-
Notifications
You must be signed in to change notification settings - Fork 3
Commit
This commit does not belong to any branch on this repository, and may belong to a fork outside of the repository.
Merge pull request #6 from nkowaokwu/io/igbo_radio_scraper
Scrape Igbo Radio
- Loading branch information
Showing
880 changed files
with
17,737 additions
and
5 deletions.
There are no files selected for viewing
This file contains bidirectional Unicode text that may be interpreted or compiled differently than what appears below. To review, open the file in an editor that reveals hidden Unicode characters.
Learn more about bidirectional Unicode characters
This file contains bidirectional Unicode text that may be interpreted or compiled differently than what appears below. To review, open the file in an editor that reveals hidden Unicode characters.
Learn more about bidirectional Unicode characters
14 changes: 14 additions & 0 deletions
14
articles/igbo_radio/2023-apga-achikobala-ntuliaka-ime-ulo-maka-ulo-omeiwu-steeti.json
This file contains bidirectional Unicode text that may be interpreted or compiled differently than what appears below. To review, open the file in an editor that reveals hidden Unicode characters.
Learn more about bidirectional Unicode characters
Original file line number | Diff line number | Diff line change |
---|---|---|
@@ -0,0 +1,14 @@ | ||
{ | ||
"title": "2023: APGA Achịkọbala Ntụliaka Ime Ụlọ Maka Ụlọ Omeiwu Steeti", | ||
"published": "May 26, 2022 - 20:42", | ||
"edited": "0", | ||
"sentences": [ | ||
"Izunna Okafor dere akụkọ a\nOtu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘All Progressives Grand Alliance (APGA), na steeti Anambra, nọrọ ụbọchị Tuzdee wee mee ntuliaka ime ụlọ, bụ ‘Primary Elections’ maka ndị ji aha òtù ndọrọndọrọ ahụ azọ ọkwa ịga nọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ha dị icheiche n'ụlọ omeiwu steeti ahụ na nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n'ahọ 2023", | ||
"Ya bụ ntụliaka ime ụlọ bụ nke e mere n'ogige ebe dị icheiche a họpụtara a ga-anọ chịkọba ya maka ọgbọ nta nkwàdo iri atọ e nwere na steeti ahụ; ma bụrụkwa nke ụfọdụ mmadụ gbagoro akaebe na ọ gara nke ọma na n'ụzọ ghe anya oghe, n'agbanyèghị na e zutere ihe mkpọbiụkwụ dị icheiche n'ebe ụfọdụ", | ||
"Tupu a malite ime ya bụ ntụliaka kpọnkwem, ụfọdụ ndị ndu otu ndọrọndọrọ ahụ nàkwà ụfọdụ ndị e zitèrè ezite ịbịa hazie ma lekọta ya bụ ntụliaka nọrọ n'isi ụlọọrụ APGA dị n'Awka wee dụọ ndị ‘Returning Officers’ na ndị ọzọ ga-enye aka n'ọrụ ịchịkọba ya bụ nhọpụta ọdụ ma nyekwa ha nkọwa banyere ụzọ kacha mma ha ga-esi mee ya bụ ntụliaka ka o wee gaa siriri-werere nà n'ụzọ ghe anya oghe", | ||
