diff --git a/articles/c23lrz2jrx8o.json b/articles/c23lrz2jrx8o.json new file mode 100644 index 00000000..a6735599 --- /dev/null +++ b/articles/c23lrz2jrx8o.json @@ -0,0 +1,85 @@ +{ + "published": "29 Ọgọọst 2024", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ebe foto si, Abike Dabiri/Getty", + "Ndị uweojii Toronto mba Canada ekwuola na ha anwụchiela otu nwaanyị a na-enyo enyo maka ịkpọ oku na soshal midia sị ka e gbuo ndị mmadụ.", + "Nke a dị n’ozi ndị uweojii a wepụtara n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Sepụtemba afọ 2024.", + "Ha kwuru na ha natara mkpesa banyere oku iyi ndụ egwu ahụ a kpọrọ n’ubọchị Wenezde 28 Ọgọst 2024.", + "Ha kwuru na e boro ebubo na o nwere onye ji akara soshal midia na-eyi ụfọdụ agbụrụ ndị Naịjirịa egwu nke mere ndị uweojii Toronto jiri nwụchie otu nwada a kpọro Amaka Sonnberger dị afọ 46 na Toronto.", + "Ebubo ndị e boro ya bụ iyi ndụ egwu dịka ọ ga-awụchi n’ụlọikpe dị n’Ontario n’ụbọchị Mọnde 2 Sepụtemba 2024 ma ọ kụọ elekere iri nke ụtụtụ.", + "Ndị uweojii kpọro oku ka onye ọbụla nwere ihe akaebe banyere ikpe a kpọtụrụ ha.", + "Ndị Eze ọdịnala na ndị ụkọchukwu ekwuola ka a wụchie ndị na-akwado ịkpaoke agbụrụ14 Ọgọọst 2024", + "O nweela ihe gọọmentị mere ndị wakporo mmadụ maka agbụrụ ha n'oge ntuliaka na Legọs?15 Maachị 2023", + "Ntuliaka 2019 o butere ịkpa oke agbụrụ na Lagos?4 Maachị 2019", + "Ebe foto si, Abike Dabiri/Twitter", + "Soshal midia nwurula ọkụ mgbe Onyeisioche ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ndị Naịjirịa na mba ofesi bụ Abike Dabiri weputara ozi n'akara Twitter ya maka otu nwaanyị a kpọrọ 'Amaka'.", + "Ọ sị na \"Amaka Patience Sunnberger bụ nwaanyị kwuru okwu mkpọmasị megide ndị Naịjirịa bi na mba Canada.", + "O wepula akara Twitter ya dịka ndị Naịjirịa bi ebe ahụ ekpesala ya n'aka ndị nwe obodo na Canada.\"", + "Nke a na-abịa dịka ihe onyonyo na-efegharị ebe otu nwaanyị na-ekwu ka egbuo ndị agbụrụ Yoroba na Bini.", + "O kwuru n'ọgbakọ na ọ ga-amalite inye ndị nọ n'ụlọorụ ya nsị \"ọtapịapịa\" ka ha niile na-anwụ n'otu n'otu.", + "Okwu nwaanyị ahụ ebutela iwe na nkatọ dịka ndị mmadụ na-ekwu na ọ dịghị mma ebe ụfọdụ ndị malitere ikpesa ya n'aka ndị nwe obodo na Canada.", + "N'otu aka ahụ, otu Ohaneze Ndigbo apụtala katọọ ya bụ okwu mkpọrọmasị na-efegharị.", + "N’ozi odeakwụkwọ mgbasaozi Ọhanaeze Ndigbo bụ Alex Ogbonnia tinyere aka na ya, otu ahụ kwuru na enweghị ihe akaebe na-egosi na nwaanyị ahụ bụ onye Igbo n’ihi na o gosipụtaghị akparamaagwa e ji mara ndị Igbo.", + "O kwuru na e nweghị onye Igbo ga-amara ụma tụọ okwute n’ime ahịa n’ihi na ọ maghị onye ọ ga-atụta.", + "Ọ sịrị na nnukwu onye odeakwụkwọ Ọhanaeze Ndigbo bụ Amb. Okey Emuchey gbarụrụ ihu gbasara ihe onyonyoo ahụ ma katọọ ya bụ nwaanyị mere ya.", + "Ọhanaeze Ndigbo kwuru na ndị Igbo, Edo na Yoruba nwere ọtụtụ ihe ha jiri yie onwe ha nke gụnyere omenala, ile ọbịa na ịlụrịta di na nwunye.", + "Ha kpọrọ ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa oku ka ha chọpụta nwaanyị mere ihe onyonyoo ahụ ma nye ya ntaramaahụhụ kwesịịrị ya dịka ọ dị n’iwu.", + "N’ọzọ yiri nke ahụ, ụlọ omeiwu nta Naịjirịa edegarala