruru n'afọ 1914, ha chịkọrọ mpaghara abụọ ahụ ọnụ ka ha bụrụzie otu mbà; ha wee kpọọ aha ya 'Nigeria'",
"Nke a bụ nke e mere site n'aka Gọvanọ mbụ chịrị ala ahụ, bụ Maazị Lord Lugard",
"Ka nke ahụ gachara, ụfọdụ ndị ọzọ jiri ọkwa ọchịchị ahụ bụcha ndị ọcha, wee ruo oge ala Nigeria nwèère onwe ya pụọ n'aka ọchịchị ndị ọcha",
"Ndị ahụ gụnyèrè: Maazị Lord Lugard (onye nọrọ n'ọkwa bido n'afọ 1914 ruo afọ 1919); Maazị Hugh Clifford (bido n'afọ 1919 ruo afọ 1925); Maazị Graeme Thomson (bido n'afọ 1925 ruo afọ 1931); Maazị Donald Cameron (bido n'afọ 1931 ruo afọ 1935); Maazị Bernard Bourdillon (bido n'afọ 1935 ruo afọ 1940); Maazị John Evelyn Shuckburgh (bido n'afọ 1940 ruo afọ 1942); Maazị Alan Burns (bido n'ahọ 1942 ruo afọ 1943); Maazị Arthur Richards (bido n'afọ 1943 ruo afọ 1948); Maazị John Macpherson (bido n'afọ 1948 ruo afọ 1955); na Maazị James Wilson Robertson (bido n'afọ 1955 ruo afọ 1960)",
"Ka o ruru n'afọ 1960, ndị ọcha nyefèzịrị ọchịchị n'aka ụmụafọ Nigeria; e wee kwuwaa na ala Nigeria enwerela onwe ya pụọ n'aka ọchịchị ndị ọcha; e wee kpọọ ya ụbọchị Indipenda, nke pụtara ụbọchị nnwereonwe Nigeria",
"Ka e nyefere ọchịchị n'aka ụmụafọ Nigeria, onye mbụ jiri jiri ọkwa dịka onyeisiala Nigeria bụ Dọkịta Nnamdị Azikiwe, bụ onye ọchịchị ya bịara na njedobe n'afọ 1966",
"N'agbata oge ahụ ọ nọ n'ọkwa, Maazị Abubakar Tafawa Balewa jiri ọkwa dịka Onoowu (Prime Minister), ebe Ezenwaanyị Elizabeth nke Mba England nọ dịka Eze oge ahụ, mana Ezenwaanyị Elizabeth sepụrụ aka n'ihe gbasaara ọchịchị Nigeria n'afọ 1963",
"N'abalị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị n'afọ 1966, ndị ọrụ agha ala Nigeria wụbàtàrà n'ike, wee chụtuo ndị nọ n'ọnwa, ma wegharazie ọkwa ọchịchị",
"Ka nke ahụ gachara, Maazị Johnson Aguiyi-Ironsi bàtàrà n'ọkwa dịka onyeisi ala n'usoro ọchịchị ndị agha",
"Mana, ka o ruru n'abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Julaị afọ ahụ (1966), ndị agha ala Nigeria wakpòkwàrà ma tụọ ka égbé ọzọ, chụtuo Maazị Ironsi n'ọkwa ọchịchị; Maazị Yakubu Gowon wee weghara ọkwa, ma chịgidezie ruo n'abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Julaị afọ 1975, bụ oge ndị agha wụchakwara ọzọ, wee wepu ya n'ọkwa",
"Malite n'oge ahụ, ndị ọzọ chịgoro ala Nigeria (ma n'oge ọchịchị ndị agha ma n'ọge ọchịchị ndị nkịtị) gụnyèrè: Maazị Murtala Mohammed (Julaị 29, 1975 ruo Febụwarị 13 1976); Olusegun Obasanjo (Febụwarị 13 1976 ruo Ọktoba 1, 1979); Shehu Shagari (Ọktoba 1, 1979 ruo Disemba 31, 1983)",
"Ọ bụ n'oge nke Shagari a ka ọchịchị siri n'aka ndị agha batakwa n'aka ndị nkịtị ọzọ",
"Mana, ndị agha mechakwara wegharakwa ọkwa ọchịchị, nke mere ka Muhammadu Buhari bata n'ọkwa ọchịchị (malite na Disemba 31, 1983 ruo Ọgọstụ 27, 1985); Ibrahim Babangida (Ọgọstụ 27, 1985 ruo Ọgọstụ 26, 1993); Ernest Shonekan (Ọgọstụ 26, 1993 ruo Nọvemba 17, 1993); Sani Abacha (Nọvemba 17, 1993 ruo Juunu 8, 1998); Abdulsalami Abubakar (Juunu 8, 1998 ruo Mee 29, 1999)",
"Ka nke a gachara, ndị nkịtị batakwara n'ọkwa ọzọ n'abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Mee",
"Nigeria wee malitezie mgbe ahụ nọgide n'ọchịchị ndị nkịtị (bụ ọchịchị onye kwuo uche ya) wee ruo taa",
"Ndị nkịtị jigoro ọkwa ọchịchị dịka onyeisi ala kemgbe ụbọchị ahụ ruo taa gụnyere: Olusegun Obasanjo (Mee 29, 1999 ruo Mee 29, 2007); Umaru Musa Yar'Adua (Mee 29, 2007 ruo Mee 5, 2010); Goodluck Jonathan (Mee 5, 2010 ruo Mee 29, 2015); Muhammadu Buhari (Mee 29, 2015 ruo Mee 29, 2023); Ahmed Bola Tinubu (Mee 29, 2023 wee ruo taa)",
"Dịka ala Nigeria na ụmụafọ ya na-echeta ma na-emerùbe ọgbụgba afọ iri isii na anọ ha jiri nwere onwe ha, ọ dị mkpa na ụmụafọ Nigeria, ọkachasị ndị nọ n'ọkwa ọchịchị ga-atụle uche ọzọ n'etu ya bụ ije si aga kemgbe ahụ nà otu ọnọdụ ala Nigeria siri gbata kwụrụ ugbua",
"Ọ dị mma ịtụle uche mara ma Nigeria ọ bụ naanị okenye afọ isii n'ọnụ, ka ọ bụkwa okenye n'ihe gbaasaa ọnọdụ mmepe na ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ obodo ahụ",
"Ọ dị mma ịtụle ma Nigeria ọ̀ kara dị mma n'oge ọchịchị ndị ọcha, ka ọ kara dị mma ugbua ọchịchị dị n'aka ụmụafọ Nigeria",
"Ọ dịkwa mkpà ịtụle banyere ebe ya bụ mmiri siri gbarụọ, ebe e metere ya nke ọma, na e metechaghị ya, na ebe e meteghị ya kpamkpam",
"Ọ dịkwazị mkpà ịtụle uche banyere ihe a ga-eme ya bụ àbàlà wee sụta ya nri, nà otu a ga-esi kwọọ ya bụ onye ukwu wara, maka na o si taa dị mma, ọ dịbara gboo"
]
}

0 comments on commit 990263a

Please sign in to comment.