"Ka ọ na-agwa ndị ọrụ ahụ okwu, osote onyeisioche izugbe otu ndọrọndọrọ APGA na mpaghara ndịda-ọdịda anyanwụ, ma bụrụkwa onyeisioche maka nchịkọba ntụliaka ime ụlọ ndị ji aha APGA azọ ọkwa ụlọ omeiwu steeti n'Anambra, bụ Maazị Samson Olare ka ha jiri naanị aha ndị ‘delegate’ e depụtara n'akwụkwọ nke onyeisioche APGA kwàdòrò wee mee ya bụ ntụliaka, ka o wee gaa n'ụzọ ghe anya oghe na n'ụzọ ziri ezi", | ||
"O kwukwara ka o doo anya na a gaghị ekwe ka ndị bụ ‘statutory delegate’ sonye na ntụliaka imr ụlọ ahụ; ma dọọ ndị ọrụ ahụ aka na ntị ka ha jiri ma gbaso usoro ahụ na ntụziaka e nyere ha wee rụọ ya bụ ọrụ", | ||
"Ka nke ahụ gachazịrị, a malitèrè ikesà ngwaọrụ dị icheiche a ga-eji mee ya bụ nhọpụta", | ||
"Mgbe e mechazịrị ya bụ nhọpụta ime ụlọ gachazịrị, ndị tuuru ugo n'ọgbọ nta nkwàdo dị icheiche gụnyèrè: Aguata I - Emmanuel Okpaleke; Aguata II — ; Anaocha I - Njideka Oraedum; Anaocha II — ; Anambra East - Obi Nweke; Anambra West - Patrick Udeoba; Awka North - Chimezie Ikwunne; Awka South I - Samuel Igwedimma Nwofor; Awka South II - Chuma Okoye; Ayamelum - Uche Victor Okafor; Dunukofia - Chuks Azotani; Ekwusigo - Ikenna Ofodeme; Idemili North — ; Idemili South - Chukwuebuka Igwe; Ihiala I — ; Ihiala II - Chukwuebuka Golden Iloh; Njikoka I - Ibemeka Chidiebere; Njikoka II - Jude Akpua; Nnewi North - Peter Nwosu; Nnewi South I - Sonny Ozobialu; Nnewi South II - Chieloka Henry Okoye; Ogbaru I — ; Ogbaru II - Uzonwanne Emmanuel Chinna; Onitsha North I - Nwaeze Tony Nwora; Onitsha North II - Harold Ekwerekwu; Onitsha South II — ; Onitsha South II — ; Orumba North - Emeka Aforka; Orumba South - Emmanuel Nwafor; Oyi - Innocent Ojike" | ||
] | ||
} |
15 changes: 15 additions & 0 deletions
15
articles/igbo_radio/Ndị-Ọrụ-Nchekwa-Agbaala-Otu-Onye-Ohi-Ọkụ-nAnambra.json
This file contains bidirectional Unicode text that may be interpreted or compiled differently than what appears below. To review, open the file in an editor that reveals hidden Unicode characters.
Learn more about bidirectional Unicode characters
Original file line number | Diff line number | Diff line change |
---|---|---|
@@ -0,0 +1,15 @@ | ||
{ | ||
"title": "Ndị Ọrụ Nchekwa Agbaala Otu Onye Ohi Ọkụ n'Anambra", | ||
"published": "Mar 18, 2022 - 23:26", | ||
"edited": "0", | ||
"sentences": [ | ||
"Izunna Okafor dere akụkọ a\nỌ bụ ‘ụwà bịa kirie’ n'Ifite Awka dị na steeti Anambra ụbọchị Tuzdee, dịka ndị ọrụ nchekwa jidere otu onye a na-enyo ènyò na ọ bụ onye ohi, ma gbaa ya ọkụ na ndụ ozigbo", | ||
"Nke a bụ nke mere kpọnkwem na mpaghara ebe a maara dịka ‘Miracle Junction’ dị n'Ifite, n'okporoụzọ ebe ahụ e si aga Mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka", | ||
"Dịka akụkọ siri kọọ, mmadụ isii a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ohi bùrù égbè wee wụchaa n'ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa ahụ dị n'Ifite ahụ, bụ ebe ndị orụ nchekwa ahụ kpọchìrì onye òtù ha ha jidere na mgbe gara aga oge ha gara ohi na mpaghara Ifite ahụ, n'ihi na o tèéla ha jiri yibe ndị mmadụ égwù n'ebe ahụ", | ||