ụlọọrụ nnọchiteanya Canada akwụkwọ mkpesa maka nwaanyị ahụ mere ihe onyonyoo mkpọrọmasị aha ya bụ Amaka Patience Sunnberger.", + "N’ozi ahụ onyeisioche otu Nigeria-Canada Parliamentary Friendship Group bụ Biodun Omoleye na onyeisioche kọmitii ụlọ omeiwu na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Tochukwu Chinedu Okere tinyere aka na ya, ha kwuru na Amaka ebibiela ọtụtụ iwu mbaụwa, nke mba Canada na nke obodo Ontario ebe nke ahụ nwereike ịkpalite ezigbo agha na Naịjirịa maọbụ n’etiti ndị Naịjirịa bi na mba ọzọ.", + "Ka o siladị, ha kporo oku ka mba Canada mee ezi nnyocha ozugbo, kpee ya ikpe ma gọnarị ya n’ihu ọhanaeze. Ha kpọkwara oku ka ndị ọchịchị Canada gbakọọrọ gọọmenti Naịjirịa aka iji gbochie ntiwapụ ọgbaaghara n’ihi akparamaagwa Amaka Sunnberger.", + "Ebe foto si, Abike Dabiri/Simon Ekpa/Adeyinka Grandson/Facebook", + "Dịka nkatọ ihe nwaanyị akpọrọ Amaka Sunnberger kwuru na-ewu ebe niile, ọ bụghị mbụ ụdịrị ihe a na-eme.", + "Kemgbe ntuliaka afọ 2023 gachara, e nwere mgbago ndị na-akpaso mmadụ oke agbụrụ nakwa ifesa okwu mkpọmasị megide agbụrụ ọzọ na soshal midia.", + "Iji ma atụ na nkwado ntuliaka 2023 dịka ọ fọrọ abalị ole na ole ka apụta tụọ vootu, otu onye akpọrọ Musiliu Akinsanya bụ MC Oluomo kwuru ka ndị Igbo ghara ịpụta tu vootu.", + "N'ihe onyonyo wuru ewu mgbe ahụ Oluomo sị \"anyị anaghị alụ ya dịka ọgụ, anyị na-ekwu ọ bụrụ na ị gaghị atụnyere onye nke anyị nọrọ n'ime ụlọ gị\"", + "Ndị mmadụ gosiri iwe ha maka ihe ahụ o kwuru ma kpọsie oku ike ka anwụchie ya maka ikpa oke agbụrụ .", + "N'agbanyeghi nke ndị uweojii Legọs steeti pụtara mgbe ahụ kwuo na ọ bụ egwuregwu ka ọ na-egwu.", + "Adeyinka Grandson Onye ọzọ kpara ụdịrị agwa ahụ bụ onye akpọrọ Adeyinka Shoyemi e ji Adeyinka Grandson mara.", + "E ji ịkpọ oku ka ndị Yoroba chụpụ ndị Igbo n'ala ha niile mara ya. Ndị mmadụ kpesara ya n'aka ndị uweojii na mba Briten ebe o bi.", + "Nke a mere ka anwụchie ya, kpee ya ikpe ma tụọ ya nga n'afọ 2022 maka ịkpa oke agbụrụ.", + "Lagospedia bụ akara nọ na X malitere na ngwụcha ọnwa Julaị kpọ oku ka ndị Yoroba niile chụpụ ndị Igbo bi na Legọs nakwa ala Yoroba niile.", + "O kwuru ka amalite ngagharịiwe ọ kpọrọ #Igbomustgo iji hụ na nke a bịara na mmezu.", + "O dochabeghi anya onye nọ n'azụ akara ahụ mana ọtụtụ ndị mmadụ kpọrọ oku ka a nwụchie onye ahụ.", + "Ha gụnyere Ohaneze ndị Igbo, ndị omeiwu agbụrụ Igbo nakwa ndị Igwe ala Igbo.", + "Simon Ekpa Ekpa bụ onye so n'ọchịchọ Biafra ma jirikwa olu ya na-akpọ oku ka achụpụ ndị agbụrụ Fulani niile nọ n'ala Igbo.", + "O ziela ozi mkpọmasị kwa mgbe kwa mgbe n'aha ndị otu Ipob ma sorokwa na ndị kpọrọ oku ka amalite 'Sit-at-home'.", + "Ọ kwadokwara ogbugu a na-egbu ndị ọrụ nchekwa n'ala Igbo ma na-ebo ha ebubo nke ya ịbụ ndị na-egbu ndị ntorọbịa na nkịtị.", + "Ndị uweojii mba Finland ebe ọ nọ anwụchiela ya mbụ dịka ha na-eme ya nyocha.", + "ịkpa oke", + "Legọsị", + "Naijiria", + "Nchekwa ndị ụwe ojii", + "Canada", + "Ihe anyị ma maka ndị e gburu n’okeala obodo Enugwu Ukwu na Nawfia Anambra Steeti.10 Septemba 2024", + "Etu e siri bulie ọnụahịa mmanụ ụgbọala site n’afọ 2000 ruo 202410 Septemba 2024", + "NA