diff --git a/articles/c3g0yn28w9no.json b/articles/c3g0yn28w9no.json new file mode 100644 index 00000000..0fb6d99c --- /dev/null +++ b/articles/c3g0yn28w9no.json @@ -0,0 +1,87 @@ +{ + "published": "8 Julaị 2022", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Gọọmenti mba Rwanda amachiela ọtụtụ mmadụ ị ga ebe a na-eli ozu iji belata nfesa ọrịa Marburg virus.", + "Ozi si na mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Rwanda kwuru na mmdụ asatọ (8) anwụọla site n'ọrịa ah, nke mbụ ya na mba Rwanda.", + "Mịnịstrị ahụ gara n'ihu kwuo na ọ bụ naanị mmadụ iri ise (50) ka a chọrọ ịhụ ebe a na-eme oliliozu onye ọbụla nwụrụ site n'ọrịa ahụ.", + "Ha gara n'ihu dọọ aka na nti ka onye ọbụla nwere ihe ngosi ọrịa ahụ gbara ọsọ gaa ụlọọgwụ maka nleta.", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Mmadụ isii anwụọla n'ofufe ọhụrụ nke nje Marburg malitere na mba Rwanda dịka Minista ahụike mba ahụ si kwuo.", + "Sabin Nsanzimana kọwara na ọtụtụ ndị nwụrụ na ya bụ ofufe bụ ndị ọrụ ahụike na-agwọ ndị mmadụ n'ụlọọgwụ.", + "A chọpụtala mmadụ ruru 20 bu ya nụ ọrịa kemgbe ekwuputara ya n'ụbọchị Fraịde.", + "Nje Marburg bụ nke na-egbu mmadụ pasentị 88 bụkwa ụdịrị nje yiri Ebola.", + "Ọ bụ ụsụ mkpụrụ osisi na-ebunye ya mmadụ dịka mmadụ na-ebunye kwa ya ibe ya site na mmiri ahụ onye nwere ya bụ ọrịa.", + "Njirimara ya gụnyere iba, ahụ mgbu, ịgbọ agbọọ, ịnyụ miri miri nakwa ọnwụ site n'ịgba ọgbara.", + "Dịka ihe si kwụrụ ugbua, e nweghi usoro ọgwụgwọ maọbụ ọgwụ e ji awọ ya mana ngalaba ahụike mbaụwa bụ WHO si kwuo, ha na-arụpụta ụfọdụ usoro nwereike ịgwọ ya.", + "N'aka nke ha mba Rwanda ekwuola na ha amalitela nyocha nakwa ichọta ndị mmadụ iji mee ka mfesa ọrịa a belata.", + "Ọnụọgụgụ ndị buterela coronavirus na Naịjirịa eruola 50,00020 Ọgọọst 2020", + "Ebola: Ndi na-ahu maka orịa na-efe efe ebidola ọrụ9 Mee 2018", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Mba Gana ezigala mmadụ iri itolu na asatọ ka ha nọpụrụ onwe ha iche dịka a na-eche na ha nwereike ibu ọrịa nje Marburg.", + "Cheta na enyochapụtara nje ọrịa a n’ahụ mmadụ abụọ na mba ahụ.\nE kwuru na mmadụ abụọ anwụọla n’ebe mpaghara Ashanti dịka ọrịa ọhụrụ a malitere mfesawa n’akụkụ ụwa dị ịcheịche na nso nso a .", + "Dịka ngalaba ahụike mbaụwa bụ WHO kwupụtara na nje 'Marburg' egbuola mmadụ abụọ a, egwu na-atụ na ya bụ nje na-efe nwere ike ịbata Naijiria ma ọbụburu na ndị mmadụ na gọọmentị ejikereghị gbobido ya.", + "Akụkọ kwuru na nke a mere na mpaghara a kpọrọ Ashanti dị n'akụkụ ndida mba ahụ", + "Nchọpụta mbụ WHO mere gosiri na ndị ahụ nwere ịba dị ezigbo njọ nakwa ịnyụ pịrị pịrị bụ njirimara abụọ ọrịa ahụ.", + "Dịka dọkịta ahụike ọha bụ Dkta Bayo Onajole siri kọwara BBC Igbo, na nje 'Marburg' so na nje ndị na-akpa ike dịka 'Yellow fever', ebola, 'Lassa fever', na-emebi ihe n'ọbara nke Bekee kpọrọ 'haemorgining fever'\".", + "Onajole onye bụ onyeisi ngalaba ahụike obodo na College of Medicine, University of Lagos sị: \"Njirimara ọrịa ndị a nke na-eyi onwe ha gụnyere ahụ ọkụ, ahụ mgbu na ịgba ọbara.