"Ka ha rutere ebe ahụ, ha kpọghepuru egbe ha ozigbo, ha na ndị ọrụ nchekwa wee bido kwaba mgbọ", | ||
"Ka ịkwà mgbọ ahụ na-aga n'ihu, ndị omekoome ahụ gbàgbùrù otu onye n'ime ndị ọrụ nchekwa ahụ, ebe ndị ọrụ nchekwa ahụ jidere mmadụ atọ n'ime ha, n'ihi na mgbọ ekweghị aba ha ahụ maka ọdịechi ha gwọrọ", | ||
"Onye ọnọmgbeomere kọwàrà na n'ime mmadụ atọ ahụ ndị uweojii ahụ jidere, na ha gburu otu onye n'ime ha, kpụnye ndị uweojii otu onye, ma gbaa otu onye nke ọzọ ọkụ na ndụ, bụ onye nke ahụ gbagburu otu onye ọrụ nchekwa oge a na-akwà mgbọ", | ||
"Mbọ niile a gbara iji nweta ọnụmmiri okwu onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ DSP Tochukwu Ikenga, amịtàghị mkpụrụ ọbụla, n'ihi na ọ zaghàchighị ajụjụ a jụrụ ya banyere nke ahụ, wee ruo mgbe e bipụtara akụkọ a", | ||
"Ọ dị ncheta na a gbaala ọtụtụ ndị mmadụ ọkụ na nsonso a na mpaghara ebe dị icheiche n'ime steeti Anambra, bụkwazị nke mere onyeisi ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ Maazị Echeng Echeng jiri kpọọ òkù na nsonso a ka a kwụsị ihe dị otu ahụ ma na-agbaso usoro iwu oge niile" | ||
] | ||
} |
18 changes: 18 additions & 0 deletions
18
articles/igbo_radio/a-duola-na-anya-ugboala-ka-ha-na-elekota-ya-anya-nke-oma.json
This file contains bidirectional Unicode text that may be interpreted or compiled differently than what appears below. To review, open the file in an editor that reveals hidden Unicode characters.
Learn more about bidirectional Unicode characters
Original file line number | Diff line number | Diff line change |
---|---|---|
@@ -0,0 +1,18 @@ | ||
{ | ||
"title": "A Dụọla Na-Anya Ụgbọala Ka Ha Na-Elekọta Ya Anya Nke Ọma", | ||
"published": "Jun 26, 2022 - 23:00", | ||
"edited": "0", | ||
"sentences": [ | ||
"Izunna Okafor dere akụkọ a\nA dụọla ndị na-anyà ụgbọala ọdụ ka ha na-akpchapụ anya oge niile ma na-elerukwa ụgbọala ha anya nke ọma tupu ha eburu ya pụta n'okporoụzọ, iji zeere ọnọdụ ntụmadụ", | ||
"Onyeisi ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ije awele okporoụzọ, bụ ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC) n'ime steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi bụ ya nyere ndụmọdụ a n'okwu ya banyere ihe mberede okporoụzọ dapụtara n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra na nsonso a, bụ ebe otu nnukwu ụgbọala bu mmanụ ọkụ dara, mmanụ o bu wee wụfusie n'okporoụzọ", | ||
"Ya bụ ihe mberede bụ nke dapụtara na mpaghara njikọụzọ Eze-Ụzụ dị n'Awka, n'ogologo okporoụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Onitsha, ma bụrụkwa nke o nweghị onye nwụrụ na ya n'abụghị naanị na onye ọkwọ ụgbọala ahụ nwetara obere mmerụahụ", | ||