EME UGBU A, Harris na Trump ga-arụrịtaụka maka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka", + "M na-ehi ụra mgbe di m wakporo m ma rụkpọo mkpụrụ anya m abụọ - Amarachi Lawrence3 Septemba 2024", + "Etu mmadụ anọ si n'otu ezinaụlọ jiri site n'ụra fee n'ọnwụ ha n’Enugu Steeti2 Septemba 2024", + "Ndị uweojii Toronto anwụchiela Amaka Sonnberger maka iyi ndụ egwu ma kpụpụ ya n'ụlọikpe2 Septemba 2024", + "Anyị niile n’Anioma, Delta Steeti bụ ndị Igbo – Izu Anioma30 Ọgọọst 2024", + "Ọ dị njọ nwa ọhụrụ ịṅụ ara nwaanyị ọzọ?31 Ọgọọst 2024", + "Etu akwamozu Onyeka Onwenu sị aga ugbua30 Ọgọọst 2024", + "Umụaka bụzị ndị na-ata ahụhụ maka ọria Mpox28 Ọgọọst 2024", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwu", + "Ọrụ nna, nne na ụmụaka na-arụ n'ime ezinaụlọEmelitere ikpeazụ na: 3 Juun 2021", + "Ị ma ihe mere i ji ekwo ụra?", + "Sex for Grades: Unilag achụọla ndị nkuzi abụọ BBC gbara n'anwụEmelitere ikpeazụ na: 8 Ọktọba 2019", + "Etu akwamozu Onyeka Onwenu sị aga ugbua", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/c36n328gj9wo.json b/articles/c36n328gj9wo.json new file mode 100644 index 00000000..8872f7e5 --- /dev/null +++ b/articles/c36n328gj9wo.json @@ -0,0 +1,81 @@ +{ + "published": "30 Ọgọọst 2024", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ebe foto si, Kingsley Ojie", + "Onye dere ya, Michael Ilediagu", + "Ndị mere akụkọ a, Journalist", + "Ọgọọst 2024", + "Otu ọdịnaala jikoro ndi Anioma na Delta Steeti bụ Izu-Anioma ekwuputara na ha niile bụ ndị Igbo ma kwuo hoohaa na ha so n’agbụrụ Igbo.", + "Ha mere ka-amata nke a n'akwụkwọ ozi onyeisi ha bụ Kingsley Ojie na odeakwụkwo ha bụ Dennis Esso Boniwe binyere aka nakwa oge BBC Igbo kpọtụtrụ ha n’ekwenti.", + "Ịsị okwu akwụkwọ ozi ahụ bụ \"Anioma bụ ndi Igbo, anyị na Ohanaeze Ndigbo enweghị nsogbu\".", + "Ha kwuru na okwu niile dị n'ime akwụkwọ ozi ahụ bụ nkwekọrịta ha nwere oge ha mechere nzụkọ n'Asaba n'ọnwa Juli, abali 24 n'afọ 2024.", + "N'ime akwụkwọ ozi ahụ \"Ndi Anioma na-ahụ onwe ha dika ndị Igbo etu ọtụtụ ndị Igbo nọ na Ọwụwa anyanwụ sị chọpụta na ha bụkwa Igbo\".", + "\"Ndị Anioma bụ ndị Igbo. Anyị na Ohanaeze Ndigbo na-ejikọta aka ọnụ maka ọdịmma ụmụ Igbo niile\".", + "Oge BBC Igbo kpọrọ onyeisi Izu-Anioma bụ Kingsley Ojie n’ekwentị ka ọ kọwara ọtụtụ ihe, ọ kachasị ihe gbasara asụsụ Igbo nakwa omenaala Igbo na nke Anioma .", + "Na ọkwụ ya “anyị niile nọ na Delta Nọt na-asụ Igbo. Asụsụ anyị niile na asụsụ bụ igbo dịka ndị Igbo ndị ọzọ bi na ndịda ọwụwa anyanwụ. Naanị ihe dị iche bụ olu ndị”.", + "“Ị bịa n’Aniocha, Oshimiri, Ika, na Ukwani; asụsụ anyị bụ asụsụ Igbo”.", + "“Ihe niile m na-ekwu bụ na m sụọ asụsụ anyị, ị ga-aghọta ihe niile m na-ekwu na ị gee ntị ọfụma”.", + "“A bịara m Awommamma dị n'Imo steeti n'afọ 1986.", + "Amụghị m asụsụ Igbo amu; maka na ihe ọbụla onye Awommamma suru n’Igbo a na m aghọta ya”.", + "Onyeisi Izu-Anioma ahụ kọwakwara na enweghị ihe dị iche omenaala Igbo na nke Anioma.", + "“Usoro ome na ala di na ala Igbo dịkwa na obodo anyị”", + "O kwukwara na ị bịa “na ahịa a na-azụazụ; ndị Igbo nwere Afo, Nkwo, Eke na Orie. Nke a bụkwa ahịa obodo anyị