\"", + "Ihe ọzọ WHO kwukwara bụ na ọrịa na-anọ site n'ụbọchị abụọ rue ụbọchị iri abụo na otu n'ime ahụ mmadụ tupu o malite ịgosi.", + "Cheta na a chọtabuola ọrịa a na mba Gini n'afọ 2021 mgbe o gburu ụfọdụ mmadụ ma na-efesi kwa ike.", + "Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Twitter iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.", + "End of Twitter post", + "Ebe foto si, Getty Images", + "Dịka ngalaba WHO si kwuo , Marburg bụ ọrịa na-emesi mmadụ ike.", + "Ọ na-emekwa ka onye bu ya gbaa oke ọbara nakwa ịba.", + "Ha sị na nje na-akpaso ya so n'otu ezinaụlọ nje ndị na-ebute ọrịa Ebola.", + "Aha ya si n'otu obodo a kpọrọ 'Marburg' na mba Jamini bụ otu n'ime obodo abụọ gụnyere Frankfurt bụ ebe ọrịa ahụ fesiri ike n'afọ 1967.", + "Ha kwuru na a na-ebute ya site na mmiri ọbụla si mmadụ bu ọrịa ahụ n'ahụ apụta gụnyere ọsụsọ, asọ mmiri, ọbara na mmri ahụ mmadụ ndị ọzọ.", + "O sikwa na mmiri ahụ anụmanụ ọbụla bu ọrịa ahụ apụta ọ kachasị ụsụ na enwe.", + "Njirimara ọrịa 'Marburg'", + "Ịba/ahụ ọkụ", + "Ịnyụ pịrị pịrị ọbara dị na ya", + "Ịgba ọbara n'igburu eze", + "Ịgba ọbara n'anụ ahụ", + "Ịgba ọbara n'anya", + "Ịnyụ mamịrị ọbara dị na ya", + "'Mmadụ 30 ga-anwụ n'akụkụ m tupu m kweta na coronavirus dị na Naịjirịa'11 Julaị 2020", + "Gịnị mere ụmụ Naijiria na-agbagha ọnụọgụgụ coronavirus NCDC na-ewepụta?6 Ọgọọst 2020", + "Ebe foto si, AFP", + "Dika Dkta Onajole siri kọwaa, ụzọ kacha mma igbochi ọrịa Marburg bụ site;", + "I dowe onwe ọcha", + "Idowe gburugburu ọcha", + "Gọọmentị igba mbọ inyocha ọpụpụ na mbata iji mata oge onye bu ya batara n'obodo", + "Ahụike", + "World Health Organization (WHO)", + "Anyị anaghị egbu oge maọbụ ese okwu, ọ bụ ikike Nnamdi Kanu ka anyị na-azọ - Aloy Ejimakorelekere 7 gara aga", + "Rwanda ebelatala ndị na-aga ebe a na-eli ozu maka nfesa ọrịa Marburg virus30 Septemba 2024", + "Anyị enweghị atụmatụ ịkpọbata ndị gbara ọsọ ndụ n’Ehime Mbano – Gọọmenti Imo steeti", + "Kedụ onye bụ onyendu Hezbollah bụ Hassan Nasrallah?29 Septemba 2024", + "'Nwunye nna m boro m na m bụ amoosu gburu nwa ya nwoke'26 Septemba 2024", + "Ụlọ omeiwu nta akpọọla Onyeisioche EFCC, VDM na Bobrisky oku n’ihi ebubo nrụrụaka27 Septemba 2024", + "\"Recuse\": Gịnị ka ọ bụ? Gịnị ka ọ pụtarala Nnamdi Kanu?25 Septemba 2024", + "O nwere uru unyi baara ahụike mmadụ?25 Septemba 2024", + "Etu ụmụada siri weghara nchekwa obodo ha n'Anam17 Septemba 2024", + "Gọọmenti Enugwu Steeti akpọọla ndị Igwe Nsukka oku banyere mkpamkpa 'Mmọnwụ Oriokpa'27 Septemba 2024", + "Gọọmenti Enugwu Steeti akpọọla ndị Igwe Nsukka oku banyere mkpamkpa 'Mmọnwụ Oriokpa'", + "Ụlọ omeiwu nta akpọọla Onyeisioche EFCC, VDM na Bobrisky oku n’ihi ebubo nrụrụaka", + "O nwere uru unyi baara ahụike mmadụ?", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 24 Julaị 2024", + "Kedụ ihe ndị agbụrụ ọzọ na-ekwukarị ha jiri mara ndị Igbo?Emelitere ikpeazụ na: 19 Jenụwarị 2023", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/c4g4erjgm6ro.json b/articles/c4g4erjgm6ro.json new file mode 100644 index 00000000..e0b96267 --- /dev/null +++ b/articles/c4g4erjgm6ro.json @@ -0,0 +1,75 @@ +{ + "published": "29 Septemba 