"Maazị Irelewuyi, onye mere ka a mara na ọ bụ ngharịpụ nke ihe nkwụsị ụgbọala, bụ breeki ụgbọala ahụ, bụ ihe kpatara ya bụ ihe mberede, gàkwara n'ihu kwuo na ọ dị oke mkpa ka onye ọbụla bụ onye na-anya ụgbọala gba mbọ hụ na ụgbọala ha kwụ n'egwu oge niile, tupu o buru ya pụta n'okporoụzọ, maka ngharịpụ oru ihe maọbụ nke ọzụ", | ||
"O jikwara ohere ahụ dọọ ndị na-anya ụgbọala aka na ntị ka ha kwụsị ịgba oke ọsọ, n'ihi na oji nwayọ anaghị emerụ ahụ; ọ bụkwa ejealá bụ isi ijè", | ||
"Na ntụnye nke ya banyere ihe mberede ahụ na etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, onye na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ ahụ, bụ RC Margaret B", | ||
"Onabe kwuru na Chineke rụrụ ọrụ ebube n'ebe ahụ", | ||
"O mere ka a mara na ọtụtụ mmadụ na ụgbọala kwụ n'ihu ebe e nwere agbakata akwụrụ n'okporoụzọ ahụ oge ya bụ ụgbọala ji ọsọ abịa n'ihi ngharịpụ breeki ya, mana onye na-anya ya bụ ụgbọala jiri ike ozigbo hucha ya n'akaekpe, tinye isi n'obere ọwa mmiri kewara akụkụ okporoụzọ ahụ na akụkụ okporoụzọ nke ọzọ; o wee jirizie otu osisi ọkụ okporoụzọ dị ebe ahụ wee bichie ụgbọala ahụ ozigbo, nke mezịrị na nnukwu ihe ọjọọ maọbụ ihe egwu e sighị na ya bụ ihe mberede pụta", | ||
"Ọ sịkwa na ndị ọrụ ha gara n'ebe ahụ ngwangwa ya bụ ihe mere, wee hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, ma nyekwazie aka na-ahazi njem ụgbọala n'ebe ahụ, iji hụ na e nweghị agbakata akwụrụ maọbụ ihe mberede okporoụzọ ọzọ dapụtara", | ||
"RC Onabe kwukwara na ndị ọrụ nsọnyụọkụ steeti Anambra wụchakwara n'ebe ahụ ozigbo ya bụ ihe mere, wee jiri mmiri gbajụlata okpomọkụ si na mmanụ ọkụ ahụ si n'ụgbọala ahụ awụfusi oge ọ dara, iji hụ na e nweghị ọkụ ọgbụgba n'ebe ahụ maọbụ ọnọdụ njọọ ndị ọzọ yiri ya", | ||
"E mechaziere chọta nnukwu ụgbọala ọzọ wee gbapụ mmanụ ọkụ ndị nke fọrọ afọ n'ụgbọala ahụ dara ada, tupu bidozie ịchọ etu a ga-esi dozi ma bughapụ ya n'okporoụzọ" | ||
] | ||
} |
14 changes: 14 additions & 0 deletions
14
articles/igbo_radio/a-duola-ndi-anambra-ka-ha-kwusi-iji-ahihia-asuchisi-owa-mmiri.json
This file contains bidirectional Unicode text that may be interpreted or compiled differently than what appears below. To review, open the file in an editor that reveals hidden Unicode characters.
Learn more about bidirectional Unicode characters
Original file line number | Diff line number | Diff line change |
---|---|---|
@@ -0,0 +1,14 @@ | ||
{ | ||
"title": "A Dụọla Ndị Anambra Ka Ha Kwụsị Iji Ahịhịa Asụchisi Ọwà Mmiri", | ||
"published": "Jan 22, 2020 - 20:49", | ||
"edited": "Jan 24, 2021 - 01:59", | ||
"sentences": [ | ||
"Izunna Okafor, Awka\nDịka a nà-atụ anya na eluigwe nwèrè ike ibe ákwá nke mbụ ya n'ime ahọ a oge adịghị anya, anya mmiri ya ewee gbaa n'ụwa; a kpọkuola ma dụọ ụmụafọ steeti Anambra ka ha kwụsị iji ahịhịa asụchisi ọwà mmiri, maka ajọ ọnọdụ dị iche iche nke ahụ aghaghị iwèta", | ||