na-azụ”.", + "Ebe foto si, Omu Anioma, HRM Obi Mather Dumkwu", + "Kingsley Ojie tinyekwara ọnụ na ihe dị iche gbasara asụsụ Anioma (Ụkwụani) na Ndị Benin n'Edo steeti.", + "“Mana onye si Edo steeti bịa ugbua jiri asusụ ha sị m bịa, agaghị m aghọta ihe ọ na-ekwu. Ekele ha na ekele anyị abụghị otu ihe. Asụsụ ọbụla ha ga-asụ, onweghị ihe ọbụla m ga-aghọta n'ime ya”", + "“Mana m na onye Igbo nọrọ, a ga m ama na onye a bụ nwanne m. Na ọ bụ naanị ire dị icheiche ka anyị na-asụ, na anyị niile bụ ndị Igbo”.", + "Oge a juru Kingsley Ojie ajuju maka ndị a na-akpọonwe ha Delta-Igbo, ọsịsa ya bụ na “e nwere ndị a na-akpọ Delta, Ika Igbo, na aha dị icheiche mana ihe ka mkpa bụ na ha niile na-agbakwunye ‘Igbo’ n’aha ọbụla ha zara”.", + "“E wekwara ọtụtụ n’ime anyị; obodo ụfọdụ dịka Ndokwa, na ọtụtụ ndị Ịka ga-agwa gị na ndị nnanna ha siri Benin, Edo steeti nwere bịa biri n'Anioma”.", + "“Ndị ọzọ ga-agwa gị na ha sị Yoruba ma ọ bụ Igala na agbụrụ ndị ọzọ dị icheiche were bịa biri na ala Anioma”.", + "Ebe foto si, Facebook/Omu Anioma, HRM Obi Mather Dunkwu", + "Kingsley Ojie kwuru na Anioma nwere ndị agbataobi ha dịka Urhobo, Benin, Yoruba, Isoko, Ijaw na ndị ọzọ bụ ndị Anioma na ha na-emeko ihe.", + "“E nwere ebe ị ga-eje ịhụ ebe omenaala anyị na ndi ọzọ kụgwara akụgwa”.", + "“Na mbido Naịjirịa, e tinyere anyị na Western Region. Anyị anọghị na Eastern Region”.", + "“E mechara site na Western Region were weputa Mid-western Region. Anyị nọ na Mid-West Region ahụ”.", + "“Ndị nnanna anyị weputara Izu-Anioma na afọ ndị 60s, ihe ha gwara anyị bụ na anyị bụ ndị Anioma. Na asụsụ anyị bụ Anioma, ala anyị bụ Anioma, omenaala anyị bụ Anioma”.", + "“Mana ka m juo gị, gịnị bụ Anioma? Asụsụ ndị ebee ka ọ bụ? Ihe ndịa ka anyị ji were jide omenaala anyị”.", + "“Bido taa ruo echi, enwere ndị ga-asi na ha abụghị Igbo, mana isi ha sụọ asụsụ ha, ihe ha ga-asụ bụ Igbo”.", + "Kingsley Ojie kwuru na ndi Anioma na Igbo niile sị na ọdịda anyanwụ na-emeko dịka nwanne na nwanne ebe niile ha nọ n'ụwa.", + "\"Ijee n'Amerịka, ị ga-afụ Igbo World Assembly. Ụmụ Anioma abụrụla Onyeisi otu ahụ ma nwetakwa ọkwa dị icheiche n'otu ahụ. Ọbụghị ihe taa\"", + "\"Ị ga-echeta, nwa Anioma Ambasaddor Raph Uwechue abụrụla onyeisi Ohanaeze Ndi Igbo bụ otu jikoro Igbo niile\"", + "\"Enwere ngalaba Ohanaeze Ndigbo na Delta Steeti\"", + "\"Mmekọ Anioma na Ohanaeze Ndigbo ebidoghị taata. Ọ bụ ihe diwara kemgbe ụwa\"", + "\"Ihe bụ eziokwu bụ na ndị kwetere na bụ Igbo karịrị ndị na-ekweghị\" Dennis kwuru.", + "\"Owere ndị ga-apụtakwa taata sị gị na ha abụghị ndị Igbo mana ebe ị ga-afụ udiri ndị ahụ bụ n'Ika, mana ọnụ ọgụgụ perempe.\"", + "\"Mana asị taa ka eme plebiscite ma ọ bụ ịgụ ọnụ n'isi n'isi, ka a ga-afụ ihe m na-ekwu\".", + "Ndọrọndọrọ ọchịchị", + "Naijiria", + "Delta Steeti", + "Ihe anyị ma maka ndị e gburu n’okeala obodo Enugwu Ukwu na Nawfia Anambra Steeti.10 Septemba 2024", + "Etu e siri bulie ọnụahịa mmanụ ụgbọala site n’afọ 2000 ruo 202410 Septemba 2024", + "NA EME UGBU A, Harris na Trump ga-arụrịtaụka maka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka", + "M na-ehi ụra mgbe di m wakporo m ma rụkpọo mkpụrụ anya