2024", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Onye ndu ndịagha isi ekweghị ọnwụ Hezbollah nke Lebanọn bụ Heikh Hassan Nasrallah bụ otu onye a maara nke ọma na mpaghara Middle East.", + "Ahụbeghị Nasrallah n’ihu ọhanaeze kemgbe ọtụtụ afọ gara aga n’ihi na egwu na-atụ ya na ndị Izrel ga-ememila ya.", + "Ma n’ụbọchị Satọde, ndịagha Izrel kwuru na ha egbuola Nasrallah n’agha ha buru na Beirut. Hezbollah ekwubeghị okwu gbasara nke a.", + "Onye adịghị ahụ anya nke nwere njikọ na Iran, ọ gbara mbọ dị mkpa n'ịgbanwe Hezbollah ka ọ bụrụ ihe ọ bụ taa na ndọrọndọrọ ọchịchị na ibu agha - ndị na-akwado otu ahụ ka na-asọpụrụ ya.", + "N'okpuru nduzi Nasrallah, Hezbollah enyerela aka zụọ ndịagha Palestine bụ Hamas, ya na ndị agha Ịrak na Yemen, wee nweta ngwaagha na rọketi sitere na Ịran maka iji megide Izrel.", + "Ọ zụlitere Hezbollah site n'ịbụ ndịagha ehibere maka ịlụso ndị agha Izrel bi na Lebanọn agha ka ọ bụrụ ndịagha siri ike karịa ndị agha Lebanọn, onye na-agba mbọ na ndọrọndọrọ ọchịchị Lebanọn, onye na-arọpụta ọrụ ahụike, agụmakwụkwọ na ọrụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya, tinyere ịkwado ọchịchọ obi Ịran ị bụ mba kwụụrụ na nke ya.", + "Onye a mụrụ na 1960, Hassan Nasrallah tolitere na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Beirut bụ Bourj Hammoud, ebe nna ya bụ Abdul Karim na-ere obere ahịa. Ọ bụ nwa nke mbụ n'ime ụmụ itoolu.", + "Ọ sonyeere ndị otu Amal, tupu o sonyere ndịagha Shia, oge Lebanọn banyere n'agha ime n’afọ 1975. Mgbe ọ nọsịrị obere oge n’obodo nsọ Iraq nke Najaf ịgụ akwụkwọ seminarị Shia, ọ laghachiri Amal na Lebanon tupu ya na ndị ọzọ ekewaa otu ahụ n’afọ 1982, n’ime obere oge Izrel wakporo Lebanọn na nzaghachi nye mwakpo nke ndịagha Palestine.", + "Otu ọhụrụ ahụ bụ Islamic Amal nwetara nkwado ndịagha Revolutionary Guards nke Iran nke dị na Bekaa Valley, ma tiwapụ dịka ndị a ma ama sitere na ndịagha Shia nke ga-emecha mepụta Hezbollah.", + "N'afọ 1985, Hezbollah kwuputara nguzobe ya site n’ibipụta \"akwụkwọ ozi\" nke mere ka Amerịka na Soviet Union pụta dịka ndị kachasị bụrụ ndị iro Islam ma kpọọ oku maka \"mkpochapụ\" Izrel, nke o kwuru na ọ na-eweghara ala ndị Alakụba.", + "Nasrallah gbara mbọ nke onwe ya ịgbago n’ọkwa Hezbollah dịka otu ahụ na-etolite. O kwuru na mgbe ọ rụsịrị ọrụ dịka onyeagha, ọ bụụrụ onyeisi otu ahụ na Bealbek, tupu ọ gbagoo na mpaghara Bekaa dum, dịka Beirut sochiri ya.", + "Ọ ghọrọ onye ndu Hezbollah n’afọ 1992 mgbe ọ dị afọ 32, mgbe e gbuchara onye bu ya ụzọ bụ Abbas al-Musawi n’ogbunigwe Izrel jiri helikopta tụọ.", + "Etu nnyocha ogbugbu nwata a na 'West Bank' si bute ebubo na ndịagha Israel mere mpụ agha 3 Mee 2024", + "Iran vs Israel: Kedu onye ngwa agha ya kaa?20 Eprel 2024", + "Ndịisi agha Isreal aṅụọla iyi ịwakpo mba Iran na nzaghachị ogbunigwe ọ tụrụ ha16 Eprel 2024", + "Otu n’ime ihe mbụ o mere bụ imegwara ogbugbu e gburu Musawi. O nyere iwu ka e jiri rọketi wakpoo mgbago ugwu Israel bụ nke gburu otu nwata nwaanyị, onye ọrụ nchekwa Israel nọ n'ụlọọrụ nnọchite anya Israel dị na Turkey bụ ogbunigwe ụgbọ ala gburu ya dịka onye o gburu mmadụ gbuo onwe ya tiwara ogbuniigwe