"Oku a na ndụmọdụ a, bụ nke si n'aka gọọmenti steeti Anambra, ma bụrụkwa nke a kpọrọ site n'ọnụ onyeisi ụlọ ọrụ 'Anambra State Clear Drainage and Forest Preservation Agency,' bụ Maazị Chido Obidiegwu n'okwu ya oge ọ gara ileta ka ụfọdụ ọwà mmiri siri debe imi na ọnụ n'àkwà Ụkwaka ahụ dị na mpaghara Ụmụezena Ụmụdim, Nnewi, n'okpuru ọchịchị ime obodo Nnewi North", | ||
"Ọ kwàrà arịrị na ụfọdụ ndị mmadụ na-aga n'ihu iji ọwà mmiri mere ebe ikpofù ahịhịa, na-agbànyèghị ọkwà niile gọọmenti steeti ahụ na-ama bànyere nke ahụ, ya na ajọ ọnọdụ dị iche iche nke ahụ pụrụ iwèta", | ||
"Ọ kpọpụtàsịrị ihe dị iche iche nke ahụ pụrụ ibute, ọ kachasị ma mmiri bido izò, ma kwuo na nke ahụ aghàghị ịkawanye njọ ma ọ bụrụ na ndị mmadụ gaa n'ihu ịwụnye ahịhịa n'ọwà mmiri", | ||
"Maazị Obidiegwu, onye katọkwàrà otu ụfọdụ ndị mmadụ si esu ihe ọkụ aghara aghara, dọzịrị ndị na-emegasị ihe dị otu ahụ aka na ntị ka ha sepu aka na ya, ma na-ekponye ahịhịa n'ebe dị iche iche gọọmenti wepụtara maka ime nke ahụ", | ||
"O kwùrù na onye ọbụla a ga-ahụ n'akparamagwa ahụ, ga-abụ onye gọọmenti ga-anwụchikọ, ma kpụpụkwa ya ụlọ ikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ya ji mmanụ", | ||
"Na ntụnye nke ya, ezi nwa amadi ahụ mere ka gọọmenti mara ma bịa ileru anya bányere otu ndị mmadụ si ekpofù ahịhịa na Nnewi ahụ n'ebe ezighị ezi, bụ Maazị Ifeanyị Nwosu tìnyékwara ọnụ, ma kpọkuo ọhanaeze ka ha nyere gọọmenti aka n'ịkwalite ezi amụma adịmọcha na steeti ahụ, site n'irube isi nye ntụziaka ya, ya na izèrè ihe ọbụla ga-ebuta imetọ gburugburu steeti ahụ n'ụdị ọbụla nakwa n'oge ọbụla" | ||
] | ||
} |
18 changes: 18 additions & 0 deletions
18
articles/igbo_radio/a-duola-ndi-anambra-ka-ha-na-ewelataru-akunuba-ha-ulo.json
This file contains bidirectional Unicode text that may be interpreted or compiled differently than what appears below. To review, open the file in an editor that reveals hidden Unicode characters.
Learn more about bidirectional Unicode characters
Original file line number | Diff line number | Diff line change |
---|---|---|
@@ -0,0 +1,18 @@ | ||
{ | ||
"title": "A Dụọla Ndị Anambra Ka Ha Na-Ewelataru Akụnụba Ha Ụlọ", | ||
"published": "Sep 13, 2021 - 23:21", | ||
"edited": "0", | ||
"sentences": [ | ||
"Izunna Okafor dere akụkọ a\nIgbo sị na ọ na-abụ akụ ruo ụlọ a mara onye kpara ya; maka na ọ na-adị mma mbazụ gwute ọgwụ, ọ laa azụ", | ||
"Ka ọ dị taa, a kọwaala mkpa ọ dị na onye ọbụla bụ nwaafo steeti Anambra bi na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria nakwa mba ofesi ga na-erube isi nye ọkpụkpọ oku Akụ Ruo Ụlọ ahụ gọọmenti steeti ahụ na-akpọ, site n'ịdị na-ewelataru àkụ ya ụlọ", | ||
"Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ bụ ya kpọnwòrò òkù a ọzọ n'okwu ya na mmemme ịgbape ụlọ nkwariakụ 'CM Comfort Hotel And Suites' dị n'Awkụzụ, n'okpuruọchịchị ime obodo Oyi, na steeti ahụ", | ||