m abụọ - Amarachi Lawrence3 Septemba 2024", + "Etu mmadụ anọ si n'otu ezinaụlọ jiri site n'ụra fee n'ọnwụ ha n’Enugu Steeti2 Septemba 2024", + "Ndị uweojii Toronto anwụchiela Amaka Sonnberger maka iyi ndụ egwu ma kpụpụ ya n'ụlọikpe2 Septemba 2024", + "Anyị niile n’Anioma, Delta Steeti bụ ndị Igbo – Izu Anioma30 Ọgọọst 2024", + "Ọ dị njọ nwa ọhụrụ ịṅụ ara nwaanyị ọzọ?31 Ọgọọst 2024", + "Etu akwamozu Onyeka Onwenu sị aga ugbua30 Ọgọọst 2024", + "Umụaka bụzị ndị na-ata ahụhụ maka ọria Mpox28 Ọgọọst 2024", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwu", + "Ọrụ nna, nne na ụmụaka na-arụ n'ime ezinaụlọEmelitere ikpeazụ na: 3 Juun 2021", + "Ị ma ihe mere i ji ekwo ụra?", + "Sex for Grades: Unilag achụọla ndị nkuzi abụọ BBC gbara n'anwụEmelitere ikpeazụ na: 8 Ọktọba 2019", + "Etu akwamozu Onyeka Onwenu sị aga ugbua", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/c89w2lx94weo.json b/articles/c89w2lx94weo.json new file mode 100644 index 00000000..bbebafa9 --- /dev/null +++ b/articles/c89w2lx94weo.json @@ -0,0 +1,65 @@ +{ + "published": "3 Septemba 2024", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Amarachi Lawrence, nwaanyị di ya rukpọro anya abụọ n’Umuahia Abia Steeti akọwaala ihe ọ gabigara n’aka di ya n’abalị ụbọchị ahụ.", + "Nwaanyị bụ na-anya ụfụ ihe mere ya n’ụlọọgwụ ugbua gwara BBC Igbo na ọ bụ n’abalị ụbọchị 27 Ọgọst 2024 ka di ya wakporo ya n’etiti abalị na enweghi ihe ọbụla o mere ya.", + "O kwuru na ha richara nri abalị ma tụọ okwe egwuregwu a kpọro ‘whot’ na Bekee tupu ọ lagbuo ụra.", + "Etu mmadụ anọ si n'otu ezinaụlọ jiri site n'ụra fee n'ọnwụ ha n’Enugu Steeti2 Septemba 2024", + "Etu ụmụaka atọ si mie ala n'Imo Steeti ma bụrụ ndị a na-achọ achọ kamgbe otu izuụka21 Maachị 2024", + "Ihe mere ndị mmadụ anaghị agbapụ na mmekọrịta na-echi ha ọnụ n'ala27 Eprel 2022", + "Amarachi kwuru n’eruru ihe dịka elekere otu nke etiti abalị, na di ya kpọtee ya n’ụra ma malite itiya ihe, were aka ya abụọ rụgide ya na mkpụrụ anya.", + "“Mgbe anyị richara nri abalị, anyị zụrụ okwa ‘whot’ tupu m lakpuo ụra.", + "“E ruru n’etiti abalị, di m kpọtere m n’ụra, m gwara ya ka ọ hapụ m ka m hie ụra mana ọ jụrụ ma were aka rụgide m n’anya ka ọ rụpụta mkpụrụ anya m abụọ.", + "“Ọ gara n’ihu were mma oge na-egbukasị m n’aha nke mere m jiri na-eti mkpu ruo mgbe nwunye onyw nwe ụlọ anyị pụtara.", + "Anarachi kwuru na di ya mepere ụzọ ha ma malite igbu nwaanyị ahụ mma, na ọ bụ oge ahụ ka ọ maghizi ihe na-eme ruo mgbe o tetara n’ụlọọgwụ.", + "O kwuru na o rubeghi afọ abụọ ha lụrụ dịka di na nwunye, na ha amụtabeghi nwa ọbụla.", + "Ọ kpụkuru gọọmentị ka a gbara ya ọsọ enyemaka ma rịọ ka enyekwara ụmụnwaanyị ndị ọzọ na-agabiga ụdịrị ihe a aka.", + "Lawrence Uzor bụ di ya bụ onye obodo Umuhu Ezechi dị n’okpuruọchịchị Bende ebe Amarachi bụ onye Umuahia.", + "Ebe foto si, Other", + "Nwaanyị nwe ụlọ ha bi bụ Lovejane Nwaiwu kwuru na ihe dịka elekere iri nke abalị ụbọchị Satọde ka nwoke a nọ na-eti mkpu ‘odogwu, odogwu’.", + "N’okwu ya “dịka nwoke a tichara mkpu ahụ, ụra pụrụ n’anya ruo ihe dịka elekere iri na abụọ nke etiti abalị.", + "“Mgbe ọ kụrụ elekere otu (1am), nwunye