n’ụlọọrụ nnọchi anya Israel dị na Buenos Aires, Argentina, gbuo mmadụ iri abụọ na itolu (29).", + "Nasrallah na ndịagha Izrel busoro onwe ha obere agha dị iche iche nke njedebe ya bụ iwezuga onwe ha na ndịda Lebanon n’afọ 2000, n'agbanyeghị na ọ tara ahụhụ n'onwe ya mgbe e gburu ọkpara ya bụ Hadi n’ọgụ dị n’etiti ya na ndịagha Izrel.", + "N’isochi mwezuga onwe ahụ, Nasrallah kwusara na Hezbollah enwetarala Arab mmeri mbụ megide Izrel. O kwekwara nkwa na Hezbollah agaghị agbapụ ngwa ọgụ, na-ekwu na ọ tụlere na \"a ghaghị iweghachi okeala Lebanọn niile\", tinyere mpaghara Shebaa Farms.", + "E nwetụrụ udo ruo n'afọ 2006, mgbe ndịagha Hezbollah malitere ibu agha nke gburu ndịagha Izrel asatọ ma tọrọ mmadụ abụọ ndị ọzọ, nke kpalitere nzaghachi Izrel dị ukwuu.", + "Ụgbọelu ndịagha Izrel tụrụ ogbuniigwe n’ebe Hezbollah ji mere isi ọnọdụ na ndịda nakwa na mpaghara ndịda Beirut, ebe Hezbollah gbapụrụ ihe dị ka rọketi puku anọ (4,000) megide Izrel. Ihe karịrị ndị Lebanọn otu puku, otu narị na iri abụọ na ise (1,125), nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị nkịtị nwụrụ n'ọgbaaghara ahụ dị n’ime mkpụrụ ụbọchị iri atọ na anọ (34), tinyere ndịagha Izrel otu narị na iri na itolu (119) na ndị nkịtị iri anọ na ise (45).", + "Ụgbọelu ndị agha Izrel lekwasịrị anya n'ụlọ na ụlọọrụ Nasrallah, mana ọ gbanarịrị n'enweghị mmerụ ahụ ọbụla.", + "N’afọ 2009, Nasrallah wepụtara akwụkwọ ọchịchị ọhụrụ nke ha ji chọọ ikwupụta “ọhụ ndọrọndọrọ ọchịchị” Hezbollah. Ọ rụtụrụ aka na mba Alakụba a chọtara n’akwụkwọ n’afọ1985 mana ọ nọgidere na-emegide Izrel na Amerịka wee kwughachi na Hezbollah kwesịrị idobe ngwa ọgụ ya n'agbanyeghị mkpebi UN machibidoro ha na ndịda Lebanọn.", + "\"Ndị mmadụ na-agbanwe. Ụwa dum gbanwere n'ime afọ 24 gara aga. Lebanon gbanwere. Usoro ụwa gbanwere,\" ka Nasrallah kwuru.", + "Ka afọ anọ gasịrị, Nasrallah kwupụtara na Hezbollah na-abanye \"n'ụzọ ọhụrụ kpamkpam\" site n’iziga ndịagha na Syria iji nyere onye Ịran na-akwado bụ Onyeisiala Bashar al-Assad aka buo agha megide nnupụisi. O kwuru, sị: \"Ọ bụ agha anyị, anyị ga-emerịrị ya.", + "Ndị isi Sunni Lebanọn boro Hezbollah ebubo na ọ dọbatara obodo ahụ n'agha Syria.", + "N’afọ 2019, nsogbu akụnaụba miri emi na Lebanon kpalitere ngagharị iwe megide ndị ndọrọndọrọ ọchịchị e boro ebubo nrụrụaka, mmefufu, amaghị eme na nleghara anya. Nasrallah na mbụ gosipụtara ọmịiko n’oku mgbanwe a na-akpọ ma agwa ya gbanwere ka ndị na-eme ngagharịiwe malitere ịchọ ka e megharịa usoro ndọrọndọrọ ọchịchị kpamkpam.", + "N’ụbọchị 8 Ọktoba 2023 – ka otu ụbọchị gara ndị Hamas wakporo Israel na-enwetụbeghị ụdị ya, bụ nke kpalitere agha na Gaza - ọgụ na-adịbu n'etiti Hezbollah na Izrel abawanye.", + "Hezbollah gbara ndị Izrel ogbunigwe na nkwado ha nye ndị Palestine.", + "N'okwu ya na Nọvemba, Nasrallah sịrị na mbuso agha Hamas abụrụla \"otu pasenti nke ndị Palestine n'ihe gbasara mkpebi na ogbugbu\" mana mgbakọrịta egbe n'etiti otu ya na Izrel bụ \"ihe dị oke mkpa ma kwesị iribe ama\".", + "Ndị otu a gbara ihe karịrị rọketi puku asatọ (8,000) na mgbago ugwu Izrel na Golan Heights nke Izrel