"N'okwu ya n'ebe ahụ oge ọ na-agbape ụlọ nkwariakụ, nke ọ bụ Komishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti ahụ, bụ Maazị Michael Okonkwo nọ̀chìrì anya ya, mere ka a mara na ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ ewetela ezi nchekwa bụ ịgbà, ma mekwa ka ọnọdụ dị larịị maka ndị ji ego achụ ego, ya na iji mee ka azụmahịa na ọrụ na-agawanye n'ihu n'ime steeti ahụ", | ||
"O kèlèkwàrà onye rụrụ ụlọ nkwariakụ ahụ, bụ Maazị Chinedu Egbunna maka iwèlàtàrù àkụnụba ya ụlọ wee rụọ ya bụ agadaga ụlọ nkwariakụ, ma gbaa akaebe na nke ahụ ga-adọnyere ọchịchị ya ukwu n'ọrụ mmepe ahụ ọ na-arụ na steeti ahụ ma nyekwa aka n'ikewàpụtara ndị ntorobịa steeti ahụ ohere ọrụ", | ||
"Ya bụ Gọvanọ jizịrị ohere ahụ wee kpọkuo ma dụọ ndị Anambra ka ha ñòmie ya bụ ihe Maazị Egbuna mere, site n'iwèlàtàru akụnụba ha ụlọ, iji nye aka kwàlite ọnụego na-abàta n'àkpà gọọmenti steeti ahụ, bụkwa nke ga-enyere gọọmenti aka n'ọrụ mmepe ya n'ime steeti ahụ", | ||
"Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka azụmahịa, ụlọ mmepụta ngwaahịa na nkewàpụta akụnụba na steeti ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor kèlèrè Gọvanọ Obianọ maka inwòghàrị ngalaba dị icheiche na steeti ahụ na ịkwàlite ọnọdụ obibindụ ụmụafọ steeti ahụ, ma gbazie akaebe na ụlọ nkwariakụ ọhụrụ ahụ ga-enye aka n'ime ka ọtụtụ ndị ntorobịa nwee ọrụ", | ||
"Ọ gwakwa Ndị Anambra ka ha ñomie nke ahụ ma sikwa n'ụzọ dị etu ahụ, nyere gọọmenti aka n'ọrụ, ma tụnyekwa ụtụ nke ha na mmepe obodo, n'ihi na nke ahụ abụghị ihe e kwesiri ịhapụrụ naanị gọọmenti ka o mee, ọkachasị dịka o siri metụta ikewàpụta ohere ọrụ", | ||
"Na mbụ n'okwu ya, onye nwe ya bụ ụlọ nkwariakụ, bụ Maazị Chinedu Egbuna kwuru na ebumnobi o jiri bịa rụọ ihe ahụ n'ime steeti ahụ bụ iji gbaso ma zakwa ọkpụkpọoku Akụ Ruo Ụlọ ahụ Gọvanọ Obianọ na-akpọ Ndị Anambra ka ha welataruo akụnụba ha ụlọ", | ||
"Ọ kpọpụtasịrị uru dị icheiche nke ahụ ga-ewèta, ma kpọkuzie ọhaneze ka ha bịa na-atụnyere ụlọ nkwariakụ ahụ, na-agbakwa ya aka ahịa, ọbụladị dịka o mere ka a mara na ya bụ ụlọ nkwariakụ nwèrè akụrụngwa ihe dị icheiche a na-ahụta n'ụlọ nkwariakụ ọgbaraọhụrụ nà ndị ọrụ ma nke ekwe na-akụ n'ọrụ ahụ", | ||
"Ụfọdụ ndị ukwu ndị ukwu sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisi ọrụ oyibo na steeti Anambra, bụ Ọkammụta Harry Uduh; Kọmishọna na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi, omenala na njem nlegharịanya, bụ Dọkịta Kenneth Anierobi, onyeisi ụlọọrụ Chinmark Groups, bụ Injinia Marksman Ijiomah, tinyere ndị ọzọ" | ||
] | ||
} |
13 changes: 13 additions & 0 deletions
13
...cles/igbo_radio/a-duola-ndi-ji-otu-aho-efe-ala-nna-ha-ka-ha-muo-oru-aka-di-iche-iche.json
This file contains bidirectional Unicode text that may be interpreted or compiled differently than what appears below. To review, open the file in an editor that reveals hidden Unicode characters.
Learn more about bidirectional Unicode characters
Original file line number | Diff line number | Diff line change |
---|---|---|
@@ -0,0 +1,13 @@ | ||
{ | ||
"title": "A Dụọla Ndị Ji Otu Ahọ Efe Ala Nna Ha Ka Ha Mụọ Ọrụ Aka Dị Iche Iche", | ||
"published": "Dec 5, 2019 - 20:15", | ||
"edited": "Jan 24, 2021 - 03:47", | ||
"sentences": [ | ||
"Izunna Okafor, Awka\nA kpọkuola ma dụọ ndị ji otu ahọ efe ala nna ha ka ha were òhèrè ahụ mụọ ka e si arụ ụfọdụ ọrụ aka dị iche iche, iji nwee ike ịbụ ndị kwụụrụ onwe ha na ndị na-ekewàpụta ọrụ, ma mgbe ha na efe àla nna ha, ma mgbe ha fèchàrà", | ||
"Oku a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, n'okwu ya oge ọ gara ịnabata na idu n'iyi ọrụ, ndị àgbà Ch nke abụọ (Batch C, stream 2) nke ndị ahụ e zitere ịnọ n'ime steeti ahụ wee fèé àlà nna ha, bụkwa ndị nọ ugbu a anara ọzụzụ n'ogige ụlọikwuu ọkpụtọrọkpụ ọhụụ ahụ a rụrụ maka nke ahụ, n'Ụmụawụlụ/ Mbaukwu dị n'okpuru ọchịchị Awka South", | ||
"Gọvanọ Obianọ, nke ọ bụ onyeisi ọrụ oyibo na steeti ahụ, bụ Ọkaiwu Harry Uduh nọchitere anya ya chètààra ndị ahụ mkpa ọ dị na onye ọbụla n'ime ha mụtàra ọrụ aka dị iche iche n'ihi na oge agaala mgbe mmadụ na-echekwube maọbụ tụkwàsị uche ya n'ọrụ oyibo", | ||
"Ọ dụrụ ha ka ha bụrụ ezi ndị ntorobịa, ma kwekwazie ha nkwà na ọchịchị steeti ahụ ga-aga n'ihu ịhụ na e nwère ezi ọnọdụ dị larịị maka ọmụmụ ọrụ aka ha na ije ozi ha, ogologo oge niile ha ga-anọ na steeti ahụ", | ||
"Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi NYSC na steeti ahụ, bụ Maazị Kehinde Aremu kọwara na oge inye ọzụzụ ahụ gà-ewè mkpụrụ izuụka atọ, bụ oge a na-eji kọwaara ndị ahụ bịara ife ala nna ha ihe dị iche iche ha kwesiri ịma banyere amụmà NYSC, otu ha ga-esi gaa ozi ha nakwa otu ha na ndị obodo e zigara ha ga-esi na-emekọrịta", | ||
"O mere ka a mara na ọ bụ mmadụ dị otu puku, na iri ise na otu (1051) ka e zitere na steeti ahụ n'agba nke a, ma kelekwazie gọọmenti steeti Anambra maka ezi nkwàdo ya nye amụma NYSC na steeti Anambra, ọbụnadị dịka ọ kpọkùkwàra ndị ahụ e zitere ọhụụ ka ha dị uchu n'ihe dị iche iche a ga-akụziri ha n'oge ọzụzụ izuụka atọ ahụ" | ||
] | ||
} |
Oops, something went wrong.