nwoke malitere iti mkpu, ‘Nne e gbuola m’.", + "“Emepere m ụzọ ma nyoo anya na mpio ụlọ ha wee hụụ ka nwoke a ji mma nwagidere nwunye ya n’elu.", + "“Amalitere ịkwa aka n’ọnụ ụzọ ndị agbataobi mana o nweghi onye kwere aza oku.", + "Agara m n’ọnụ ụzọ ụlọ ha ma malite ịkụ aka n’ụzọ, nwoke a hụ mepere ụzọ ma were mma sị ka o gbuo m n’isi, etinyere m aka mere o jiri gbuo mma ahụ n’aka nakwa n’ihu.", + "“Agbara m ọsọ ma gbaba n’ime ụlọ anyị tupu m kpọọ nwa m n’ekwentị bụ onye mechara kpọọ ndị ọrụ nchekwa tupu a nwụchie nwoke ahụ.”", + "Dịka ọ dị ugbua, nwoke a nọ n’aka ndị uweojii ugbua bụ ebe a ka na-agba ya ajụjụ ihe mere o jiri kpaa arụ a.", + "Nwunye Gọvanọ Abia Steeti bụ Priscilla Otti mere njem nleta n’ụlọọgwụ ebe nwaanyị a nọ ma kwaa arịrị n’ihi ọdachi a.", + "Onyeisi ụlọọgwụ ahụ kwuru na ha na-agbasi mbọ ike ịhụ na e mere ka nwaanyị a malitekwa ịhụ ụzọ.", + "Naijiria", + "Abia Steeti", + "Mmegbu", + "Ezinụlọ", + "Ihe anyị ma maka ndị e gburu n’okeala obodo Enugwu Ukwu na Nawfia Anambra Steeti.10 Septemba 2024", + "Etu e siri bulie ọnụahịa mmanụ ụgbọala site n’afọ 2000 ruo 202410 Septemba 2024", + "NA EME UGBU A, Harris na Trump ga-arụrịtaụka maka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka", + "M na-ehi ụra mgbe di m wakporo m ma rụkpọo mkpụrụ anya m abụọ - Amarachi Lawrence3 Septemba 2024", + "Etu mmadụ anọ si n'otu ezinaụlọ jiri site n'ụra fee n'ọnwụ ha n’Enugu Steeti2 Septemba 2024", + "Ndị uweojii Toronto anwụchiela Amaka Sonnberger maka iyi ndụ egwu ma kpụpụ ya n'ụlọikpe2 Septemba 2024", + "Anyị niile n’Anioma, Delta Steeti bụ ndị Igbo – Izu Anioma30 Ọgọọst 2024", + "Ọ dị njọ nwa ọhụrụ ịṅụ ara nwaanyị ọzọ?31 Ọgọọst 2024", + "Etu akwamozu Onyeka Onwenu sị aga ugbua30 Ọgọọst 2024", + "Umụaka bụzị ndị na-ata ahụhụ maka ọria Mpox28 Ọgọọst 2024", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwu", + "Ọrụ nna, nne na ụmụaka na-arụ n'ime ezinaụlọEmelitere ikpeazụ na: 3 Juun 2021", + "Ị ma ihe mere i ji ekwo ụra?", + "Sex for Grades: Unilag achụọla ndị nkuzi abụọ BBC gbara n'anwụEmelitere ikpeazụ na: 8 Ọktọba 2019", + "Etu akwamozu Onyeka Onwenu sị aga ugbua", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/cx2n7n76njno.json b/articles/cx2n7n76njno.json new file mode 100644 index 00000000..b5a8fa0a --- /dev/null +++ b/articles/cx2n7n76njno.json @@ -0,0 +1,79 @@ +{ + "published": "10 Septemba 2024", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Izuụka gara aga, ụlọọrụ mmanụ kachasị na Naịjirịa bụ NNPCL kwuru na agbakwunyela ego n’ọnụahịa mmanụ ụgbọala gburugburu mba hụ site na narị naịra isii na iri na asaa (617) ruo narị naịra asatọ na iri itoli na asaa (897).", + "Ya bụ mgbakwunye bịara dịka ihe ịtụnanya n’ebe ọtụtụ ndị Naịjirịa nọ n’ihi na gọọmenti mere atụmatụ ahụ n’oge ụmụ ogbenye na-enye mkpesa gbasara ọnọdụ obibi ndụ ọjọọ.", + "Naịjirịa bụ mba kachasị nwee mmanụ agbịdị na mba Afrịka ma na-atụpụkwa mmanụ kiarịa mba ndị ọzọ dị n’Afrịka.", + "Ọnọdụ a mere ụfọdụ mmadụ ji wee na-eche na mmanụ ụgbọala ekwesịghị ịdị ọnụ na mba ahụ.", + "Naịjirịa ahụla ọnụego mmanụ ụgbọala kachasị kemgbe e hibere ya19 Ọgọọst 2024", + "Agụrụ, mmanụ ụgbọala, dọla na ụzọ ndị ọzo ọchịchị Tinubu n'otu afọ siri metụta ndị Naịjirịa30 Mee 2024", + "Fuel subsidy: Ihe ndị mmadụ na-agabiga n’oge iri elu ọnụego mmanụ ụgbọala a4 Juun 2023", + "Ọnụahịa nke ọhụrụ a na-eme ya ugboro abụọ a ga-ebuli ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa kemgbe Onyeisiala Tinubu banyere n’ọchịchị n’ọnwa Mee afọ 2023.", + "Nke mbụ e buliri ya bụ oge Onyeisiala mara ọkwa banyere mkpebi gọọmenti ya ịwepụ ego e ji ebelata ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụ fuel subsidy n’asụsụ bekee n’oge e duchara ya n’iyi ọrụ.", + "Ọ bụ eziokwu na nke a abụghị oge mbụ a na-ebuli ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa, ọ bụ ihe ịtụnaanya nye ọtụtụ ụmụafọ ha.", + "BBC enyochaala etu e siri bulie ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa malite n’afọ 2000 ruo ugbua.", + "Ebe foto si, Getty Images", + "N’ime obere oge e duchara ya n’iyi ọrụ, Chief Olusegun Obasanjo buliri ọnụahịa mmanụ ụgbọala site na naịra iri abụọ (20) ruo naịra iri atọ (30) n’abalị mbụ nke ọnwa Juun 2000.", + "Ka osiladị, n’abalị 8 Juun 2000 Obasanjo belatara ọnụahịa mmanụ ụgbọala site na naịra iri atọ (30) ruo naịra iri abụọ na abụọ (22), nke pụtara ihe dịka pasenti iri (10%) e ji belata ya.", + "N’abalị mbụ nke ọnwa Jenụwarị 2002, Obasanjo buliri ọnụahịa mmanụ ụgbọala ọzọ site na naịra iri abụọ na abụọ (22) ruo naịra iri abụọ na isii (26).", + "N’ọnwa Juun 2003, Obasanjo buliri ya ọzọ site na naịra iri abụọ na isii (26) ruo naịra iri anọ na abụọ (42).", + "N’abalị 29 Mee 2004, Obasanjo mere ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụrụ naịra iri ise (50). Nke pụtara mgbakwunye pasenti iri na itoli na ụma ise (19.05%).", + "N’abalị 25 Ọgọst 2004, o buliri ya ruo naịra iri isii na ise (65).", + "Oge ikpeazụ Obasanjo buliri ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụ n’abalị 27 Mee 2007, oge o mere ka ọ bụrụ naịra iri asaa na ise (75%) nke pụtara mgbakwunye pasenti iri na ise naụma iri atọ na asatọ (15.38%).", + "Onyeisiala Umaru Musa Yar’Adua belatara ọnụahịa mmanụ ụgbọala site na naịra iri asaa na ise (75) ruo naịra iri isii na ise (65) n’ọnwa Juun 2007.", + "Yar’Adua nwụrụ anwụ bụ naanị onyeisiala na-agbakunyeghị ego n’ọnụahịa mmanụ ụgbọala n’ime ndị isiala niile chịrị Naịjirịa malite kemgbe afọ 1973.", + "Ebe foto si, Getty Images", + "N’abalị mbụ nke ọnwa Jenụwarị 2012, Onyeisiala Goodluck Jonathan gbara mbọ ibuli ọnụahịa mmanụ ụgbọala n’agbata otu narị naịra na iri atọ na asatọ (138) na narị naịra abụọ na iri ise (250) tupu o mezie ya naịra iri itoli na asaa (97) n’ihi ngagharịiwe na mkpesa ụmụ mmadụ mere oge ahụ.", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Oge mbụ ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari buliri ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụ mgbe o nyere ikikere ka a na-ere ya n’ọnụego naịra iri asatọ na asaa na kobo iri ise (87.50) n’ọdọ mmanụ ụgbọala dị iche iche mana ọnụego ya agbanweghị n’ọdọ mmanụ NNPC.", + "A gbanweghị ya ọzọ ruo n’abalị 11 Mee 2016 oge gọọmenti Buhari mere ya ka ọ bụrụ otu narị naịra na iri anọ na ise (145).", + "N’ọnwa Maachị 