bichiri.", + "Ndịagha Israel Defense Forces (IDF) megwara site na mwakpo ha si n’elu mee na tankị na ogbunigwe ha gbara ndị Hezbollah na Lebanọn.", + "N'okwu o kwuru na nso nso a, Nasrallah boro Izrel ebubo maka ịgbawa puku kwuru puku pagers na igwe redio ndị Hezbollah ji eme ihe, nke gburu mmadụ iri atọ na itolu (39) ma merụọ ọtụtụ puku ndị ọzọ ahụ, ma kwuo na “o bibiela nkwekọrịta niile”. O kwetara na ndị otu ahụ enwetala \"ihe ọjọọ na-enwetụbeghị ụdị ya\".", + "N'oge na-adịghị anya nke ahụ gasịrị, Izrel gbasara mwakpo ha na-eme Hezbollah, na-atụ ogbunigwe n’ike n’ike nke gburu ihe fọrọ obere ihe ka ọ bụrụ mmadụ narị (800).", + "Muslims", + "Islam", + "Ndọrọndọrọ ọchịchị", + "Iraq", + "Iran", + "Akụ na ụba", + "Anyị anaghị egbu oge maọbụ ese okwu, ọ bụ ikike Nnamdi Kanu ka anyị na-azọ - Aloy Ejimakorelekere 7 gara aga", + "Rwanda ebelatala ndị na-aga ebe a na-eli ozu maka nfesa ọrịa Marburg virus30 Septemba 2024", + "Anyị enweghị atụmatụ ịkpọbata ndị gbara ọsọ ndụ n’Ehime Mbano – Gọọmenti Imo steeti", + "Kedụ onye bụ onyendu Hezbollah bụ Hassan Nasrallah?29 Septemba 2024", + "'Nwunye nna m boro m na m bụ amoosu gburu nwa ya nwoke'26 Septemba 2024", + "Ụlọ omeiwu nta akpọọla Onyeisioche EFCC, VDM na Bobrisky oku n’ihi ebubo nrụrụaka27 Septemba 2024", + "\"Recuse\": Gịnị ka ọ bụ? Gịnị ka ọ pụtarala Nnamdi Kanu?25 Septemba 2024", + "O nwere uru unyi baara ahụike mmadụ?25 Septemba 2024", + "Etu ụmụada siri weghara nchekwa obodo ha n'Anam17 Septemba 2024", + "Gọọmenti Enugwu Steeti akpọọla ndị Igwe Nsukka oku banyere mkpamkpa 'Mmọnwụ Oriokpa'27 Septemba 2024", + "Gọọmenti Enugwu Steeti akpọọla ndị Igwe Nsukka oku banyere mkpamkpa 'Mmọnwụ Oriokpa'", + "Ụlọ omeiwu nta akpọọla Onyeisioche EFCC, VDM na Bobrisky oku n’ihi ebubo nrụrụaka", + "O nwere uru unyi baara ahụike mmadụ?", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 24 Julaị 2024", + "Kedụ ihe ndị agbụrụ ọzọ na-ekwukarị ha jiri mara ndị Igbo?Emelitere ikpeazụ na: 19 Jenụwarị 2023", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/c5y32n6q2g1o.json b/articles/c5y32n6q2g1o.json new file mode 100644 index 00000000..97fe17e6 --- /dev/null +++ b/articles/c5y32n6q2g1o.json @@ -0,0 +1,68 @@ +{ + "published": "24 Septemba 2024", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Ọkaikpe na-ekpe ikpe Nnamdi Kanu bụ Binta Nyako ewepula onwe ya dịka ọkaikpe ga na-anụrụ ikpe ahụ.", + "Nke a mere mgbe Kanu bịara n'ihu ya n'ụbọchị 24 nke ọnwa Sepụtemba ma kwuo na o nweghizi ntụkwasị obi n'ikike Nyako ị nụrụ ikpe ahụ n'akpaghị oke.", + "Dịka Nyako si kwuo, ọ ga-enyeghachi akwụkwọ ikpe ahụ n'aka ọkaikpe kachasị na Naịjirịa ka o jiri aka ya nye ikpe ahụ n'aka onye ọzọ.", + "Ihe ahụ Nyako mere bụ ihe a kpọrọ 'Recuse' na Bekee nakwa asụsụ ndị ọkaiwu na ọkaikpe.", + "Ọkaiwu Chidinma Okonkwo kọwara na mmadụ iwepu onwe a ma ka 'recuse' bụ mgbe onye ọkaiwu maọbụ ọkaikpe sepụrụ aka n'ikpe mgbe o doro anya na obi ya akwụghịzi ọtọ n'ihe gbasara ikpe ahụ.", + "\"Ihe a na-emekarị ma ọkaikpe na-anụrụ ikpe maọbụ ọkaiwu na-anọchite anya mmadụ chọpụta na okwu a na-ekwu dị ya nso maọbụ na ọ metụtara onye dị ya nso dịka nne, nna, nwa, di, nwunye maọbụ ezi enyi onye ahụ\".", + "\"Ọ na-emekwa n'ihe gbasara agbụrụ, ọ bụrụ na ị chọpụta na ị na-adabere n'aka onye agbụrụ gị maọbụ onye okpukpere gị, ihe ị kwesiri ịme bụ iwepu onwe gị n'ikpe ahụ\" ka Okonkwo kwuru.", + "Dịka Ọkaikpe Binta Nyako nke ụlọikpe ukwu etiti dị n’Abụja wezugara onwe ya n’ikpe Onyendu IPOB bụ Nnamdi Kanụ, ihe ọ pụtara bụ na ọ ga-ebunye akwụkwọ ikpe ahụ n’aka Ọkaikpe kachasị nke Ụlọikpe ukwu etiti maka inyefe ya n’aka onye Ọkaikpe ọzọ.", + "Binta Nyako kwuru na ka ọ dị ugbua, Ọkaikpe kachasị nke Ụlọikpe ukwu etiti anọghị n’ọrụ nke pụtara na mgbe ọ ga-enweta awụkwọ ikpe ahụ nwereike ịbụ n’ọnwa Disemba afọ 2024.", + "Dịka Binta siri kwuo, ọ bụrụ na akwụkwọ ikpe ahụ ruo Ọkaikpe kachasị nke Ụlọikpe ukwu etiti aka, o nweziri ike nyefee ya n’aka Ọkaikpe ọzọ ka amalite okwu ahụ n’isi. Usoro niile a nwereike ịkụrụ ọnụ n’ime ọnwa isii.", + "Ka o siladị, o kwuru na ọ bụrụ na Ọkaikpe kachasị nke Ụlọikpe ukwu etiti enyeghachi ya ikpe ahụ, na ọ ga-amalite n’ebe ọ kwụsịrị.", + "Cheta na Ọkaikpe Binta Nyako nọọrọ n’ụbọchị Tuzde 24 Septemba 2024 wezuga onwe ya n’ikpe Nnamdi Kanu oge nwaamadị ahụ kwuru na ya enwezighị ntụkwasịobi na ọ ga-ekpe ikpe ziri ezi.", + "Ọkaikpe Binta Nyako ekwuola na ya ga-ewezuga onwe ya n'ikpe dị n'etiti onyendu Indeginous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu na gọọmenti Naịjirịa.", + "Ọkaikpe Nyako gbara ama taa 24 Septemba, 2024 ka Nnamdi Kanu kwuru na ya enweghị ntụkwasịobi na ọ ga-ekpe ikpe ziri ezi ma rịọ ya ka o wezuga onwe n'ikpe ahụ.", + "Nnamdi Kanu gara n'ihu kwupụta na Ọkaikpe Nyako anaghị eso usoro iwu hibere nakwa iwu ụlọikpe kachasị na Naịjirịa.", + "Ka ọ dị ugbua, Ọkaikpe Binta Nyako kwuru na ya ga-ewezuga onwe ya ma nyefee ikpe Nnamdi Kanu n'aka ọkaiwu ukwu gọọmenti etiti.", + "A ga-anọ taa bụ ụbọchị Tuzde 24 Septemba 2024 leba anya n'ikpe onyendu Indeginous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu.", + "Nnamdị Kanu, onye a na-ebo ebubo iyi ndụ egwu na ịgba Naịjirịa mgba okpuru ka a ga-ekpe ikpe n'Ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abuja.", + "Cheta na n'ụbọchị Mọnde 20 Mee 2024, Ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abuja jụrụ ịnabata mkpesa Nnamdi Kanu isi n'aka ndị uweojii pụrụiche bụ DSS pụọ gaa ụlọ mkpọrọ nkịtị.", + "N'ụbọchị ahụ, Ọkaikpe Binta Nyako kọwara na ọ dịla ugboro ugboro a na-eweta ikpe ahụ n'ihu ya ma kwusike ike na ọ gaghị agbanwe uche ya.", + "Nnamdi Kanu agbaala akwụkwọ ka gọọmenti kwụsị ikpe ya maka enweghị ikike10 Ọgọọst 2024", + "Nnamdi Kanu ahapụghị okwu nnwereonwe Biafra, ọ ga-agba ụtụ n’ụlọmkpọrọ - Primate Ayodele8 Julaị 2024", + "Ihe mere ndị ndu Ọwụwa Anyanwụ ji akpọ oku ka a tọhapụ Nnamdi Kanu4 Julaị 2024", + "Ka e mesịrị, Nnamdị Kanu gbara akwụkwọ iji gbaa ụkwụ megide ebubo e boro ya gbasara ịgba Naịjirịa mgba okpuru.", + "N’ozi ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimako bipụtara n’ọbaozi X ya n’ụbọchị Tuzde 21 Mee 2024, ọ sịrị na ha gbara akwụkwọ n’ụlọikpe ukwu etiti dị n’Abuja iji gwa Ọkaikpe Binta Nyako ka o kwupụta na ya enweghị