2020, ọdịda ọnụahịa mmanụ n’ahịa mbaụwa mere ka gọọmenti belata ya site na otu narị naịra na iri anọ na ise (145) ruo otu narị naịra na iri abụọ na ise (125).", + "Dịka ọ gasịrị otu ọnwa, nke ugboro abụọ ya n’ime ọnwa Mee 2020, ụlọọrụ PPPRA kwupụtara ọnụahịa ọhụrụ site na otu narị naịra na iri abụọ na otu na ụma iri ise (121.50) ruo otu narị naịra na iri abụọ na atọ na ụma iri ise (123.50) maka otu lita.", + "N’ụbọchị Wenezde 2 Septemba 2020, otu jikọtara ndị nwere ọdọ mmanụ ụgbọala bụ Association of Private Petrol Station Owners of Nigeria (IPMAN) nyere ndị otu ha iwu ka ha bulie ọnụahịa mmanụ ụgbọala ruo otu narị naịra na iri isii na abụọ (162) maka otu lita.", + "N’ọnwa Nọvemba 2020, e buliri ya ruo otu naịra na iri asaa (170).", + "Onyeisiala Muhammadu Buhari mere ka otu lita mmanụ ụgbọala bụrụ narị naịra abụọ na iri (210) tupu o nyefee ọkwa ọchịchị n’aka Bola Tinubu n’abalị 29 Mee 2023.", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Kemgbe Onyeisiala Bola Tinubu mara ọkwa na ewezugala ego e ji ebelata ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụ fuel subsidy n’abalị 29 Mee 2023, ọnụahịa ya arịala elu karịsịa na Naịjirịa.", + "Dịka ọ gasịrị mkpụrụ ụbọchị ole na ole ọ mara ọkwa ahụ, ụlọahịa mmanụ kachasị na Naịjirịa bụ NNPC kwupụtara na ọnụahịa mmanụ ụgbọala ọhụrụ ga-abụ narị naịra isii na iri na asaa (617) maka otu lita nke pụtara mgbakwunye pasenti narị atọ (300%).", + "N’ụbọchị Tuzde 3 Septemba 2024, ya bụ ihe dịka ọnwa iri na isii e buliri ọnụahịa mmanụ ụgbọala, ụlọorụ NNPC kwupụtara ọnụahịa ọhụrụ nke bụ narị naịra asatọ na iri itoli na asaa (897).", + "Ọnụahịa ọhụrụ a agaala n’ihu na-ebute ọgbaaghara n’etiti ụmụafọ Naịjirịa dịka ọtụtụ kwenyere na ọ na-me ka ihe isiike na ọnọdụ obibi ndụ dịkwuo njọ.", + "Ọnụahịa ịrịọnụ", + "Ụkọrọ mmanụ ụgbọala", + "Bola Tinubu", + "Naijiria", + "Olusegun Obasanjo", + "Muhammadu Buhari", + "Ihe anyị ma maka ndị e gburu n’okeala obodo Enugwu Ukwu na Nawfia Anambra Steeti.10 Septemba 2024", + "Etu e siri bulie ọnụahịa mmanụ ụgbọala site n’afọ 2000 ruo 202410 Septemba 2024", + "NA EME UGBU A, Harris na Trump ga-arụrịtaụka maka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka", + "M na-ehi ụra mgbe di m wakporo m ma rụkpọo mkpụrụ anya m abụọ - Amarachi Lawrence3 Septemba 2024", + "Etu mmadụ anọ si n'otu ezinaụlọ jiri site n'ụra fee n'ọnwụ ha n’Enugu Steeti2 Septemba 2024", + "Ndị uweojii Toronto anwụchiela Amaka Sonnberger maka iyi ndụ egwu ma kpụpụ ya n'ụlọikpe2 Septemba 2024", + "Anyị niile n’Anioma, Delta Steeti bụ ndị Igbo – Izu Anioma30 Ọgọọst 2024", + "Ọ dị njọ nwa ọhụrụ ịṅụ ara nwaanyị ọzọ?31 Ọgọọst 2024", + "Etu akwamozu Onyeka Onwenu sị aga ugbua30 Ọgọọst 2024", + "Umụaka bụzị ndị na-ata ahụhụ maka ọria Mpox28 Ọgọọst 2024", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwu", + "Ọrụ nna, nne na ụmụaka na-arụ n'ime ezinaụlọEmelitere ikpeazụ na: 3 Juun 2021", + "Ị ma ihe mere i ji ekwo ụra?", + "Sex for Grades: Unilag achụọla ndị nkuzi abụọ BBC gbara n'anwụEmelitere ikpeazụ na: 8 Ọktọba 2019", + "Etu akwamozu Onyeka Onwenu sị aga ugbua", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file