ikikere ileba anya n’ikpe Nnamdi Kanu.", + "Ka o siladị, Nnamdi Kanụ gbakwara Gọọmentị Etiti akwụkwọ n'ụlọikpe n'aalị 10 Ọgọst 2024.", + "N'ime akwụkwọ ahụ ka ọ rịọrọ ụlọikpe mkpegharị ka ha kwụsị ụlọikpe ukwu etiti ikpe ya ikpe maka ebubo dị icheiche e boro ya ọ kachasị ebubo iyi ndụ egwu.", + "Ikpe", + "Naijiria", + "Abuja", + "Nnamdi Kanu", + "Ndị Biafra chọrọ nkewa", + "Anyị anaghị egbu oge maọbụ ese okwu, ọ bụ ikike Nnamdi Kanu ka anyị na-azọ - Aloy Ejimakorelekere 7 gara aga", + "Rwanda ebelatala ndị na-aga ebe a na-eli ozu maka nfesa ọrịa Marburg virus30 Septemba 2024", + "Anyị enweghị atụmatụ ịkpọbata ndị gbara ọsọ ndụ n’Ehime Mbano – Gọọmenti Imo steeti", + "Kedụ onye bụ onyendu Hezbollah bụ Hassan Nasrallah?29 Septemba 2024", + "'Nwunye nna m boro m na m bụ amoosu gburu nwa ya nwoke'26 Septemba 2024", + "Ụlọ omeiwu nta akpọọla Onyeisioche EFCC, VDM na Bobrisky oku n’ihi ebubo nrụrụaka27 Septemba 2024", + "\"Recuse\": Gịnị ka ọ bụ? Gịnị ka ọ pụtarala Nnamdi Kanu?25 Septemba 2024", + "O nwere uru unyi baara ahụike mmadụ?25 Septemba 2024", + "Etu ụmụada siri weghara nchekwa obodo ha n'Anam17 Septemba 2024", + "Gọọmenti Enugwu Steeti akpọọla ndị Igwe Nsukka oku banyere mkpamkpa 'Mmọnwụ Oriokpa'27 Septemba 2024", + "Gọọmenti Enugwu Steeti akpọọla ndị Igwe Nsukka oku banyere mkpamkpa 'Mmọnwụ Oriokpa'", + "Ụlọ omeiwu nta akpọọla Onyeisioche EFCC, VDM na Bobrisky oku n’ihi ebubo nrụrụaka", + "O nwere uru unyi baara ahụike mmadụ?", + "Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwuEmelitere ikpeazụ na: 24 Julaị 2024", + "Kedụ ihe ndị agbụrụ ọzọ na-ekwukarị ha jiri mara ndị Igbo?Emelitere ikpeazụ na: 19 Jenụwarị 2023", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/cpw5y4yznppo.json b/articles/cpw5y4yznppo.json new file mode 100644 index 00000000..37a73dd5 --- /dev/null +++ b/articles/cpw5y4yznppo.json @@ -0,0 +1,44 @@ +{ + "published": "elekere 7 gara aga", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Onye dere ya, Jessica Nwankwo, Amaka Bassey na Donald Wogu", + "Ndị mere akụkọ a, BBC News, Lagos", + "elekere 7 gara aga", + "Aloy Ejimakor bụ otu ọkaiwu n'ime otu ndị ọkaiwu na-anọchị anya Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob n'ụlọikpe akụwaala akịoyibo nsugbe.", + "Na mkparịtaụka nke ya na BBC nwere, ọ kọwara ihe mere ikpe Kanu ji bụrụ ihe e ji anya ọkụ e so.", + "Ọ sị na ọ bụ n'ihi na ọtụtụ ebubo e boro Kanu bụ ndị agbakwunyere ikpe ọnwụ maọbụrụ na ikpe mara onye ahụ.", + "N'ọnụ ya \"Ọ bụghị na anyị na-egbu oge maọbụ na anyị na ọkaiwu na-ese okwu maọbụ anyị na ndị ọkaikpe gọọmentị etiti na-ese okwu mba!", + "Anyị na-azọ ikike ruru ya ma na-azọsi ya ike.\"", + "O bokwara ebubo na DSS na-ege ntị n'ihe ya na Kanu na-akpa ma ọ gaa ịleta ya nke mere na eji ya agba ha mgba n'ụlọikpe.", + "Rue ugbua, BBC ka na-eche ọsịsa ụlọọrụ DSS gbasara ebubo nke a dịka Ejimakor na-ekwu na ọ bụ ya mere o ji agba mbọ ka ọ pụta n'aka ụlọọrụ nchekwa nzuzo ahụ.", + "Dịka ikpe Kanu si kwụrụ ugbua, Ọkaikpe Binta Nyako esepụla aka n'ikpe Nnamdi Kanu dịka Kanu kwuru na o nweghizi ntụkwasiobi n'etu Nyako si ekpe ya bụ ikpe.", + "Mana Ejimakor n'onwe ya na-ebokwasa DSS ebubo ọzọ na-ekwu na ha ejirila iwe ahụ gbochie Nnamdi Kanu ịhụ onye ọbụla nke gụnyere ndị ọkaiwu ya n'agbanyeghị na omume nke a dara iwu nke ụlọikpe nyere.", + "Naijiria", + "Nnamdi Kanu", + "Ndị Biafra chọrọ nkewa", + "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", + "\"Recuse\": Gịnị ka ọ bụ? Gịnị ka ọ pụtarala Nnamdi Kanu?25 Septemba 2024", + "Nnamdi Kanu agbaala akwụkwọ ka gọọmenti kwụsị ikpe ya maka enweghị ikike10 Ọgọọst 2024", + "Ihe ọkaiwu Nnamdi Kanu kwuru maka akụkọ sị na o sila n'ụlọ nga DSS rie mbọmbọ ọsọ14 Juun 2024", + "Vidio, Anyị anaghị egbu oge maọbụ ese okwu, ọ bụ ikike Nnamdi Kanu ka anyị na-azọ - Aloy Ejimakor, Duration 5,28elekere 7 gara aga", + "Vidio, 'Nwunye nna m boro m na m bụ amoosu gburu nwa ya nwoke', Duration 9,3526 Septemba 2024", + "Vidio, Etu ụmụada siri weghara nchekwa obodo ha n'Anam, Duration 4,0117 Septemba 2024", + "Vidio, Ọgba mbọ: Ọtụtụ ndị ekwenyeghi na nwaanyị dịka m ga-arụnwu 'gear box' ụgbọala - Chidera Ohiaeri, Duration 3,334 Septemba 2024", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file diff --git a/articles/cx2k79xpejlo.json b/articles/cx2k79xpejlo.json new file mode 100644 index 00000000..afaacf20 --- /dev/null +++ b/articles/cx2k79xpejlo.json @@ -0,0 +1,42 @@ +{ + "published": "26 Septemba 2024", + "sentences": [ + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Akụkọ", + "Egwuregwu", + "Ihe nkiri", + "Nke ka ewuewu", + "Onye dere ya, Amaka Bassey", + "Ndị mere akụkọ a, Video Journalist", + "Septemba 2024", + "N’Akwa-Ibom steeti dị na Ndịda Anyanwụ Naijiria, e nwere ọtụtụ ụmụaka e boro ebubo na ha bụ amọọsu.", + "Nke a kachasị njọ n’okpuru ọchịchị Oron dị na steeti ahụ.", + "Apịara m ihe abalị abụọ maka ebubo amosu - Amarachi Okechi4 Septemba 2022", + "Ụlọomeiwu Ebonyi enweghị ikikere ịmachi ọgbakọ ‘crusade’ - Ụkọchukwu16 Julaị 2024", + "Gọọmentị steeti ahụ wepụtara iwu n ‘afọ 2012 machiri ịkpọ ụmụaka amọọsu.", + "Mana nke a egbochighị ndị mmadụ ịkpachapụ ụmụaka ma na-ebu ha ebubo na ha bụ amoosu.", + "A na-emekpakwa ụmụaka ndị a ahụ, tie ha ihe, gba ha ọtọ ma gbahapụ ụfọdụ ka ha nwụfuo.", + "Otu n’ime ha a zọtara ndụ ya bụ Udeme bụ onye nwunye nna ya boro ebubo ịbụ amoosu gburu nwa ya nwoke, kọọrọ BBC ihe ọ gabigara:", + "ịkpa oke", + "Afịrịka", + "Ofụfe", + "Naijiria", + "Ụmụaka", + "Omenala", + "Vidio, Anyị anaghị egbu oge maọbụ ese okwu, ọ bụ ikike Nnamdi Kanu ka anyị na-azọ - Aloy Ejimakor, Duration 5,28elekere 7 gara aga", + "Vidio, 'Nwunye nna m boro m na m bụ amoosu gburu nwa ya nwoke', Duration 9,3526 Septemba 2024", + "Vidio, Etu ụmụada siri weghara nchekwa obodo ha n'Anam, Duration 4,0117 Septemba 2024", + "Vidio, Ọgba mbọ: Ọtụtụ ndị ekwenyeghi na nwaanyị dịka m ga-arụnwu 'gear box' ụgbọala - Chidera Ohiaeri, Duration 3,334 Septemba 2024", + "Ihe mere ị ga-eji nwee ntụkwasiobi na BBC News", + "Usoro Ojiji", + "Gbasara BBC", + "Iwu Nzuzo", + "Kuki", + "Kpọtụrụ BBC", + "Do not share or sell my info", + "© 2024 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga." + ] +} \ No newline at end of file